< Ọpụpụ 11 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis, “Aga m ewetara Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ekwe ka unu si nʼebe a pụọ. Nʼeziokwu, ọ ga-eji aka ya chụpụ unu nʼala ya.
And the LORD said to Moses, Yet will I bring one plague more on Pharaoh, and on Egypt; afterwards he will let you go hence: when he shall let you go, he shall surely thrust you out hence altogether.
2 Gwa nwoke na nwanyị Izrel ọbụla ka ha jikere. Ha rịọọ ndị agbataobi ha bụ ndị Ijipt, ka ha nye ha ihe ọbụla e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.”
Speak now in the ears of the people, and let every man borrow of his neighbor, and every woman of her neighbor, jewels of silver and jewels of gold.
3 Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.
And the LORD gave the people favor in the sight of the Egyptians. Moreover the man Moses was very great in the land of Egypt, in the sight of Pharaoh’s servants, and in the sight of the people.
4 Ya mere, Mosis sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼihe dịka nʼetiti abalị taa, aga m agafe nʼime ala Ijipt niile.
And Moses said, Thus says the LORD, About midnight will I go out into the middle of Egypt:
5 Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.
And all the firstborn in the land of Egypt shall die, from the first born of Pharaoh that sits on his throne, even to the firstborn of the maidservant that is behind the mill; and all the firstborn of beasts.
6 Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ.
And there shall be a great cry throughout all the land of Egypt, such as there was none like it, nor shall be like it any more.
7 Ma nʼebe ụmụ Izrel nọ, nkịta agaghị agbọ nwoke maọbụ nwanyị maọbụ anụmanụ ọbụla ụja.’ Site na nke a, ị ga-amata na Onyenwe anyị na-akpa oke nʼetiti ndị Izrel na ndị Ijipt.
But against any of the children of Israel shall not a dog move his tongue, against man or beast: that you may know how that the LORD does put a difference between the Egyptians and Israel.
8 Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.
And all these your servants shall come down to me, and bow down themselves to me, saying, Get you out, and all the people that follow you: and after that I will go out. And he went out from Pharaoh in a great anger.
9 Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, “Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt.”
And the LORD said to Moses, Pharaoh shall not listen to you; that my wonders may be multiplied in the land of Egypt.
10 Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ.
And Moses and Aaron did all these wonders before Pharaoh: and the LORD hardened Pharaoh’s heart, so that he would not let the children of Israel go out of his land.

< Ọpụpụ 11 >