< Esta 9 >
1 Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Ada, bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị Juu lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị Juu asị.
I KA malama umikumamalua, oia hoi ka malama o Adara, i ka la umikumamakolu, i ka wa kokoke e hookoia'i ka olelo a me ke kanawai o ke alii, i ka la i manao ai na enemi o na Iudaio e lanakila maluna o lakou; ua hoololiia nae, a lanakila na Iudaio maluna o ka poe i inaina mai ia lakou;
2 Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche.
Hoakoakoa'e la na Iudaio maloko o ko lakou mau kulanakauhale ma na mokuna a pau o ke alii o Ahasuero, e kau ka lima maluna o na mea i imi e hoopoino ia lakou. Aole kanaka i hiki ke ku imua o lakou, no ka mea, kau ae la ka makau ia lakou maluna o na kanaka a pau.
3 Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai.
A o na'lii a pau o na aina, a me na kiaaina, a me na'lii aimoku, a me na mea hana i ka hana a ke alii, kokua no lakou i na Iudaio; no ka mea, kau ae la ka makau ia Moredekai maluna o lakou.
4 Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile.
No ka mea, ua kiekie o Moredekai maloko o ka hale o ke alii, a kaulana aku la ia ma na aina a pau. No ka mea, o ua kanaka la o Moredekai hoi, nui ka mahuahua ana o kona kiekie.
5 Nke a mere, na ndị Juu ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha.
A luku aku la na Iudaio i ko lakou poe enemi a pau, i ka hahau ana o ka pahikaua, a me ka pepehi, a me ka luku aku, a hana aku no hoi i ka poe inaina mai ia lakou mamuli o ko lakou makemake.
6 Nʼime obodo ahụ e wusiri ike bụ Susa, ndị Juu gburu narị ndị ikom ise laa ha nʼiyi.
A ma Susana, ma ka pakaua, luku aku la na Iudaio me ka pepehi aku, i elima haneri kanaka.
7 Ha gbukwara Pashandata, Dalfon, Aspata,
A o Paresanedata, a me Dalepona, a me Asepata,
8 Porata, Adalia, Aridata,
A o Porata, a me Adalia a me Aridata,
9 Pamashta, Arisai Aridai na Vaizata,
A o Paremaseta, a me Arisai, a me Aridai, a me Vaiezata,
10 ha bụkwa ụmụ ndị ikom iri Heman nwa Hamedata, onye iro ndị Juu mụtara. Ma ha emetụghị akụnụba ha aka.
O na keikikane he umi a Hamana ke keiki a Hamedata, ka enemi o na Iudaio, ka lakou i luku ai; aka, aole i kau lakou i ko lakou mau lima maluna o ka waiwai pio.
11 Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo Susa.
Ia la, laweia mai i ke alii ka heluna o ka poe i lukuia ma Susana, ma ka pakaua.
12 Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.”
I mai la ke alii ia Esetera, i ke alii wahine, Ua pepehi na Iudaio, me ka luku aku i elima haneri kanaka ma Susana ka pakaua nei, a me na keiki he umi a Hamana. Heaha hoi ka lakou i hana'i ma na aina e o ke alii? Heaha kau mea e nonoi mai ai? E haawiia no ia ia oe. Heaha hoi kau kauoha? E hanain no ia.
13 Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.”
Alaila, i aku la o Esetera, Ina i lealea ke alii, e haawiia mai na na Iudaio ma Susana nei, e hana i ka la apopo, e like me ke kanawai o neia la, a e liia na keiki he umi a Humana ma ke olokea.
14 Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi.
Kauoha ae ke alii e hanaia pela; a ma Susana ke kau ana o ia kanawai; a li iho la lakou i na keiki he umi a Hamana.
15 Ndị Juu bi na Susa chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ada, gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo Susa. Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka.
Hoakoakoa hou ae la na Iudaio ma Susana, i ka la umikumamaha o ka malama o Adara, a luku aku la i na kanaka ma Susana, i ekolu haneri; aka, aole lakou i kau i ko lakou lima ma ka waiwai pio.
16 Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka.
A o ka poe Iudaio e, ma na mokuna o ke alii, hoakoakoa lakou, a malama hoi i ko lakou ola, a maha lakou i ko lakou poe enemi, a luku ae la no hoi i kanahikukumamalima tausani o ka poe i inaina mai ia lakou. Aka, aole lakou i kau i ko lakou lima ma ka waiwai pio.
17 E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada, ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
I ka la umikumamakolu o ka malama o Adara, a i ka la umikumamaha, hoomaha lakou, a hoolilo ia la, i la ahaaina, a i la olioli.
18 Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
Aka, o na Iudaio ma Susana, hoakoakoa lakou ma ka la umikumamakolu o ia malama, a ma ka la umikumamaha; a i ka la umikumamalima hoomaha lakou, a hoolilo ia la i la ahaaina, a i la olioli.
19 Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye.
No ia mea, o na Iudaio ma na papu, ka poe i noho maloko o na kulanakauhale paa ole i ka pa, hoolilo lakou i ka la umikumamaha o ka malama o Adara i la olioli, a i la ahaaina, a i la maikai, a i la haawi wale i ka ai i kekahi i kekahi.
20 Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,
Kakau iho la o Moredekai i keia mau mea, a hoouna ae la i na palapaia i na Iudaio a pau, ma na aina a pau o ke alii, o Ahasuero, ma kahi kokoke, a ma kahi loihi aku,
21 ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla.
E hoomau iwaena o lakou ka malama ana i ka la umikumamaha o ka malama o Adara, a me ka la umikumamalima, i kela makahiki i keia makahiki,
22 Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche.
I na la hoi i hoomahaia'i na Iudaio i ko lakou poe enemi, i ka malama hoi i hoololiia no lakou, mai ke kaumaha i ka olioli, a mai ke kanikau ana i ka hauoli, i hoolilo lakou ia mau la i la ahaaina, a i la olioli, a i la haawi wale i ka ai i kekahi i kekahi, a me ka manawalea aku i ka poe ilihune.
23 Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya,
Hoao na Iudaio e hana e like me ka lakou i hoomaka ai, a e like hoi me ka Moredekai i palapala aka ai ia lakou.
24 nʼihi na Heman nwa Hamedata, onye Agag, onye iro ndị Juu niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza.
No ka mea, o Hamana, ke keiki a Hamedata ke Agaga, ka enemi o na Iudaio a pau, ua imi hala mea ku e i na Iudaio e make ai lakou, a ua hoolei pura, oia hoi ka hailona, i mea e pepehi ai, a e luku ai hoi ia lakou;
25 Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi.
A hele aku la o Esetera imua i ke alo o ke alii, kauoha ae la ia ma na palapala, e hoihoiia maluna o kona poo iho ka manao hewa ana i manao ai i na Iudaio, a e liia hoi oia a me kana mau keikikane maluna o ke olokea.
26 Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ Purim nke sitere na mkpụrụ okwu Pur. Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha.
Nolaila lakou i kapa ai ia mau la, o Purima, mamuli o ka inoa o Pura. Nolaila, no na huaolelo a pau iloko o ia palapala, a no na mea a lakou i ike ai o ia mau mea, a no na mea i hiki mai ai maluna o lakou,
27 Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ.
Kau no na Iudaio i kanawai, a hoopaa hoi no lakou, a no ka lakou poe keiki, a no ka poe a pau i hai pa me lakou, i mea e haule ole ai, e malama lakou ia mau la elua, e like me ka palapala, a me ka manawa, i kela makahiki, i keia makahiki,
28 Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile.
I hoomanaoia'i ia mau la, i malamaia hoi i na hanauna a pau, e na ohana a pau ma na aina a pau, a ma na kulanakauhale a pau; i haule ole keia mau la Purima iwaena o na Iudaio, i ole hoi e pau ka hoomanao ana o ka lakou mamo i ua mau la la.
29 Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa Abihail, na Mọdekai onye Juu jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme Purim.
Alaila, o Esetera, ke alii wahine, ke kaikamahine a Abihaila, a me Moredekai, ka Iudaio, palapala ikaika aku laua e hoopaa i Keia plapala lua o ka Purima.
30 Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu dị nʼime ya, nye ndị Juu niile bi nʼime mpaghara alaeze Sekses, nke dị otu narị na iri abụọ na asaa.
A hoouna ae la oia i na palapala, i na Iudaio a pau, i na aina he haneri me ka iwakaluakumamahiku o ke aupuni o Ahasuero, me na olelo aloha, a me ka oiaio,
31 E ji akwụkwọ a mesie okwu ahụ ike na a ga-edebe ụbọchị ndị ahụ kwa afọ maka mmemme Purim dịka Mọdekai onye Juu na Esta nwunye eze nyere nʼiwu. Ndị Juu niile na ụmụ ụmụ ha ga-eme mmemme a nʼoge a kara aka, dịka ha si edebe iwu ndị ọzọ metụtara oge ibu ọnụ na oge iru ụjụ.
E hoopaa ia mau la Purima, i ko lakou manawa pono e like me ka Moredekai, ka ka Iudaio, a me ka Esetera, ka ke alii wahine i kauoha ai ia lakou, a e like hoi me ka lakou i hooholo ai no lakou iho, a no na keiki me na mamo a lakou, i na mea hoi o ka hookeai ana, a me ka uwe ana.
32 Iwu a Esta nyere mesịrị ụkpụrụ mmemme Purim ike. E dekwara ya nʼakwụkwọ.
Na ke kanawai o Esetera i hoopaa keia mau mea o ka Purima; a kakauia iho la no hoi ia iloko o ka buke.