< Ọpụpụ 23 >

1 “Ị gaghị agbasa akụkọ ụgha ọbụla. Esokwala mmadụ ọjọọ nwekọọ ihe ọbụla site nʼịgba ama ị maara na ọ bụghị eziokwu.
"You shall not spread a false report. Do not join your hand with the wicked to be an unjust witness.
2 “Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi.
You shall not follow a crowd to do evil; neither shall you testify in court to side with a multitude to pervert justice;
3 Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye.
neither shall you favor a poor man in his cause.
4 “Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ.
"If you meet your enemy's ox or his donkey going astray, you shall surely bring it back to him again.
5 Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ.
If you see the donkey of him who hates you fallen down under his burden, do not leave him, you shall surely help him with it.
6 “Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha.
"You shall not deny justice to your poor people in their lawsuits.
7 Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya.
"Keep far from a false charge, and do not kill the innocent and righteous: for I will not justify the wicked.
8 “Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
"You shall take no bribe, for a bribe blinds the eyes of those who have sight and perverts the words of the righteous.
9 “Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.
"You shall not oppress a foreigner, for you know the heart of a foreigner, seeing you were foreigners in the land of Egypt.
10 “Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya.
"For six years you shall sow your land, and shall gather in its increase,
11 Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
but the seventh year you shall let it rest and lie fallow, that the poor of your people may eat; and what they leave the animal of the field shall eat. In like manner you shall deal with your vineyard and with your olive grove.
12 “Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
"Six days you shall do your work, and on the seventh day you shall rest, that your ox and your donkey may have rest, and the son of your handmaid, and the alien may be refreshed.
13 “Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu.
"Be careful to do all things that I have said to you; and do not invoke the name of other gods, neither let them be heard out of your mouth.
14 “Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.
"You shall observe a feast to me three times a year.
15 “Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. “Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.
You shall observe the feast of unleavened bread. Seven days you shall eat unleavened bread, as I commanded you, at the time appointed in the month Abib (for in it you came out from Egypt), and no one shall appear before me empty.
16 “Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu. “Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.
And the feast of harvest, the first fruits of your labors, which you sow in the field: and the feast of harvest, at the end of the year, when you gather in your labors out of the field.
17 “Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Three times in the year all your males shall appear before the Lord GOD.
18 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.
"You shall not offer the blood of my sacrifice with leavened bread, neither shall the fat of my feast remain all night until the morning.
19 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu. “Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.
The first of the first fruits of your ground you shall bring into the house of the LORD your God. "You shall not boil a kid in its mother's milk.
20 “Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu.
"Look, I send an angel before you, to keep you by the way, and to bring you into the place which I have prepared.
21 Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya.
Pay attention to him, and listen to his voice. Do not provoke him, for he will not pardon your disobedience, for my name is in him.
22 Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu.
But if you indeed listen to his voice, and do all that I speak, then I will be an enemy to your enemies, and an adversary to your adversaries.
23 Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.
For my angel shall go before you, and bring you in to the Amorite, and the Hethite, and the Perizzite, and the Canaanite, and the Girgashite, and the Hivite, and the Jebusite; and I will cut them off.
24 Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ niile nke chi ha.
You shall not bow down to their gods, nor serve them, nor follow their practices, but you shall utterly overthrow them and demolish their pillars.
25 Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
You shall serve the LORD your God, and I will bless your bread and your water, and I will take sickness away from your midst.
26 Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ.
No one will miscarry or be barren in your land. I will fulfill the number of your days.
27 “Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.
I will send my terror before you, and will confuse all the people to whom you come, and I will make all your enemies turn their backs to you.
28 Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu.
I will send the hornet before you, which will drive out the Hivite, the Canaanite, and the Hethite, from before you.
29 Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu.
I will not drive them out from before you in one year, lest the land become desolate, and the animals of the field multiply against you.
30 Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile.
Little by little I will drive them out from before you, until you have increased and inherit the land.
31 “Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.
I will set your border from the Red Sea even to the sea of the Philistines, and from the wilderness to the River; for I will deliver the inhabitants of the land into your hand, and you shall drive them out before you.
32 Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla.
You shall make no covenant with them, nor with their gods.
33 Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.”
They shall not dwell in your land, lest they make you sin against me, for if you serve their gods, it will surely be a snare to you."

< Ọpụpụ 23 >