< Ọpụpụ 22 >

1 “Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ.
Uba umuntu eseba inkabi loba imvu, ayihlabe kumbe ayithengise, uzahlawula inkabi ezinhlanu ngenkabi, lezimvu ezine ngemvu.
2 “Ọ bụrụ na e jide onye ohi mgbe ọ na-egbuka ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụkwa na e tigbuo ya, mee ka ọ nwụọ, iwu ejideghị onye ahụ gburu ya.
Uba isela lificwa lifohlela, litshaywe lize life, kakulacala legazi kuye.
3 Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.
Uba ilanga seliphumile phezu kwalo, ulecala legazi. Lifanele ukubhadala lokubhadala; uba lingelalutho, limele lithengiswe ngenxa yokweba kwalo.
4 Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ.
Uba okwebiweyo kuficwa lokuficwa esandleni salo kuphila, loba inkabi loba ubabhemi kumbe imvu, lizabuyisela kuphindwe kabili.
5 “Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta.
Nxa umuntu edlisa insimu kumbe isivini, angenise izifuyo zakhe zidle ensimini yomunye, uzabuyisela ngokuhle kwensimu yakhe langokuhle kwesivini sakhe.
6 “Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara.
Uba kuqhamuka umlilo, ulumathe emeveni kuze kutshe inqumbi yamabele loba amabele amileyo loba insimu, othungele umlilo uzahlawula lokuhlawula.
7 “Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ.
Uba umuntu enika umakhelwane wakhe imali loba impahla ukuze akulondoloze, njalo kwebiwe endlini yalowomuntu, uba isela litholwa lizabuyisela kuphindwe kabili.
8 Ọ bụrụ na a chọpụtaghị onye ohi ahụ, onye nwe ụlọ ahụ aghaghị ịbịa nʼihu Chineke, ka a chọpụta maọbụ ya nʼonwe ya setịpụrụ aka were ihe ahụ, bụ akụ nke onye ọzọ kpatara.
Uba isela lingatholwa, umninindlu uzasondezwa kubahluleli ukuthi kafakanga yini isandla sakhe empahleni kamakhelwane wakhe.
9 Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ.
Ngalo lonke udaba lwecala, ngenkabi, ngobabhemi, ngemvu, ngesembatho, ngakho konke okulahlekileyo, umuntu atsho ngakho ukuthi ngokwakhe, udaba lwabo bobabili luzakuza kubahluleli; lowo abahluleli abamlahlayo uzabuyisela kuphindwe kabili kumakhelwane wakhe.
10 “Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ,
Uba umuntu enikela kumakhelwane wakhe ubabhemi loba inkabi loba imvu kumbe isifuyo nje ukuthi akulondoloze, besekusifa loba kulimala kumbe kuthunjwe, kungelamuntu obonayo,
11 mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla.
isifungo seNkosi sizakuba phakathi kwabo bobabili, ukuthi kelulanga isandla empahleni kamakhelwane wakhe; njalo umniniyo uzasemukela, kayikubuyisela.
12 Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya.
Kodwa uba yebiwe lokwebiwa kuye, uzamhlawula umniniyo.
13 Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
Uba idatshuliwe lokudatshulwa, kayilethe ibe yibufakazi, kayikubuyisela edatshuliweyo.
14 “Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.
Uba-ke umuntu eseboleka ulutho kumakhelwane wakhe, beselulimala loba lusifa umninilo engelalo, uzahlawula lokuhlawula.
15 Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.
Uba umninilo elalo, kayikuhlawula; uba beluqhatshiwe, lulande ukuqhatshwa kwalo.
16 “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya.
Uba-ke indoda iyenga intombi emsulwa engakhombanga, ilale layo, izayilobola lokuyilobola ibe ngumkayo.
17 Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ.
Uba uyise esala lokwala ukumnika yona, uzabhadala imali njengelobolo lezintombi ezimsulwa.
18 “E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.
Lingayekeli umthakathikazi ukuthi aphile.
19 “Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ.
Wonke olala lenyamazana uzabulawa lokubulawa.
20 “Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.
Ohlabela onkulunkulu ngaphandle kweNkosi kuphela uzatshabalaliswa.
21 “Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.
Njalo ungamcindezeli owezizwe, ungamhluphi, ngoba lalingabezizwe elizweni leGibhithe.
22 “Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna.
Lingacindezeli lawuphi umfelokazi kumbe intandane.
23 Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.
Uba ubacindezela lokubacindezela, yebo, uba bekhala lokukhala kimi, ngizakuzwa lokuzwa ukukhala kwabo,
24 Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna.
ulaka lwami luzavutha, ngilibulale ngenkemba, labomkenu babe ngabafelokazi labantwana benu intandane.
25 “Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa.
Uba useboleka abantu bami imali abangabayanga abalawe, ungaziphathi njengombolekisi kubo, ungabeki inzalo phezu kwabo.
26 Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara.
Uba uthatha lokuthatha isembatho sikamakhelwane wakho sibe yisibambiso, sibuyisele kuye lingakatshoni ilanga;
27 Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere.
ngoba siyisigubuzelo sakhe sodwa, siyisembatho sakhe esikhumbeni sakhe; uzalala phakathi kwani? Kuzakuthi-ke lapho ekhala kimi, ngizamuzwa, ngoba ngilomusa.
28 “Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ.
Lingathuki onkulunkulu, lingaqalekisi induna yabantu bakini.
29 “Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ. “Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ.
Lingaphuzisi isivuno senu esigcweleyo lomhluzi wenu wezithelo. Uzangipha izibulo emadodaneni akho.
30 Otu a ka ị ga-emekwa banyere mkpụrụ mbụ nke ehi gị na atụrụ gị. Ị ga-ewebata ya nye m nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ha, mgbe ị hapụsịrị ha nne ha ụbọchị asaa.
Wenze njalo ngenkabi yakho langemvu yakho; kuzakuba lonina insuku eziyisikhombisa; ngosuku lwesificaminwembili unginike khona.
31 “Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.
Lizakuba ngabantu abangcwele kimi; ngakho lingadli inyama edatshulwe egangeni yizilo, iphoseleni inja.

< Ọpụpụ 22 >