< Ọpụpụ 16 >
1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.
The whole Israelite community left Elim and went to the Desert of Sin, between Elim and Sinai. This was on the fifteenth day of the second month after they had left the land of Egypt.
2 Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn.
There in the desert they complained to Moses and Aaron.
3 Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”
“The Lord should've killed us back in Egypt!” the Israelites told them. “At least there we could sit down beside stewpots of meat and eat bread until we were full. But you had to bring all of us out here in the desert to starve us all to death!”
4 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.
The Lord told Moses, “Just watch! I'm going to rain down bread from heaven for you! Each day the people are to go out and collect enough for that day. I'm going to test them by this to find out whether they'll follow my instructions or not.
5 Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”
On the sixth day they are to collect twice as much as usual and prepare it.”
6 Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.
So Moses and Aaron explained to all the Israelites, “This evening you will have the proof that it was the Lord who led you out of Egypt,
7 Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”
and in the morning you will see the glory of the Lord displayed as he responds to the complaints he's heard you making against him. For why should you be complaining to us? We're nobodies!”
8 Mosis kwukwara sị, “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-atamu megide.”
Then Moses continued, “The Lord is going to give you meat to eat this evening and as much bread as you want in the morning, for he has heard your complaints against him. Why are you complaining to us nobodies? Your complaints aren't directed against us, but against the Lord.”
9 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’”
Then Moses said to Aaron, “Tell the whole Israelite community, ‘Present yourselves before the Lord, because he has heard your complaints.’”
10 Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube Onyenwe anyị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii.
While Aaron was still speaking to all the Israelites, they looked toward the desert and saw the glory of the Lord appear in a cloud.
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
The Lord told Moses,
12 “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
“I have heard the complaints of the Israelites. Tell them, ‘In the evening you will eat meat, and in the morning you will have as much bread as you want. Then you will know that I am the Lord your God.’”
13 Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
That evening quail flew in and landed, filling the camp. In the morning dew covered the ground all around the camp.
14 Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.
Once the dew had gone, there was something thin and flaky on the desert, looking like frost crystals on the ground.
15 Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.
When the Israelites saw it, they asked each another, “What is it?” because they had no idea what it was. So Moses explained to them, “It's the bread the Lord has provided for you to eat.
16 Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’”
This is what the Lord has ordered you to do: ‘All of you shall collect as much as is needed. Take an omer for each person in your tent.’”
17 Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.
So the Israelites did as they were told. Some collected more, while others collected less.
18 Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.
But when they measured it out in omers, those who had collected a lot didn't have any left over, while those who had only collected a little still had enough. Each person collected gathered as much as they needed to eat.
19 Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”
Then Moses said to them, “No one is to leave any of it until the morning.”
20 Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.
But some didn't listen to Moses. They did leave some of it until the morning, and it was full of maggots and smelled bad. Moses became angry with them.
21 Site nʼụbọchị ahụ, gaa nʼihu, ezinaụlọ ọbụla na-ewebata nri nʼụtụtụ ọbụla, dịka mkpa ha siri dị. Mgbe anwụ wara, nri ahụ niile fọdụrụ na-agbaze.
So each morning everyone collected as much as they needed, and when the sun became hot, it melted away to nothing.
22 Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis.
However, on the sixth day, they collected twice as much of this food, two omers for each person. All the Israelite leaders came and told Moses what they had done.
23 Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’”
Moses replied, “These are the Lord's instructions: ‘Tomorrow is a special day of rest, a holy Sabbath to honor the Lord. So bake what you want, and boil what you want. Then put to one side what's left and keep it until morning.’”
24 Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.
So they kept it until morning as Moses had ordered, and it didn't smell bad or have any maggots.
25 Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.
Moses told them, “Eat it today, because today is a Sabbath to honor the Lord. Today you won't find anything out there.
26 Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”
You can go out collecting for six days, but on the seventh day, the Sabbath, it won't be there.”
27 Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.
However, on the seventh day some people still went out collecting, but they did not find anything.
28 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m?
The Lord told Moses, “How long are you going to refuse to obey my commands and instructions?
29 Lee, Onyenwe anyị enyela unu ụbọchị izuike. Ya mere, nʼụbọchị nke isii ọ na-enye unu nri ga-ezuru unu abalị abụọ. Onye ọbụla nʼime unu kwesiri ịnọgide nʼụlọ unu. Unu ekwesighị ịpụ apụ.”
You need to understand that the Lord has given you the Sabbath, so on the sixth day he will provide you with food for two days. On the seventh day, everyone has to stay where they are—no one needs to go out.”
30 Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa.
So the people did no work on the seventh day.
31 Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
The Israelites called the food manna. It was white like coriander seed and tasted like wafers with honey.
32 Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’”
Moses said, “This is what the Lord has ordered: ‘Keep an omer of manna as a reminder for future generations, so that they can see the food I used to feed you in the desert when I led you out of Egypt.’”
33 Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”
So Moses told Aaron, “Take a jar and put an omer of manna in it. Then place it before the Lord to be kept as a reminder for future generations.”
34 Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Aaron did so and placed the jar in front of the Testimony, to be preserved just as the Lord had ordered Moses.
35 Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.
The Israelites ate manna forty years, until they came to the land where they would settle down—they ate manna until they arrived at the border of Canaan.
36 (Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)
(An omer is a tenth of an ephah.)