< Ọpụpụ 27 >
1 “Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
“Upange guwa lansembe lamatabwa amtengo wa mkesha. Likhale lofanana mbali zonse, msinkhu wake masentimita 137, mulitali mwake masentimita 229, mulifupi mwake masentimita 229.
2 Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a.
Upange nyanga imodziimodzi pa ngodya zake zinayizo kuti nyangazo ndi guwalo zikhale chinthu chimodzi, ndipo ulikute guwalo ndi mkuwa.
3 Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
Upange ziwiya zamkuwa izi zogwirira ntchito pa guwalo: miphika yochotsera phulusa, mafosholo, mabeseni owazira magazi, ngowe zokowera nyama ndi zosonkhezera moto.
4 Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ.
Upange sefa yachitsulo chamkuwa ndipo mʼngodya zake zinayizo upangiremo mphete zamkuwa.
5 Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ.
Uyike sefayo mmunsi mwa khoma la guwa lansembelo, ndipo ilekezere pakati pa guwa lansembelo.
6 Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha.
Upange nsichi zamtengo wa mkesha ndipo uzikutire ndi mkuwa.
7 A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya.
Pamene mukunyamula guwalo, muzilowetsa nsichizo mʼmphetemo mbali zonse ziwiri za guwalo.
8 Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.
Guwalo likhale lamatabwa ndi logoba mʼkati mwake. Ulipange monga momwe ndinakuonetsera pa phiri paja.
9 “Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
“Upange bwalo la chihema. Mbali yakummwera ikhale yotalika mamita 46 ndipo ikhale ndi nsalu yotchinga yofewa yosalala yolukidwa bwino.
10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha.
Upangenso mizati makumi awiri, matsinde makumi awiri amkuwa, ndi ngowe zasiliva ndi zingwe za mizatiyo.
11 Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.
Mbali yakumpoto ikhalenso yotalika mamita 46 ndipo ikhale ndi nsalu yotchinga. Pakhalenso mizati makumi awiri, matsinde amkuwa makumi awiri, ngowe zasiliva ndi zingwe za mizatiyo.
12 “Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri.
“Mbali yakumadzulo ya bwalolo ikhale yotalika mamita 23 ndipo ikhale ndi nsalu yotchinga, nsichi khumi ndi matsinde khumi.
13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.
Mbali yakummawa, kotulukira dzuwa, kutalika kwa bwalo kukhale mamita 23.
14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
Mbali imodzi yachipata kukhale nsalu yotchinga yotalika mamita asanu ndi awiri, mizati itatu ndi matsinde atatu.
15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.
Ndipo ku mbali inayo kukhale nsalu yotchinga ya mamita asanu ndi awiri pamodzi ndi mizati itatu ndi matsinde atatu.
16 “Banyere ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ, mee akwa mgbochi ga-adị mita itoolu nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ ga-enwe ogidi anọ na ihe ndọkwasị anọ.
“Pa chipata cha bwalolo pakhale nsalu yotchinga yamtundu wa mtambo, yapepo ndi yofiira ndiponso yofewa yosalala. Nsaluyo ikhale yotalika mamita asanu ndi anayi, yopangidwa ndi anthu aluso. Pakhalenso mizati yake inayi ndi matsinde akenso anayi.
17 Ogidi niile dị gburugburu ogige ahụ ga-enwe ihe njikọta ọlaọcha na nko, tinyere ebe ndọkwasị bronz.
Mizati yonse yozungulira bwalolo ilumikizidwe ndi zingwe zasiliva. Ngowe zake zikhale zasiliva, koma matsinde ake akhale amkuwa.
18 Ogologo ogige ahụ ga-abụ iri mita anọ na ise. Ebe obosara ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Ọ ga-enwe akwa mgbochi nke ịdị elu ya dị iri mita abụọ na atọ, nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, nwekwa ebe ndọkwasị bronz.
Kutalika kwa bwalolo kukhale mamita 46, mulifupi mwake mamita 23, msinkhu wake masentimita 230. Nsalu ya katani ikhale yofewa ndi yosalala bwino. Matsinde ake akhale amkuwa.
19 Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ.
Zipangizo zonse zogwiritsa ntchito zosiyanasiyana pa chihemacho, zikhomo za chihema ndi zabwalolo zikhale zamkuwa.
20 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ nke a na-agwaghị ihe maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
“Lamula Aisraeli kuti akupatse mafuta anyale a olivi wabwino kwambiri kuti nyalezo ziziyaka nthawi zonse.
21 Nʼime ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eme ka oriọna ndị ahụ dị nʼihu Onyenwe anyị, na-enwu ọkụ, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nʼetiti ndị Izrel nye ọgbọ niile dị nʼihu.
Mʼchihema cha msonkhano, koma kunja kwa nsalu yotchinga Bokosi la Chipangano, Aaroni ndi ana ake azionetsetsa kuti nyale ikukhala chiyakire pamaso pa Yehova kuyambira madzulo mpaka mmawa. Limeneli ndi lamulo lamuyaya pakati pa Aisraeli pa mibado yonse.”