< Esta 1 >

1 Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa, nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.
Èyí ni ohun tó ṣẹlẹ̀ ní ìgbà Ahaswerusi, tí ó jẹ ọba lórí ẹ̀tàdínláàdóje ìletò bẹ̀rẹ̀ láti India títí ó fi dé Etiopia.
2 Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa.
Ní àkókò ìgbà náà ọba Ahaswerusi ń ṣe ìjọba ní orí ìtẹ́ ẹ rẹ̀ ní ilé ìṣọ́ ti Susa,
3 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.
ní ọdún kẹta ìjọba rẹ̀, ó ṣe àsè fún gbogbo àwọn ọlọ́lá àti ìjòyè. Àwọn olórí ológun láti Persia àti Media, àwọn ọmọ-aládé, àti àwọn ọlọ́lá ìletò wà níbẹ̀ pẹ̀lú.
4 Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ. Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.
Ó ṣe àfihàn púpọ̀ ọrọ̀ ìjọba rẹ̀ àti dídán àti ògo ọláńlá rẹ̀ fún ọgọ́sàn-án ọjọ́ gbáko.
5 Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta.
Nígbà tí ọjọ́ wọ̀nyí kọjá, ọba ṣe àsè fún ọjọ́ méje, nínú ọgbà tí ó wà nínú àgbàlá ààfin ọba, gbogbo ènìyàn láti orí ẹni tí ó kéré dé orí ẹni tí ó lọ́lá jùlọ, tí wọ́n wà ní ilé ìṣọ́ ti Susa.
6 Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.
Ọgbà náà ní aṣọ fèrèsé funfun àti aláwọ̀ òféfèé. Àwọn okùn tí a fi aṣọ aláwọ̀ funfun àti aláwọ̀ elése àlùkò rán ni a fi ta á mọ́ òrùka fàdákà lára àwọn òpó mabu. Àwọn ibùsùn tí a fi wúrà àti fàdákà ṣe wà níbi pèpéle òkúta tí a fi ń tẹ́lẹ̀ ilé tí ó jẹ́ mabu, píálì àti òkúta olówó iyebíye mìíràn.
7 E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị.
Kọ́ọ̀bù wúrà onídìí-odó ni a fi ń bu wáìnì fún wọn mu, ọ̀kọ̀ọ̀kan wọn sì yàtọ̀ sí èkejì, wáìnì ọba pọ̀ púpọ̀, gẹ́gẹ́ bí ọba ṣe lawọ́ sí.
8 E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.
Gẹ́gẹ́ bí àṣẹ ọba a fi ààyè gba àlejò kọ̀ọ̀kan láti mu tó bí ó bá ti fẹ́, nítorí ọba ti pàṣẹ fún gbogbo àwọn ti ń bu wáìnì láti bù fún ẹnìkọ̀ọ̀kan bí wọ́n bá ṣe béèrè fún mọ.
9 Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.
Ayaba Faṣti náà ṣe àsè fún àwọn obìnrin ní ààfin ọba Ahaswerusi.
10 Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas,
Ní ọjọ́ keje, nígbà tí wáìnì mú inú ọba dùn, ó pàṣẹ fún Mehumani, Bista, Harbona, Bigta àti Abagta, Setari àti Karkasi, àwọn ìwẹ̀fà méje tí ń jíṣẹ́ fún Ahaswerusi.
11 sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma.
Kí wọn mú ayaba Faṣti wá síwájú rẹ̀, ti òun ti adé ọba rẹ̀, kí ó lè wá fi ẹwà rẹ̀ hàn àwọn ènìyàn àti àwọn ọlọ́lá, nítorí tí ó rẹwà.
12 Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
Ṣùgbọ́n nígbà tí àwọn ìránṣẹ́ jẹ́ iṣẹ́ ọba, ayaba Faṣti kọ̀ láti wá. Nígbà náà ni ọba bínú gidigidi, ìbínú náà sì pọ̀ jọjọ.
13 Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.
Gẹ́gẹ́ bí ìṣe rẹ̀ ní ìgbà gbogbo, ọba máa ń béèrè ọ̀rọ̀ lọ́wọ́ àwọn tí ó ní ìmọ̀ òfin àti ìdájọ́, ó sọ ọ́ fún àwọn amòye tí wọ́n mòye àkókò,
14 Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.
àwọn tí wọ́n súnmọ́ ọba àwọn wọ̀nyí ni Karṣina, Ṣetari, Admata, Tarṣiṣi, Meresi, Marsena àti Memukani, àwọn ọlọ́lá méje ti Persia àti Media tí wọ́n ṣe pàtàkì sí ọba, wọ́n sì tún wà ní ibi gíga ní ìjọba.
15 Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”
Ó béèrè pé, “Kí ni a lè ṣe sí ayaba Faṣti gẹ́gẹ́ bí òfin? Nítorí kò tẹríba fún àṣẹ ọba Ahaswerusi tí àwọn ìwẹ̀fà ọba sọ fún un.”
16 Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses.
Memukani sì dáhùn níwájú ọba àti àwọn ọlọ́lá pé, “Ayaba Faṣti ti ṣe búburú, kì í ṣe sí ọba nìkan ṣùgbọ́n sí gbogbo àwọn ọlọ́lá àti àwọn ènìyàn tí ó wà ní gbogbo agbègbè ilẹ̀ ọba Ahaswerusi.
17 Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’
Nítorí ìwà ayaba yìí yóò tàn dé ọ̀dọ̀ gbogbo àwọn obìnrin, tó bẹ́ẹ̀ tí ọkọ wọn yóò di gígàn lójú u wọn, wọn yóò sì sọ pé, ọba Ahaswerusi pàṣẹ pé kí á mú ayaba Faṣti wá síwájú òun, ṣùgbọ́n ó kọ̀ láti wá.
18 Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.
Ní ọjọ́ yìí gan an ni àwọn ọlọ́lá obìnrin Persia àti ti Media tí wọ́n ti gbọ́ nípa ìwà ayaba wọn yóò ṣe bẹ́ẹ̀ sí gbogbo àwọn ìjòyè ọba bákan náà. Àfojúdi àti àìnírẹ́pọ̀ tí kò lópin yóò wà.
19 “Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.
“Nítorí náà, bí ó bá tọ́ lójú ọba, jẹ́ kí ó gbé àṣẹ ọba jáde, kí ó sì jẹ́ kí ó wà ní àkọsílẹ̀ pẹ̀lú òfin Persia àti Media, èyí tí kò le é parẹ́, pé kí Faṣti kí ó má ṣe wá síwájú ọba Ahaswerusi. Kí ọba sì fi oyè ayaba rẹ̀ fún ẹlòmíràn tí ó sàn jù ú lọ.
20 Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”
Nígbà náà tí a bá kéde òfin tí ọba ṣe ká gbogbo ilẹ̀ ìjọba rẹ̀, gbogbo àwọn obìnrin ni yóò bọ̀wọ̀ fún ọkọ wọn, láti ọ̀dọ̀ ẹni tí ó kéré títí dé ọ̀dọ̀ ẹni ńlá.”
21 Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru.
Ìmọ̀ràn yìí sì tẹ́ ọba àti àwọn ìjòyè rẹ̀ lọ́rùn, nítorí náà ọba ṣe gẹ́gẹ́ bí Memukani ṣé sọ.
22 O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.
Ó kọ̀wé ránṣẹ́ sí igun mẹ́rẹ̀ẹ̀rin ilẹ̀ ọba rẹ̀, ó kọ̀wé sí ìgbèríko kọ̀ọ̀kan ní ìlànà bí wọ́n ṣe ń kọ̀wé, ó kọ̀wé sí àwọn ènìyàn kọ̀ọ̀kan ní èdè wọn, Ó tẹnumọ́ ní èdè oníkálùkù pé kí olúkúlùkù ọkùnrin máa ṣàkóso ilé rẹ̀.

< Esta 1 >