< Ọpụpụ 24 >

1 Ọ gwara Mosis sị, “Rigokwute Onyenwe anyị, gị na Erọn, na Nadab, na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel. Ma unu ga-efe ofufe site nʼebe dị anya.
Then Yahweh said to Moses, “Come up to me—you, Aaron, Nadab, Abihu, and seventy of Israel's elders, and worship me at a distance.
2 Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.”
Moses alone may come near to me. The others must not come near, nor may the people come up with him.”
3 Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.”
Moses went and told the people all of Yahweh's words and decrees. All the people answered with one voice and said, “We will do all the words that Yahweh has said.”
4 Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel.
Then Moses wrote down all of Yahweh's words. Early in the morning, Moses built an altar at the foot of the mountain and arranged twelve stone pillars, so that the stones would represent the twelve tribes of Israel.
5 Mosis zipụtara ụmụ okorobịa Izrel, ndị chụrụ aja nsure ọkụ ma werekwa ụmụ oke ehi chụọ aja udo nye Onyenwe anyị.
He sent some Israelite young men to offer burnt offerings and sacrifice fellowship offerings of oxen to Yahweh.
6 Mosis tinyere ọkara ọbara ehi ndị ahụ nʼime efere. Ma o fesara ọkara ọbara nke fọdụrụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
Moses took half of the blood and put it into basins; he sprinkled the other half onto the altar.
7 Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.”
He took the book of the Covenant and read it aloud to the people. They said, “We will do all that Yahweh has spoken. We will be obedient.”
8 Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”
Then Moses took the blood and sprinkled it onto the people. He said, “This is the blood of the covenant that Yahweh has made with you by giving you this promise with all these words.”
9 Mosis rigoro nʼelu ugwu, ya na Erọn, na Nadab na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel.
Then Moses, Aaron, Nadab, Abihu, and seventy of Israel's elders went up the mountain.
10 Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.
They saw the God of Israel. Under his feet there was a pavement made of sapphire stone, as clear as the sky itself.
11 Ọ bụ ezie na ndị okenye Izrel hụrụ Chineke anya ma ọ laghị ha nʼiyi. Kama o mere ka ha nọọ nʼihu ya rie, ṅụọ.
God did not lay a hand on the Israelite leaders. They saw God, and they ate and drank.
12 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rigota, bịakwute m nʼelu ugwu, nọdụkwa ebe ahụ, maka na aga m enye gị mbadamba nkume nke iwu na ụkpụrụ dị na ya, nke m ji aka m dee maka i ji kuziere ha.”
Yahweh said to Moses, “Come up to me on the mountain and stay there. I will give you the tablets of stone and the law and commandments that I have written, so that you may teach them.”
13 Mosis biliri, ya na Joshua onye na-agara ya ozi. Mosis nʼonwe ya rigokwara nʼelu ugwu Chineke.
So Moses set out with his assistant Joshua and went up the mountain of God.
14 Ọ gwara ndị okenye Izrel okwu sị, “Cherenụ anyị nʼebe a tutu ruo mgbe anyị ga-alaghachikwute unu. Unu na Erọn na Hua nọ, onye ọbụla nwere nsogbu jekwuru ha.”
Moses had said to the elders, “Stay here and wait for us until we come to you. Aaron and Hur are with you. If anyone has a dispute, let him go to them.”
15 Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile,
So Moses went up the mountain, and the cloud covered it.
16 ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku.
Yahweh's glory settled on Mount Sinai, and the cloud covered it for six days. On the seventh day he called to Moses from within the cloud.
17 Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ.
The appearance of Yahweh's glory was like a devouring fire on the top of the mountain in the eyes of the Israelites.
18 Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Moses entered the cloud and went up the mountain. He was up the mountain for forty days and forty nights.

< Ọpụpụ 24 >