< Esta 5 >

1 Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ.
After three days, Esther put on her royal clothes and went to stand in the courtyard of the king's palace, in front of the king's house. The king was sitting on his royal throne in the royal house, facing the entrance to the house.
2 Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka.
When the king saw Esther the queen standing in the courtyard, she received approval in his eyes. He held out to her the golden scepter in his hand. So Esther approached and touched the tip of the scepter.
3 Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.”
Then the king said to her, “What do you want, Queen Esther? What is your request? Up to half of my kingdom, it will be given to you.”
4 Esta zara sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, achọrọ m ka gị na Heman bịa rie oriri m kwadooro unu taa.”
Esther said, “If it pleases the king, let the king and Haman come today to a feast that I have prepared for him.”
5 Eze tụgharịrị gwa ndị ozi ya sị, “Gwanụ Heman ka o mee ngwangwa bịa ka anyị gaa mee ihe Esta rịọrọ.” Emesịa, eze na Heman bịara nʼoriri Esta.
Then the king said, “Bring Haman quickly, to do what Esther has said.” So the king and Haman went to the feast that Esther had prepared.
6 Mgbe ha na-aṅụ mmanya, eze sịrị Esta, “Ugbu a, gwa m ihe ị chọrọ, aga m enye gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ otu ọkara alaeze m.”
When the wine was being served at the feast, the king said to Esther, “What is your petition? It will be granted you. What is your request? Up to half of the kingdom, it will be granted.”
7 Esta zara sị, “Arịrịọ m na mkpa m bụ nke a,
Esther answered, “My petition and my request is this,
8 ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu eze nʼezie, ọ bụrụkwa na ọ masịrị eze imere m ihe m na-arịọ, na ime ihe m na-achọ, ka ya na Heman sorokwa bịa echi nʼoriri ọzọ m ga-akwado. Echi ka m ga-akọkwara gị ihe niile.”
if I have found favor in the eyes of the king and if it pleases the king to grant my petition and to honor my request, let the king and Haman come to the feast that I will prepare for you tomorrow and I will answer the king's question.”
9 Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu.
Haman went out that day joyful and glad at heart. But when Haman saw Mordecai at the king's gate, that Mordecai neither rose up nor trembled before him with any fear, he was filled with rage against Mordecai.
10 Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya. Ọ kpọkọtara ndị enyi ya niile na Zeresh, nwunye ya,
Nevertheless, Haman restrained himself and went to his own house. He sent for his friends and gathered them together, with Zeresh his wife.
11 ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile.
Haman recounted to them the splendor of his riches, the number of his many sons, all the promotions by which the king honored him, and how he had advanced above all the officials and the servants of the king.
12 Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.
Haman said, “Queen Esther invited no one else but me to come with the king to the feast she prepared. Even tomorrow I am again invited by her along with the king.
13 Ma ihe ndị a niile bụ ihe efu mgbe ọbụla m na-ahụ Mọdekai onye Juu ahụ ka ọ na-anọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze.”
But all this is worth nothing to me as long as I see Mordecai the Jew sitting at the king's gate.”
14 Mgbe ahụ, Zeresh nwunye ya na ndị enyi ya niile, dụrụ ya ọdụ sị ya, “Ihe ị ga-eme bụ nke a: Kwadoo osisi e ji akwụgbu mmadụ, nke ịdị elu ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Nʼụtụtụ echi, rịọ eze ka o nye gị ike ịkwụgbu Mọdekai nʼelu ya. Mgbe e mere nke a, ọṅụ gị ga-ezukwa oke, mgbe ị ga-esorokwa eze gaa rie oriri a kpọrọ unu.” Okwu a masịrị Heman nke ukwuu. O nyere iwu ka a kwadoo osisi ahụ ngwangwa.
Then Zeresh his wife said to Haman and all his friends, “Let them make a gallows fifty cubits high. In the morning speak to the king for them to hang Mordecai on it. Then go joyfully with the king to the feast.” This pleased Haman and he had the gallows constructed.

< Esta 5 >