< Esta 6 >

1 Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya.
Cette nuit-là, le roi ne pouvait pas dormir. Il ordonna qu'on apporte le livre des chroniques, et on les lut au roi.
2 Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses.
On y trouva écrit que Mardochée avait raconté que Bigthana et Teresh, deux des eunuques du roi, qui étaient portiers, avaient essayé de porter la main sur le roi Assuérus.
3 Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!”
Le roi dit: « Quel honneur et quelle dignité a-t-on donné à Mardochée pour cela? » Les serviteurs du roi qui l'assistaient dirent: « On n'a rien fait pour lui. »
4 Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya.
Le roi dit: « Qui est dans la cour? » Haman était entré dans la cour extérieure de la maison du roi, pour parler au roi de faire pendre Mardochée à la potence qu'il avait préparée pour lui.
5 Ndị na-ejere ya ozi zara, “Heman na-eguzo nʼogige.” Eze sịrị, “Kpọbata ya.”
Les serviteurs du roi lui dirent: « Voici Haman qui se tient dans la cour. » Le roi dit: « Qu'il entre. »
6 Mgbe Heman batara, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ugwu m kwesiri inye onye mere ihe na-atọ m ụtọ?” Heman chere nʼime onwe ya sị, “Oleekwanụ onye ọzọ eze ga-achọ inye ugwu karịa mụ onwe m?”
Haman entra donc. Le roi lui dit: « Que fera-t-on à l'homme que le roi se plaît à honorer? » Haman disait en son for intérieur: « Qui le roi prendrait-il plaisir à honorer plus que moi? ».
7 Ya mere ọ zara eze, “Banyere nwoke ahụ ọ masịrị eze ịkwanyere ugwu,
Haman dit au roi: « Pour l'homme que le roi veut honorer,
8 nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya.
que l'on apporte les vêtements royaux dont le roi se sert pour se vêtir, et le cheval que le roi monte et sur la tête duquel est posée une couronne royale.
9 Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’”
Que les vêtements et le cheval soient remis à l'un des princes les plus nobles du roi, afin qu'il en revête l'homme que le roi veut honorer, qu'il le fasse monter à cheval sur la place de la ville et qu'il proclame devant lui: « C'est ainsi qu'il sera fait à l'homme que le roi veut honorer ».
10 Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.”
Alors le roi dit à Haman: « Dépêche-toi de prendre les vêtements et le cheval, comme tu l'as dit, et fais-le pour Mardochée, le Juif, qui est assis à la porte du roi. Que rien ne manque à tout ce que tu as dit. »
11 Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”
Alors Haman prit les vêtements et le cheval, habilla Mardochée, le fit monter sur la place de la ville et proclama devant lui: « C'est ainsi qu'il sera fait à l'homme que le roi se plaît à honorer! »
12 Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ,
Mardochée revint à la porte du roi, mais Haman se précipita dans sa maison, en deuil et la tête couverte.
13 ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya. Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.”
Haman raconta à Zéresh, sa femme, et à tous ses amis tout ce qui lui était arrivé. Ses sages et Zéresh, sa femme, lui dirent alors: « Si Mardochée, devant lequel tu as commencé à tomber, est d'origine juive, tu ne prévaudras pas contre lui, mais tu tomberas certainement devant lui. »
14 Mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, ndị onozi eze bịaruru duru Heman ngwangwa maka ịga nʼoriri ahụ Esta kwadoro.
Pendant qu'ils discutaient encore avec lui, les eunuques du roi arrivèrent et s'empressèrent d'amener Haman au banquet qu'Esther avait préparé.

< Esta 6 >