< Ọpụpụ 20 >
1 Chineke kwuru okwu ndị a niile sị:
Tanrı şöyle konuştu:
2 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu.
“Seni Mısır'dan, köle olduğun ülkeden çıkaran Tanrın RAB benim.
3 “Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m.
“Benden başka tanrın olmayacak.
4 Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa.
“Kendine yukarıda gökyüzünde, aşağıda yeryüzünde ya da yer altındaki sularda yaşayan herhangi bir canlıya benzer put yapmayacaksın.
5 Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
Putların önünde eğilmeyecek, onlara tapmayacaksın. Çünkü ben, Tanrın RAB, kıskanç bir Tanrı'yım. Benden nefret edenin babasının işlediği suçun hesabını çocuklarından, üçüncü, dördüncü kuşaklardan sorarım.
6 Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
Ama beni seven, buyruklarıma uyan binlerce kuşağa sevgi gösteririm.
7 Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
“Tanrın RAB'bin adını boş yere ağzına almayacaksın. Çünkü RAB, adını boş yere ağzına alanları cezasız bırakmayacaktır.
8 Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ.
“Şabat Günü'nü kutsal sayarak anımsa.
9 Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile.
Altı gün çalışacak, bütün işlerini yapacaksın.
10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị.
Ama yedinci gün bana, Tanrın RAB'be Şabat Günü olarak adanmıştır. O gün sen, oğlun, kızın, erkek ve kadın kölen, hayvanların, aranızdaki yabancılar dahil, hiçbir iş yapmayacaksınız.
11 Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.
Çünkü ben, RAB yeri göğü, denizi ve bütün canlıları altı günde yarattım, yedinci gün dinlendim. Bu yüzden Şabat Günü'nü kutsadım ve kutsal bir gün olarak belirledim.
12 Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
“Annene babana saygı göster. Öyle ki, Tanrın RAB'bin sana vereceği ülkede ömrün uzun olsun.
16 Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
“Komşuna karşı yalan yere tanıklık etmeyeceksin.
17 Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
“Komşunun evine, karısına, erkek ve kadın kölesine, öküzüne, eşeğine, hiçbir şeyine göz dikmeyeceksin.”
18 Mgbe ndị Izrel hụrụ egbe eluigwe, na amụma ọkụ, na opi ike, hụkwa ugwu ahụ ka o jupụtakwara nʼanwụrụ ọkụ, ha mara jijiji nʼihi egwu. Ha guzoro nʼebe dị anya,
Halk gök gürlemelerini, boru sesini duyup şimşekleri ve dağın başındaki dumanı görünce korkudan titremeye başladı. Uzakta durarak
19 sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.”
Musa'ya, “Bizimle sen konuş, dinleyelim” dediler, “Ama Tanrı konuşmasın, yoksa ölürüz.”
20 Mosis sịrị ndị Izrel, “Unu atụkwala ụjọ, nʼihi na Chineke bịara ịnwale unu ime ka unu na-atụ ya egwu mgbe ọbụla ka unu ghara imehie megide ya.”
Musa, “Korkmayın!” diye karşılık verdi, “Tanrı sizi denemek için geldi; Tanrı korkusu üzerinizde olsun, günah işlemeyesiniz diye.”
21 Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.
Musa Tanrı'nın içinde bulunduğu koyu karanlığa yaklaşırken halk uzakta durdu.
22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị, ‘Unu onwe unu ahụla na m si nʼeluigwe gwa unu okwu.
RAB Musa'ya şöyle dedi: “İsrailliler'e de ki, ‘Göklerden sizinle konuştuğumu gördünüz.
23 Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha.
Benim yanımsıra başka ilahlar yapmayacaksınız, altın ya da gümüş ilahlar dökmeyeceksiniz.
24 “‘Ebe ịchụ aja unu ga-ewuru m ga-abụ nke unu ji naanị aja wuo. Nʼebe ahụ ka unu ga-achụrụ m aja nsure ọkụ na aja udo. Unu ga-ejikwa igwe ewu na atụrụ, na ehi chụọrọ m aja. Unu ga-ewuru m ebe ịchụ aja naanị ebe ọbụla m mere ka aha m bụrụ ihe a na-asọpụrụ, nʼebe ahụ ka m ga-abịa gọzie unu.
Benim için toprak bir sunak yapacaksınız. Yakmalık ve esenlik sunularınızı, davarlarınızı, sığırlarınızı onun üzerinde sunacaksınız. Adımı anımsattığım her yere gelip sizi kutsayacağım.
25 Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya.
Eğer bana taş sunak yaparsanız, yontma taş kullanmayın. Çünkü kullanacağınız alet sunağın kutsallığını bozar.
26 Unu ejila ihe nrigo gbagoro nʼebe ịchụ aja m, ka a ghara ikpughe ọtọ unu nʼelu ya.’
Sunağımın üzerine basamakla çıkmayacaksınız. Çünkü çıplak yeriniz görünebilir.’”