< Esta 1 >

1 Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa, nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.
This is what happened in the days of Xerxes, who reigned over 127 provinces from India to Cush.
2 Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa.
In those days King Xerxes sat on his royal throne in the citadel of Susa.
3 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.
In the third year of his reign, Xerxes held a feast for all his officials and servants. The military leaders of Persia and Media were there, along with the nobles and princes of the provinces.
4 Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ. Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.
And for a full 180 days he displayed the glorious riches of his kingdom and the magnificent splendor of his greatness.
5 Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta.
At the end of this time, in the garden court of the royal palace, the king held a seven-day feast for all the people in the citadel of Susa, from the least to the greatest.
6 Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.
Hangings of white and blue linen were fastened with cords of fine white and purple material to silver rings on the marble pillars. Gold and silver couches were arranged on a mosaic pavement of porphyry, marble, mother-of-pearl, and other costly stones.
7 E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị.
Beverages were served in an array of goblets of gold, each with a different design, and the royal wine flowed freely, according to the king’s bounty.
8 E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.
By order of the king, no limit was placed on the drinking, and every official of his household was to serve each man whatever he desired.
9 Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.
Queen Vashti also gave a banquet for the women in the royal palace of King Xerxes.
10 Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas,
On the seventh day, when the king’s heart was merry with wine, he ordered the seven eunuchs who served him—Mehuman, Biztha, Harbona, Bigtha, Abagtha, Zethar, and Carkas—
11 sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma.
to bring Queen Vashti before him, wearing her royal crown, to display her beauty to the people and officials. For she was beautiful to behold.
12 Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
Queen Vashti, however, refused to come at the king’s command brought by his eunuchs. And the king became furious, and his anger burned within him.
13 Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.
Then the king consulted the wise men who knew the times, for it was customary for him to confer with the experts in law and justice.
14 Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.
His closest advisors were Carshena, Shethar, Admatha, Tarshish, Meres, Marsena, and Memucan, the seven princes of Persia and Media who had personal access to the king and ranked highest in the kingdom.
15 Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”
“According to law,” he asked, “what should be done with Queen Vashti, since she refused to obey the command of King Xerxes delivered by the eunuchs?”
16 Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses.
And in the presence of the king and his princes, Memucan replied, “Queen Vashti has wronged not only the king, but all the princes and the peoples in all the provinces of King Xerxes.
17 Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’
For the conduct of the queen will become known to all women, causing them to despise their husbands and say, ‘King Xerxes ordered Queen Vashti to be brought before him, but she did not come.’
18 Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.
This very day the noble women of Persia and Media who have heard about the queen’s conduct will say the same thing to all the king’s officials, resulting in much contempt and wrath.
19 “Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.
So if it pleases the king, let him issue a royal decree, and let it be recorded in the laws of Persia and Media so that it cannot be repealed, that Vashti shall never again enter the presence of King Xerxes, and that her royal position shall be given to a woman better than she.
20 Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”
The edict the king issues will be heard throughout his vast kingdom—and so all women, from the least to the greatest, will honor their husbands.”
21 Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru.
The king and his princes were pleased with this counsel; so the king did as Memucan had advised.
22 O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.
He sent letters to all the provinces of the kingdom, to each province in its own script and to each people in their own language, proclaiming that every man should be master of his own household.

< Esta 1 >