< Esta 7 >

1 Eze na Heman gara iri oriri ahụ Esta nwunye eze kpọrọ ha,
Kwa hiyo mfalme na Hamani wakaenda kausherekea na malkia Esta.
2 mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, “Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka ị chọrọ? Ihe ọbụla ọ bụ, aga m enye gị ya, ọ bụladị otu ọkara alaeze m.”
Katika siku ya pili, baada ya kuletwa mvinyo, mfalme akamwambia Esta, “Ni nini haja ya moyo wako? Na nini ombi lako? Hata nusu ya ufalme wangu utapewa.”
3 Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m.
Kisha Malkia amwambia mfalme, kama nimepata kibali machoni pako, na kama ikikupendeza, nipewe maisha yangu, na hili ndio haja ya moyo wangu, na hili pia ni ombi kwa watu wangu pia.
4 Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze.”
Kwa kuwa mimi na watu wangu tumeuzwa, ili tuharibiwe, tuuwawe, na tungamizwe. Kama tungeuzwa utumwani, kama wanaume na wanawake, ningenyamaza kimya, na nisingeweza kumsumbua mfame.”
5 Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, “Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe ọ nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?”
Kisha Mfalme Ahusiero akamwambia malkia Esta, “Ni nani huyo? Ni nani aliyekusudia moyoni mwake kutenda jambo hili?
6 Esta zara, “Ọ bụ onye iro na onye mmegide. Ọ bụ Heman, nwoke ọjọọ a!” Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze.
Esta akasema, “Ni huyu mwovu Hamani, adui!” Hamani akashikwa na Hofu mbele za mfalme na malkia.
7 Eze biliri ọtọ nʼiwe, hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi.
Na kwa ghadhabu mfalme akatoka karamuni katika sehemu ya mvinyo na akaenda katika bustani ya ikulu, Lakini Hamani alibaki akimsihi Malkia Esta ili aokoe maisha yake. Kwa sababu aliona mfalme amemkusudia ubaya.
8 Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya. Eze sịrị, “Ọ chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?” Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.
Mfalme akarudi kutoka katika bustani ya ikulu, na kuingia katika chumba ambamo kulikuwamo mvinyo. Hamani alikuwa ameanguka chini ya kochi alilokuwa ameketi Esta. Mfalme akakasirika na kusema, “atamdharirisha malkia mbele zangu katika nyumba yangu?” Mara tu maneno haya yalipotoka kinywani mwa mfalme, watumizhi wakafunika uso wa Hamani.
9 Mgbe ahụ kwa, Habona otu nʼime ndị ozi eze gwara eze sị, “Onyenwe m, lee na Heman enyela iwu ka a kwadoo osisi nke ịdị elu ya bụ iri mita abụọ na atọ, ebe ọ chọrọrị ịnọ kwụgbuo Mọdekai, nwoke ahụ mere ka a ghara igbu eze. Osisi ahụ guzokwa ugbu a nʼihu ụlọ Heman.” Eze sịrị, “Kwụgbuonụ ya nʼosisi ahụ!”
Kisha Habona, mmoja wa watumishi aliye mtumikia mfalme akamwambia mfalme, “Mti wenye urefu wa futi hamsini uko nyumbani kwa Hamani. Ulikuwa umeandaliwa kwa ajili ya Modekai, aliye toa taarifa kuhusu mpango wa kuangamizwa kwako.” Mfalme akesema,”Mtundikeni Hamani juu yake.”
10 Ya mere, ha kwụgburu Heman nʼosisi ahụ ọ kwadoro maka Mọdekai. Iwe eze dajụkwara.
Kwa hiyo wakamtundika Hamani kwenye mti aliuandaa kwa ajili ya Modekai. Na hasira ya mfalme ikatulia.

< Esta 7 >