< Ọpụpụ 11 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis, “Aga m ewetara Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ekwe ka unu si nʼebe a pụọ. Nʼeziokwu, ọ ga-eji aka ya chụpụ unu nʼala ya.
Tsopano Yehova anati kwa Mose, “Ine ndidzalanga Farao pamodzi ndi Aigupto onse ndi mliri umodzi wotsiriza. Zikadzachitika izi iye adzakulolani kuti mutuluke mʼdziko lino. Ndithu pamene azidzakutulutsani adzachita ngati akukuyingitsani.
2 Gwa nwoke na nwanyị Izrel ọbụla ka ha jikere. Ha rịọọ ndị agbataobi ha bụ ndị Ijipt, ka ha nye ha ihe ọbụla e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.”
Awuze anthu kuti mwamuna aliyense ndi mkazi aliyense apemphe kwa mnansi wake ziwiya zasiliva ndi golide.”
3 Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.
Tsono Yehova anachititsa Aigupto kuti akomere mtima Aisraeli. Komanso Mose anali wotchuka kwambiri mʼdziko la Igupto, pamaso pa nduna za Farao ndi anthu onse.
4 Ya mere, Mosis sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼihe dịka nʼetiti abalị taa, aga m agafe nʼime ala Ijipt niile.
Tsono Mose anawuza Farao kuti, “Pakati pa usiku, Yehova adzayenda pakati pa anthu a ku Igupto.
5 Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.
Ndipo mwana aliyense wamwamuna wachisamba adzafa, kuyambira mwana wamwamuna wa Farao amene amakhala pa mpando waufumu, mpaka mwana wamwamuna wachisamba wa mdzakazi wake amene ali naye pa mtondo, komanso ana oyamba a ziweto.
6 Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ.
Kudzakhala kulira kwakukulu mʼdziko lonse la Igupto, kumene sikunachitikepo ndipo sikudzachitikanso.
7 Ma nʼebe ụmụ Izrel nọ, nkịta agaghị agbọ nwoke maọbụ nwanyị maọbụ anụmanụ ọbụla ụja.’ Site na nke a, ị ga-amata na Onyenwe anyị na-akpa oke nʼetiti ndị Izrel na ndị Ijipt.
Koma pakati pa Aisraeli, ngakhale galu sadzawuwa munthu aliyense kapena chiweto!” Kotero mudzadziwa kuti Yehova ndiye wasiyanitsa pakati pa Igupto ndi Israeli.
8 Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.
Nduna zanu zonse zidzabwera kwa ine, kugwada pamaso panga ndi kunena kuti, “Pita iwe ndi anthu ako onse amene akukutsatirawa! Zimenezi zikadzachitika ine ndidzachoka.” Ndipo Mose anachoka kwa Farao atakwiya kwambiri.
9 Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, “Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt.”
Yehova ananena kwa Mose kuti, “Farao adzakana kukumvera, kuti zodabwitsa zanga zichuluke mʼdziko la Igupto.”
10 Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ.
Mose ndi Aaroni anachita zodabwitsa zonsezi pamaso pa Farao koma Yehova anawumitsa mtima wa Farao, ndipo sanalole kuti Aisraeli atuluke mʼdziko lake.

< Ọpụpụ 11 >