< Ọpụpụ 15 >

1 Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.
Then singeth Moses and the sons of Israel this song to Jehovah, and they speak, saying: — 'I sing to Jehovah, For triumphing He hath triumphed; The horse and its rider He hath thrown into the sea.
2 “Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
My strength and song is JAH, And He is become my salvation: This [is] my God, and I glorify Him; God of my father, and I exalt Him.
3 Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị.
Jehovah [is] a man of battle; Jehovah [is] His name.
4 Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie.
Chariots of Pharaoh and his force He hath cast into the sea; And the choice of his captains Have sunk in the Red Sea!
5 Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.
The depths do cover them; They went down into the depths as a stone.
6 Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro.
Thy right hand, O Jehovah, Is become honourable in power; Thy right hand, O Jehovah, Doth crush an enemy.
7 “Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka.
And in the abundance of Thine excellency Thou throwest down Thy withstanders, Thou sendest forth Thy wrath — It consumeth them as stubble.
8 I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri.
And by the spirit of Thine anger Have waters been heaped together; Stood as a heap have flowings; Congealed have been depths In the heart of a sea.
9 Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’
The enemy said, I pursue, I overtake; I apportion spoil; Filled is my soul with them; I draw out my sword; My hand destroyeth them: —
10 Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe.
Thou hast blown with Thy wind The sea hath covered them; They sank as lead in mighty waters.
11 Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube?
Who [is] like Thee among the gods, O Jehovah? Who [is] like Thee — honourable in holiness — Fearful in praises — doing wonders?
12 “I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.
Thou hast stretched out Thy right hand — Earth swalloweth them!
13 Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ.
Thou hast led forth in Thy kindness The people whom Thou hast redeemed. Thou hast led on in Thy strength Unto Thy holy habitation.
14 Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị.
Peoples have heard, they are troubled; Pain hath seized inhabitants of Philistia.
15 Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze;
Then have chiefs of Edom been troubled: Mighty ones of Moab — Trembling doth seize them! Melted have all inhabitants of Canaan!
16 oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.
Fall on them doth terror and dread; By the greatness of Thine arm They are still as a stone, Till Thy people pass over, O Jehovah; Till the people pass over Whom Thou hast purchased.
17 Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.
Thou dost bring them in, And dost plant them In a mountain of Thine inheritance, A fixed place for Thy dwelling Thou hast made, O Jehovah; A sanctuary, O Lord, Thy hands have established;
18 “Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”
Jehovah reigneth — to the age, and for ever!'
19 Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.
For the horse of Pharaoh hath gone in with his chariots and with his horsemen into the sea, and Jehovah turneth back on them the waters of the sea, and the sons of Israel have gone on dry land in the midst of the sea.
20 Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.
And Miriam the inspired one, sister of Aaron, taketh the timbrel in her hand, and all the women go out after her, with timbrels and with choruses;
21 Miriam bụrụ abụ sị ha, “Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nke ukwu. Ịnyịnya na ndị na-agba ha, ka ọ tụnyere nʼime osimiri.”
and Miriam answereth to them: — 'Sing ye to Jehovah, For Triumphing He hath triumphed; The horse and its rider He hath thrown into the sea!'
22 Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ
And Moses causeth Israel to journey from the Red Sea, and they go out unto the wilderness of Shur, and they go three days in the wilderness, and have not found water,
23 Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.)
and they come in to Marah, and have not been able to drink the waters of Marah, for they [are] bitter; therefore hath [one] called its name Marah.
24 Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?”
And the people murmur against Moses, saying, 'What do we drink?'
25 Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.
and he crieth unto Jehovah, and Jehovah sheweth him a tree, and he casteth unto the waters, and the waters become sweet. There He hath made for them a statute, and an ordinance, and there He hath tried them,
26 Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”
and He saith, 'If thou dost really hearken to the voice of Jehovah thy God, and dost that which is right in His eyes, and hast hearkened to His commands, and kept all His statutes: none of the sickness which I laid on the Egyptians do I lay on thee, for I, Jehovah, am healing thee.
27 Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.
And they come to Elim, and there [are] twelve fountains of water, and seventy palm trees; and they encamp there by the waters.

< Ọpụpụ 15 >