< Ọpụpụ 17 >

1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ.
Then all the Israelites left the Desert of Sin, going from place to place as they followed the Lord's commands. They camped at Rephidim, but there wasn't any water for the people to drink.
2 Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”
Some of them came and complained to Moses, saying, “Give us water to drink!” Moses replied, “Why are you complaining to me?” Moses asked. “Why are you trying to challenge the Lord?”
3 Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”
But the people were so thirsty for water there that they went on complaining to Moses, saying, “Why did you have to bring us out of Egypt? Are you trying to kill us and our children and livestock by thirst?”
4 Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”
Moses cried out to the Lord, “What am I going to do with these people? A bit more of this and they're going to stone me!”
5 Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.
The Lord told Moses, “Go ahead of the people, and take some of the elders of Israel with you. Take with you the walking stick you used to hit the Nile, and just go on ahead.
6 Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.
Look, I will stand there beside you by the rock at Horeb. When you hit the rock water will pour out for the people to drink.” So Moses did this as the elders of Israel watched.
7 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”
He called the place Massah and Meribah because the Israelites argued there, and because they challenged the Lord, saying, “Is the Lord with us, or not?”
8 Ndị Amalek bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim.
Then some Amalekites came and attacked the Israelites at Rephidim.
9 Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.”
Moses told Joshua, “Choose some of men and go out and fight the Amalekites. Tomorrow I'll stand on the top of this hill holding the walking stick of God.”
10 Ya mere, Joshua pụrụ gaa lụso ndị Amalek agha dịka Mosis gwara ya. Ma Mosis na Erọn na Hua, rigoro nʼelu ugwu ahụ.
Joshua did what Moses told him and fought the Amalekites, while Moses, Aaron, and Hur climbed to the top of the hill.
11 Ndị Izrel na-enwe mmeri mgbe ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ma ndị Amalek na-emeri mgbe ọbụla Mosis wedatara aka ya.
As long as Moses held up the walking stick his hands, the Israelites were the ones winning, but when he lowered them, it was the Amalekites.
12 Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara.
So when Moses' hands became heavy, the others took a stone and put it under him for him to sit on. Aaron and Hur stood on each side of Moses and held his hands up. In this way his hands were kept firmly up until the sun went down.
13 Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha.
As a result Joshua defeated the Amalekite army.
14 Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.”
The Lord told Moses, “Write all this down on a scroll as a reminder and read it out loud to Joshua, because I'm going to completely wipe out the Amalekites so nobody on earth will remember them.”
15 Mosis wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ kpọrọ ya Onyenwe anyị Nisi, nke pụtara, Onyenwe anyị bụ ọkọlọtọ m.
Moses built an altar and called it “the Lord is my banner of victory.”
16 Mosis sịrị, “Nʼihi na-eweliri aka elu nʼebe ocheeze Onyenwe anyị dị. Onyenwe anyị ga na-ebuso ndị Amalek agha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
“Hold up the victory banner of the Lord!” Moses declared. “The Lord will go on fighting the Amalekites for all generations!”

< Ọpụpụ 17 >