< Ọpụpụ 18 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ Onyenwe anyị si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt.
וישמע יתרו כהן מדין חתן משה את כל אשר עשה אלהים למשה ולישראל עמו כי הוציא יהוה את ישראל ממצרים
2 Jetro ọgọ nwoke Mosis kpọọrọ Zipọra, nwunye Mosis, mgbe Mosis chụlara ya
ויקח יתרו חתן משה את צפרה אשת משה--אחר שלוחיה
3 na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Aha nwa ya nke mbụ bụ Geshọm, nke pụtara, abụ m ọbịa na mba ọzọ.
ואת שני בניה אשר שם האחד גרשם--כי אמר גר הייתי בארץ נכריה
4 Aha nwa nwoke nke abụọ bụ Elieza, nke bụ, Onyenwe anyị bụ onye inyeaka m. Nʼihi na mgbe Mosis mụrụ Elieza o kwuru sị, “Chineke nna m bụ onye inyeaka m, nʼihi na ọ napụtara m site na mma agha Fero.”
ושם האחד אליעזר--כי אלהי אבי בעזרי ויצלני מחרב פרעה
5 Jetro, ọgọ nwoke Mosis, bịakwutere ha nʼime ọzara. O dutere ụmụ ndị ikom Mosis abụọ na nwunye Mosis. Nʼoge ahụ, Mosis na ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu Chineke.
ויבא יתרו חתן משה ובניו ואשתו--אל משה אל המדבר אשר הוא חנה שם--הר האלהים
6 O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.”
ויאמר אל משה אני חתנך יתרו בא אליך ואשתך--ושני בניה עמה
7 Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha.
ויצא משה לקראת חתנו וישתחו וישק לו וישאלו איש לרעהו לשלום ויבאו האהלה
8 Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha.
ויספר משה לחתנו את כל אשר עשה יהוה לפרעה ולמצרים על אודת ישראל את כל התלאה אשר מצאתם בדרך ויצלם יהוה
9 Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt.
ויחד יתרו--על כל הטובה אשר עשה יהוה לישראל אשר הצילו מיד מצרים
10 Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero.
ויאמר יתרו ברוך יהוה אשר הציל אתכם מיד מצרים ומיד פרעה אשר הציל את העם מתחת יד מצרים
11 Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.”
עתה ידעתי כי גדול יהוה מכל האלהים כי בדבר אשר זדו עליהם
12 Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.
ויקח יתרו חתן משה עלה וזבחים--לאלהים ויבא אהרן וכל זקני ישראל לאכל לחם עם חתן משה--לפני האלהים
13 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị.
ויהי ממחרת וישב משה לשפט את העם ויעמד העם על משה מן הבקר עד הערב
14 Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”
וירא חתן משה את כל אשר הוא עשה לעם ויאמר מה הדבר הזה אשר אתה עשה לעם--מדוע אתה יושב לבדך וכל העם נצב עליך מן בקר עד ערב
15 Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke.
ויאמר משה לחתנו כי יבא אלי העם לדרש אלהים
16 Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”
כי יהיה להם דבר בא אלי ושפטתי בין איש ובין רעהו והודעתי את חקי האלהים ואת תורתיו
17 Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.
ויאמר חתן משה אליו לא טוב הדבר אשר אתה עשה
18 Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya.
נבל תבל--גם אתה גם העם הזה אשר עמך כי כבד ממך הדבר לא תוכל עשהו לבדך
19 Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.
עתה שמע בקלי איעצך ויהי אלהים עמך היה אתה לעם מול האלהים והבאת אתה את הדברים אל האלהים
20 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ.
והזהרתה אתהם את החקים ואת התורת והודעת להם את הדרך ילכו בה ואת המעשה אשר יעשון
21 Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri.
ואתה תחזה מכל העם אנשי חיל יראי אלהים אנשי אמת--שנאי בצע ושמת עלהם שרי אלפים שרי מאות שרי חמשים ושרי עשרת
22 Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe.
ושפטו את העם בכל עת והיה כל הדבר הגדל יביאו אליך וכל הדבר הקטן ישפטו הם והקל מעליך ונשאו אתך
23 Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.”
אם את הדבר הזה תעשה וצוך אלהים ויכלת עמד וגם כל העם הזה על מקמו יבא בשלום
24 Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru.
וישמע משה לקול חתנו ויעש כל אשר אמר
25 O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.
ויבחר משה אנשי חיל מכל ישראל ויתן אתם ראשים על העם--שרי אלפים שרי מאות שרי חמשים ושרי עשרת
26 Ha jere ozi dịka ndị ikpe nye ndị mmadụ nʼoge niile. Ha na-ewetara Mosis okwu niile siri ike, ma ha onwe ha na-ekpe ikpe banyere okwu nke dịkarịsịrị nta.
ושפטו את העם בכל עת את הדבר הקשה יביאון אל משה וכל הדבר הקטן ישפוטו הם
27 Mgbe ahụ, Mosis zilagara nna nwunye ya. Jetro laghachikwara nʼobodo nke aka ya.
וישלח משה את חתנו וילך לו אל ארצו

< Ọpụpụ 18 >