< Ọpụpụ 20 >

1 Chineke kwuru okwu ndị a niile sị:
UNkulunkulu wasekhuluma wonke la amazwi esithi:
2 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu.
NgiyiNkosi uNkulunkulu wakho eyakukhupha elizweni leGibhithe, endlini yobugqili.
3 “Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m.
Ungabi labanye onkulunkulu phambi kwami.
4 Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa.
Ungazenzeli isithombe esibaziweyo loba yiwuphi umfanekiso wokusemazulwini phezulu, loba wokusemhlabeni phansi, loba wokusemanzini ngaphansi komhlaba;
5 Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
ungakukhothameli, ungakukhonzi; ngoba mina iNkosi, uNkulunkulu wakho, nginguNkulunkulu olobukhwele, ngiphindisela ububi baboyise phezu kwabantwana, kuze kube sesizukulwaneni sesithathu lesesine sabangizondayo,
6 Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
kodwa ngibenzela umusa abayizinkulungwane zabangithandayo lezabagcina imilayo yami.
7 Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
Ungaliphathi ngeze ibizo leNkosi uNkulunkulu wakho; ngoba iNkosi kayiyikumyekela engelacala ophatha ibizo layo ngeze.
8 Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ.
Khumbula usuku lwesabatha, ukulugcina lube ngcwele.
9 Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile.
Insuku eziyisithupha uzasebenza, uwenze wonke umsebenzi wakho;
10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị.
kodwa usuku lwesikhombisa lulisabatha leNkosi uNkulunkulu wakho; ungenzi loba yiwuphi umsebenzi ngalo, wena lendodana yakho lendodakazi yakho, inceku yakho lencekukazi yakho lezifuyo zakho lowemzini wakho ophakathi kwamasango akho.
11 Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.
Ngoba ngensuku eziyisithupha iNkosi yenza amazulu lomhlaba lolwandle lakho konke okukukho, yasiphumula ngosuku lwesikhombisa; ngalokhu iNkosi yalubusisa usuku lwesabatha, yalungcwelisa.
12 Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Hlonipha uyihlo lonyoko, ukuze insuku zakho zelulwe elizweni iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona.
13 Gị egbula mmadụ.
Ungabulali.
14 Gị akwala iko.
Ungafebi.
15 Gị ezula ohi.
Ungebi.
16 Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
Unganiki ubufakazi bamanga ngomakhelwane wakho.
17 Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
Ungafisi indlu kamakhelwane wakho, ungafisi umkamakhelwane wakho, lenceku yakhe, lencekukazi yakhe, lenkabi yakhe, lobabhemi wakhe, njalo loba yini ekamakhelwane wakho.
18 Mgbe ndị Izrel hụrụ egbe eluigwe, na amụma ọkụ, na opi ike, hụkwa ugwu ahụ ka o jupụtakwara nʼanwụrụ ọkụ, ha mara jijiji nʼihi egwu. Ha guzoro nʼebe dị anya,
Bonke abantu basebebona imidumo lemibane lelizwi lophondo, lentaba ithunqa. Kwathi abantu bekubona bathuthumela, bema khatshana;
19 sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.”
bathi kuMozisi: Khuluma wena lathi, njalo sizakuzwa; kodwa uNkulunkulu kangakhulumi lathi hlezi sife.
20 Mosis sịrị ndị Izrel, “Unu atụkwala ụjọ, nʼihi na Chineke bịara ịnwale unu ime ka unu na-atụ ya egwu mgbe ọbụla ka unu ghara imehie megide ya.”
UMozisi wasesithi ebantwini: Lingesabi; ngoba uNkulunkulu ufikile ukuze alilinge, lokuze ukwesabeka kwakhe kube phambi kwenu, ukuze lingoni.
21 Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.
Abantu bema-ke khatshana; kodwa uMozisi wasondela emnyameni onzima lapho uNkulunkulu ayekhona.
22 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị, ‘Unu onwe unu ahụla na m si nʼeluigwe gwa unu okwu.
INkosi yasisithi kuMozisi: Uzakutsho njalo kubantwana bakoIsrayeli uthi: Lina selibonile ukuthi ngikhulume lani ngisemazulwini.
23 Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha.
Kaliyikwenza kanye lami onkulunkulu besiliva, njalo onkulunkulu begolide kaliyikuzenzela.
24 “‘Ebe ịchụ aja unu ga-ewuru m ga-abụ nke unu ji naanị aja wuo. Nʼebe ahụ ka unu ga-achụrụ m aja nsure ọkụ na aja udo. Unu ga-ejikwa igwe ewu na atụrụ, na ehi chụọrọ m aja. Unu ga-ewuru m ebe ịchụ aja naanị ebe ọbụla m mere ka aha m bụrụ ihe a na-asọpụrụ, nʼebe ahụ ka m ga-abịa gọzie unu.
Ngenzela ilathi lenhlabathi, unikele phezu kwalo iminikelo yakho yokutshiswa leminikelo yakho yokuthula, izimvu zakho lenkabi zakho. Kuyo yonke indawo lapho engilenza ibizo lami ukuthi likhunjulwe khona ngizakuza kuwe ngikubusise.
25 Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya.
Kodwa uba ungenzela ilathi lamatshe, awuyikulakha ngamatshe abaziweyo; ngoba nxa uphakamisela kulo insimbi yakho yokubaza, uyalingcolisa.
26 Unu ejila ihe nrigo gbagoro nʼebe ịchụ aja m, ka a ghara ikpughe ọtọ unu nʼelu ya.’
Awuyikukhwela phezu kwelathi lami ngezikhwelo, ukuze ubunqunu bakho bungembulwa phezu kwalo.

< Ọpụpụ 20 >