< Esta 4 >

1 Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa.
When Mordecai found out all that had happened, he tore his clothes and put on sackcloth and ashes, and walked through the city, crying and wailing in grief.
2 Ọ bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na ọ dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze.
He went as far as the palace gate, because no one was allowed to enter the palace gate wearing sackcloth.
3 Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ.
When the king's decree and orders reached all the different provinces the Jews began to mourn in terrible distress. They fasted, they wept, and they wailed; and many lay in sackcloth and ashes.
4 Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma ọ naraghị ha.
Esther's maids and eunuchs came and told her, and the queen was very upset. She sent clothes to him so he could take off his sackcloth, but he refused to accept them.
5 Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a.
She called Hathatch, one of the king's eunuchs assigned to attend her, and ordered him to go to Mordecai and find out what he was doing and why.
6 Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.
Hathatch went to Mordecai in the city square in front of the palace gate.
7 Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi.
Mordecai explained to him everything that had happened to him, including the exact amount of money that Haman had promised to pay the royal treasury for the destruction of the Jews.
8 O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya.
Mordecai also gave him a copy of the decree that had been issued in Susa for their destruction to show Esther and explain it to her, and asked him to instruct her to go to the king and appeal for mercy and plead before him for her people.
9 Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru.
Hathatch went back and told Esther what Mordecai had said.
10 Ma Esta gwara Hatak ka o jeghachi gwa Mọdekai sị,
Then Esther spoke with Hathatch and ordered him to deliver this message to Mordecai.
11 “Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m.”
“All the king's officials, and even the people in the provinces of the king's empire, know that any man or any woman who goes to the king, entering his inner court without being summoned, is sentenced to death—that is the king's one law—unless the king holds out his golden scepter to them so they can live. In my case, I have not been called to go to the king for thirty days.”
12 Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara,
When Mordecai was told what Esther said,
13 o zighachiri ọsịsa a, “Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile.
Mordecai sent a message back to Esther, saying, “Don't think that just because you live in the king's palace that your life is the only one that will be saved of all the Jews!
14 Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?”
If you stay silent right now, help and rescue will come to the Jews from some other place, and you and your relatives will die. Who knows—it could be you came to be queen for such a time as this!”
15 Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị;
Esther replied to Mordecai, saying,
16 “Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”
“Have all the Jews in Susa meet together and fast for me. Don't eat or drink anything for three days and nights. I and my girls will also fast. After that, I will go to the king, even though it's against the law, and if I die, I die.”
17 Mọdekai pụrụ, gaa mee dịka Esta gwara ya.
Mordecai went and did everything Esther had told him to do.

< Esta 4 >