< Ọpụpụ 13 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
И рече Господ Мојсију говорећи:
2 “Dooro m nsọ onye ọbụla bụ ọkpara, onye ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼetiti ụmụ Izrel, na nʼetiti mmadụ ma nʼetiti anụ ụlọ, nke m ka ọ bụ.”
Посвети ми сваког првенца, шта год отвара материцу у синова Израиљевих, и од људи и од стоке; јер је моје.
3 Mosis gwara ndị Izrel sị, “Chetanụ ụbọchị taa, ụbọchị unu si nʼala Ijipt pụta, ala ebe unu bụ ndị ohu, nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼike aka ya dị ukwu kpọpụta unu site nʼebe ahụ. Unu erikwala achịcha ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee.
И Мојсије рече народу: Памтите овај дан, у који изиђосте из Мисира, из дома ропског, јер вас руком крепком изведе Господ оданде; нека се дакле не једе ништа с квасцем.
4 Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt.
Данас излазите, месеца Авива;
5 Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a.
Па кад те Господ уведе у земљу хананејску и хетејску и аморејску и јевејску и јевусејску, за коју се заклео оцима твојим да ће ти је дати, земљу у којој тече млеко и мед, тада да служиш службу ову овог месеца;
6 Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị.
Седам дана једи хлебове пресне, а седми дан нека је празник Господњи.
7 Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile.
Хлебови пресни да се једу седам дана, и да се не види у тебе ништа с квасцем, нити да се види у тебе квасац у целом крају твом.
8 Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’
И казаћеш сину свом у тај дан говорећи: Ово је за оно што ми је учинио Господ кад сам излазио из Мисира.
9 Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.
И нека ти буде као знак на руци твојој и као спомен пред очима твојим, да ти закон Господњи буде у устима; јер те је руком крепком извео Господ из Мисира.
10 Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.
Зато врши закон овај на време, од године до године.
11 “Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,
И кад те уведе Господ у земљу хананејску, као што се заклео теби и твојим оцима, и да ти је,
12 unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.
Одвајаћеш Господу шта год отвара материцу, и од стоке твоје шта год отвара материцу, шта је мушко, да буде Господу.
13 Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ.
А свако магаре првенче откупи јагњетом или јаретом; ако ли га не би откупио, сломи му врат. Али сваког првенца човечјег између синова својих откупи.
14 “Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu.
А кад те запита син твој унапред говорећи: Шта је то? Реци му: Руком крепком изведе нас Господ из Мисира, из дома ропског.
15 Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’
Јер кад отврдну Фараон, те нас не хте пустити, поби Господ све првенце у земљи мисирској од првенца човечјег до првенца од стоке; зато приносим Господу све мушко што отвара материцу, а сваког првенца синова својих откупљујем.
16 Mmemme a ga-adị ka ihe ịrịbama nʼanya unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.”
И то нека ти је као знак на руци и као почеоник међу очима твојим, да нас је руком крепком извео Господ из Мисира.
17 Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.”
А кад Фараон пусти народ, не одведе их Бог путем к земљи филистејској, ако и беше краћи, јер Бог рече: Да се не покаје народ кад види рат, и не врати се у Мисир.
18 Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.
Него Бог заведе народ путем преко пустиње на Црвеном Мору. А војничким редом изиђоше синови Израиљеви из земље мисирске.
19 Mosis buuru ọkpụkpụ Josef mgbe ha na-ala. Nʼihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọ iyi na ha ga-eme otu a, na-asị, “Chineke ga-eleta unu nʼezie, mgbe ahụ, unu aghaghị iburu ọkpụkpụ m si nʼebe a pụọ.”
И Мојсије узе кости Јосифове са собом; јер беше заклео синове Израиљеве рекавши: Заиста ће вас походити Бог, а тада изнесите кости моје одавде са собом.
20 Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara.
Тако отишавши из Сохота стадоше у логор у Етаму, накрај пустиње.
21 Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.
А Господ иђаше пред њима дању у ступу од облака водећи их путем, а ноћу у ступу од огња светлећи им, да би путовали дању и ноћу.
22 Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.
И не уклањаше испред народа ступ од облака дању ни ступ од огња ноћу.

< Ọpụpụ 13 >