< Ọpụpụ 26 >

1 “Rụọ ụlọ nzute nke ga-enwe akwa mgbochi iri, nke e ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie kpaa akwa ndị a. Onye ọrụ aka na-eme ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
“Tanrı'nın Konutu'nu on perdeden yap. Perdeler lacivert, mor, kırmızı iplikle özenle dokunmuş ince ketenden olsun, üzeri Keruvlar'la ustaca süslensin.
2 Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ.
Her perdenin boyu yirmi sekiz, eni dört arşın olmalı. Bütün perdeler aynı ölçüde olacak.
3 Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu.
Perdeler beşer beşer birbirine eklenerek iki takım perde yapılacak.
4 Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
Birinci takımın kenarına lacivert ilmekler aç. Öbür takımın kenarına da aynı şeyi yap.
5 Dụnye iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. Mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
Birinci takımın ilk perdesiyle ikinci takımın son perdesine ellişer ilmek aç. İlmekler birbirine karşı olmalı.
6 Ị ga-emekwa iri nko ọlaedo ise, nke ị ga-eji jikọta akwa mgbochi abụọ ahụ nʼotu, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ bụrụ otu.
Elli altın kopça yap, perdeleri kopçalayarak çadırı birleştir. Böylece konut tek parça haline gelecek.
7 “Ị ga-eji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
“Konutun üstünü kaplayacak çadır için keçi kılından on bir perde yap.
8 Akwa mgbochi iri na otu ndị a ga-aha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo. Ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
Her perdenin boyu otuz, eni dört arşın olacak. On bir perde de aynı ölçüde olmalı.
9 Dụkọtaa ise nʼime akwa mgbochi ahụ. Debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. Pịajie akwa mgbochi nke isii ụzọ abụọ nʼihu ụlọ nzute ahụ.
Beş perde birbirine, altı perde birbirine birleştirilecek. Altıncı perdeyi çadırın önünde katla.
10 Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
Her iki perde takımının kenarlarına ellişer ilmek aç.
11 Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
Elli tunç kopça yap, kopçaları ilmeklere geçir ki, çadır tek parça haline gelsin.
12 Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ.
Çadırın perdelerinden artan yarım perde konutun arkasından sarkacak.
13 Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya.
Perdelerin uzun kenarlarından artan kumaş çadırın yanlarından birer arşın sarkarak konutu örtecek.
14 Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya.
Çadır için kırmızı boyalı koç derilerinden bir örtü, onun üstüne de deriden başka bir örtü yap.
15 “Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
“Konut için akasya ağacından dikine çerçeveler yap.
16 Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara.
Her çerçevenin boyu on, eni bir buçuk arşın olacak.
17 Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
Çerçevelerin birbirine uyan iki paralel çıkıntısı olacak. Konutun bütün çerçevelerini aynı biçimde yapacaksın.
18 Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
Konutun güneyi için yirmi çerçeve yap.
19 Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
Her çerçevenin altında iki çıkıntı için birer taban olmak üzere, yirmi çerçevenin altında kırk gümüş taban yap.
20 Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ.
Konutun öbür yanı, yani kuzeyi için de yirmi çerçeve ve her çerçevenin altında iki taban olmak üzere kırk gümüş taban yap.
21 Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
22 Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii.
Konutun batıya bakacak arka tarafı için altı çerçeve yap.
23 Rụọ mbudo ibo abụọ, ga-adị na nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ.
Arkada konutun köşeleri için iki çerçeve yap.
24 Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ.
Bu köşe çerçevelerinin alt tarafı ayrı kalacak, üst tarafı ise birinci halkayla birleştirilecek. İki köşeyi oluşturan iki çerçeve aynı biçimde olacak.
25 Ha niile ga-adị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
Böylece sekiz çerçeve ve her çerçevenin altında iki taban olmak üzere on altı gümüş taban olacak.
26 “Jiri osisi akashia mee osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute,
“Konutun bir yanındaki çerçeveler için beş, öbür yanındaki çerçeveler için beş, batıya bakan arka tarafındaki çerçeveler için de beş olmak üzere akasya ağacından kirişler yap.
27 ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
28 Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
Çerçevelerin ortasındaki kiriş çadırın bir ucundan öbür ucuna geçecek.
29 Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.
Çerçeveleri ve kirişleri altınla kapla, kirişlerin geçeceği halkaları da altından yap.
30 “Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.
“Konutu dağda sana gösterilen plana göre yap.
31 “Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
“Lacivert, mor, kırmızı iplikle özenle dokunmuş ince ketenden bir perde yap; üzerini Keruvlar'la ustaca süsle.
32 Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ.
Dört gümüş taban üstünde duran akasya ağacından altın kaplı dört direk üzerine as. Çengelleri altın olacak.
33 Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.
Perdeyi kopçaların altına asıp Levha Sandığı'nı perdenin arkasına koy. Perde Kutsal Yer'le En Kutsal Yer'i birbirinden ayıracak.
34 Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ.
Bağışlanma Kapağı'nı En Kutsal Yer'de bulunan Levha Sandığı'nın üzerine koy.
35 Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda.
Masayı perdenin öbür tarafına, konutun kuzeye bakan yanına yerleştir; kandilliği masanın karşısına, konutun güney tarafına koy.
36 “Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
“Çadırın giriş bölümüne lacivert, mor, kırmızı iplikle özenle dokunmuş ince ketenden nakışlı bir perde yap.
37 Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha.
Perdeyi asmak için akasya ağacından beş direk yap, altınla kapla. Çengelleri de altın olacak. Direkler için tunçtan beş taban dök.”

< Ọpụpụ 26 >