< Ọpụpụ 15 >

1 Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.
Kisha Musa na watu wa Israeli wakaimba hii nyimbo kwa Yahweh. Waliimba, “Nitaimba kwa Yahweh, kwa kuwa ameshinda kwa utukufu; farasi na dereva wake amewatupa kwenye bahari.
2 “Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
Yahweh ni uweza wangu na nyimbo yangu, na amekuwa wokovu wangu. Huyu ni Mungu wangu, na nitamsifu, Mungu wa baba yangu, nitamtukuza.
3 Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị.
Yahweh ni shujaa; Yahweh ni jina lake.
4 Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie.
Ametupa magari ya farasi ya Farao na jeshi lake kwenye bahari. Maafisa wa Farao hodari walizama kwenye Bahari ya Shamu.
5 Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.
Kina kiliwafunika; walienda kwenye kina kama jiwe.
6 Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.
Mkono wako wakulia, Yahweh, una nguvu ya utukufu; mkono wako, Yahweh, umewavunja adui.
7 “Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka.
Kwa utukufu mkubwa umewapindua walio inuka dhidi yako. Umetuma gadhabu; imewateketeza kama karatasi.
8 I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri.
Kwa pumzi ya pua yako maji yalijaa; maji yanayo tembea yalisimama wima na kujaa juu; maji yalikuwa manene ndani ya kilindi cha bahari.
9 Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’
Adui alisema, 'Nitakimbiza, nitapita, nitagawa nitakacho chukuwa; tamanio langu litatimizwa kwao; nitavuta upanga wangu; mkono wangu utawaharibu wao.'
10 Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe.
Lakini ulipuliza kwa upepo wako, na bahari ikawafunika wao; walizama kama chuma nzito kwenye maji mengi.
11 Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube?
Ni nani kama wewe, Yahweh, miongoni mwa miungu? Nani kama wewe, mtakatifu wa utukufu, katika sifa umetukuzwa, anaye fanya miujiza?
12 “I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.
Ulinyoosha mkono wako wa kulia, na dunia ikawameza.
13 Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.
Katika uaminifu wa agano lako umewaongoza watu ulio waokoa. Katika uweza wako umewaongoza katika sehemu takatifu unayo ishi.
14 Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.
Watu watasikia, na watatetemeka; hofu itawakumba wakazi wa Filistia.
15 Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;
Kisha wazee wa Edomu wataogopa; wanajeshi wa Moabu watetemeka; wakazi wote wa Kanani watayayuka.
16 oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.
Mshituko na hofu vitawaangukia. Kwasababu ya nguvu ya mkono wako, watakuwa kimya kama jiwe hadi watu wako watakapo pita, Yahweh - hadi watu ulio waokoa watakapo pita.
17 Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.
Utawaleta na kuwapanda kwenye mlima wa urithi wako, sehemu, Yahweh, ulio jenga ya kuishi, sehemu takatifu, Bwana wetu, mikono yako iliyo jenga.
18 “Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”
Yahweh ata tawala milele na milele.”
19 Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.
Kwa kuwa farasi wa Farao walienda na magari ya farasi na wapanda farasi kwenye bahari. Yahweh alileta maji ya bahari juu yao. Lakini Waisraeli walienda juu ya nchi kavu katikati ya bahari.
20 Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.
Miriamu nabii wa kike, dada wa Aruni, akanyanyua tari, na wanawake wote wakatoka na matari, wakicheza nae.
21 Miriam bụrụ abụ sị ha, “Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nke ukwu. Ịnyịnya na ndị na-agba ha, ka ọ tụnyere nʼime osimiri.”
Miriamu akawaimbia: “Muimbieni Yahweh, kwa kuwa ameshinda kwa utukufu. Farasi na mpanda farasi amewatupa baharini.
22 Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ
Kisha Musa akaongoza Israeli mbele kupita Bahari ya Shamu. Walienda nyikani ya Shuri. Walisafiri kwa siku tatu nyikani pasipo kuona maji yeyote.
23 Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.)
Kisha wakaja Mara, lakini hawakunywa maji ya huko kwasababu yalikuwa machungu. Hivyo wakaita hiyo sehemu Mara.
24 Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?”
Hivyo watu wakamlalamikia Musa na kusema, “Nini tunaweza kunywa?”
25 Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.
Musa akamlilia Yahweh, na kumonyesha mti. Musa akautupa kwenye maji, na maji yakawa matamu kunywa. Ndio pale Yahweh alipowapa sheria kali, na ndio pale alipo wajaribu.
26 Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”
Alisema, “Kama utasikiliza sauti ya Yahweh Mungu wako kwa umakini, na kufanya yalio sahihi machoni pake, na kama utatega sikio kwa amri zake na kutii sheria zake zote - sitawaekea ninyi magonjwa yale niliyo waekea Wamisri, kwa kuwa mimi ni Yahweh ninaye kuponya.”
27 Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.
Kisha watu wakaja Elimu, palipo kuwa na chemichemi kumi na mbili za maji na miti sabini ya mtende. Walieka kambi hapo pembeni ya maji.

< Ọpụpụ 15 >