< Ọpụpụ 16 >

1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.
Pambuyo pake gulu lonse la Aisraeli linachoka ku Elimu, ndipo pa tsiku la khumi ndi chisanu mwezi wachiwiri chichokere mʼdziko la Igupto, anafika ku chipululu cha Sini chimene chinali pakati pa Elimu ndi Sinai.
2 Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn.
Mʼchipululumo gulu lonse linadandaulira Mose ndi Aaroni
3 Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”
kuti, “Kukanakhala bwino Yehova akanatiphera mʼdziko la Igupto! Kumeneko timadya nyama ndi buledi mpaka kukhuta, koma inu mwabwera nafe ku chipululu kudzapha mpingo wonsewu ndi njala!”
4 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.
Ndipo Yehova anati kwa Mose, “Ine ndidzakupatsani buledi wogwa kuchokera kumwamba ngati mvula. Anthu azituluka tsiku lililonse kukatola buledi wokwanira tsiku limenelo. Ine ndidzawayesa mʼnjira imeneyi kuti ndione ngati adzatsatira malangizo anga.
5 Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”
Pa tsiku lachisanu ndi chimodzi, pamene azidzakonza buledi amene abwera naye, adzapeza kuti ndi wokwanira masiku awiri.”
6 Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.
Kotero Mose ndi Aaroni anati kwa Aisraeli onse, “Nthawi yamadzulo inu mudzadziwa kuti ndi Yehova amene anakutulutsani mʼdziko la Igupto.
7 Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”
Ndipo mmawa mudzaona ulemerero wa Yehova pakuti wamva kudandaula kwanu. Kodi ife ndi yani kuti muzitidandaulira?”
8 Mosis kwukwara sị, “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-atamu megide.”
Mose anati, “Yehova adzakupatsani nyama madzulo aliwonse ndi buledi mmawa uliwonse kuti mukhute chifukwa Iye wamva madandawulo anu. Nanga ife ndi yani? Kudandaula kwanu simudandaulira ife, koma Yehova.”
9 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’”
Kenaka Mose anawuza Aaroni kuti, “Uza gulu lonse la Aisraeli kuti, ‘Bwerani pamaso pa Yehova pakuti wamva kudandaula kwanu.’”
10 Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube Onyenwe anyị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii.
Pamene Aaroni amayankhula ndi gulu lonse la Aisraeli, iwo anayangʼana ku chipululu, ndipo ulemerero wa Yehova umaoneka mu mtambo.
11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Yehova anati kwa Mose,
12 “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
“Ine ndamva kudandaula kwa Aisraeli. Awuze kuti, ‘Madzulo mudzadya nyama ndipo mmawa mudzakhuta buledi. Pamenepo mudzadziwa kuti ine ndine Yehova Mulungu wanu.’”
13 Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
Madzulo amenewo panatuluka zinziri zimene zinali ponseponse pa misasa yawo, ndipo mmawa panali mame kuzungulira misasa yawo.
14 Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.
Mamewo atachoka, pa nthaka mʼchipululumo panaoneka tinthu tina topyapyala komanso totuwa ngati chipale.
15 Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.
Aisraeli atationa anafunsana wina ndi mnzake nati, “Kodi timeneti nʼchiyani?” Popeza sanatidziwe. Mose anawawuza kuti, “Uyu ndi buledi amene Yehova wakupatsani kuti mudye.
16 Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’”
Yehova walamula kuti, ‘Aliyense atole zomukwanira kudya, malita awiri pa munthu mmodzi molingana ndi chiwerengero cha anthu amene ali mu tenti yanu.’”
17 Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.
Aisraeli anachita zonse anawawuza. Ena anatola zambiri ena zochepa.
18 Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.
Ndipo iwo atayeza ndi muyeso wa malita awiri, iye amene anatola zambiri sizinamutsalireko ndipo amene anatola pangʼono sizinamuchepere. Aliyense anatola zomukwanira kudya.
19 Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”
Ndipo Mose anawawuza kuti, “Wina aliyense asasunge mpaka mmawa.”
20 Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.
Komabe ena sanamvere Mose, anasungako mpaka mmawa. Koma mmawa mwake tonse tinali mphutsi zokhazokha. Kotero Mose anawapsera mtima.
21 Site nʼụbọchị ahụ, gaa nʼihu, ezinaụlọ ọbụla na-ewebata nri nʼụtụtụ ọbụla, dịka mkpa ha siri dị. Mgbe anwụ wara, nri ahụ niile fọdụrụ na-agbaze.
Mmawa uliwonse aliyense amatola zimene amazifuna, ndipo dzuwa likatentha zimasungunuka.
22 Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis.
Tsiku lachisanu ndi chimodzi anatuta malita anayi munthu aliyense, ndipo atsogoleri a mpingo wonse anabwera kudzawuza Mose za zimenezi.
23 Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’”
Iye anawawuza kuti, “Izi ndi zimene Yehova analamula, ‘Mawa ndi tsiku lopumula, Sabata Loyera la Yehova, choncho wotchani ndi kuphika zimene mukufuna. Sungani zotsala mpaka mmawa.’”
24 Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.
Choncho anasunga mpaka mmawa monga Mose anawalamulira, ndipo sananunkhe kapena kuchita mphutsi.
25 Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.
Mose anati, “Idyani lero chifukwa lero ndi Sabata la Yehova. Lero simukapeza chilichonse kunjaku.
26 Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”
Muzitola chakudya masiku asanu ndi limodzi koma tsiku la chisanu ndi chiwiri ndi la Sabata, simukapeza chilichonse kunjaku.”
27 Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.
Komabe anthu ena anapita kuti akatole chakudya tsiku lachisanu ndi chiwiri, koma sanapeze kanthu.
28 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m?
Ndipo Yehova anafunsa Mose nati, “Kodi inu muzipitirira kukana kusunga malamulo ndi malangizo anga mpaka liti?
29 Lee, Onyenwe anyị enyela unu ụbọchị izuike. Ya mere, nʼụbọchị nke isii ọ na-enye unu nri ga-ezuru unu abalị abụọ. Onye ọbụla nʼime unu kwesiri ịnọgide nʼụlọ unu. Unu ekwesighị ịpụ apụ.”
Taonani, popeza Yehova wakupatsani Sabata nʼchifukwa chake tsiku lachisanu ndi chimodzi amakupatsani chakudya cha masiku awiri. Aliyense azikhala pamene ali pa tsiku lachisanu ndi chiwiri, pasapezeke wotuluka kunja.”
30 Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa.
Kotero anthu anapuma tsiku lachisanu ndi chiwiri.
31 Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
Aisraeli anatchula chakudyacho Mana. Chakudyacho chinkaoneka ngati mbewu zamapira, zoyera. Ndipo chinkakoma ngati chothira uchi.
32 Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’”
Mose anati, “Chimene Yehova walamula ndi ichi: ‘Tengani muyeso wa malita awiri a mana ndi kusungira mibado imene ikubwera, kuti iwo adzaone chakudya chimene Ine ndinakupatsani kuti mudye mʼchipululu pamene ndinakutulutsani mʼdziko la Igupto.’”
33 Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”
Choncho Mose anati kwa Aaroni, “Tenga mtsuko ndipo uyikemo malita awiri a mana. Ndipo uyike manawo pamaso pa Yehova kusungira mibado imene ikubwera.”
34 Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Monga momwe Yehova analamulira Mose, Aaroni anayika mtsuko uja pafupi ndi bokosi la Chipangano kuti manawo asungike.
35 Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.
Aisraeli anadya mana zaka 40, mpaka pamene anafika ku dziko kumene amati akakhazikeko. Iwo anadya mana mpaka pamene anafika mʼmalire a Kanaani.
36 (Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)
(Malita awiri amafanana ndi gawo lakhumi la efa).

< Ọpụpụ 16 >