< Esta 10 >

1 Eze bụ Ahasuerọs na-anakọta ụtụ site nʼaka ndị niile bi nʼalaeze ya tutu ruo nʼọnụ mmiri osimiri ebe alaeze ahụ sọtụrụ.
Le roi Assuérus imposa un tribut au pays et aux îles de la mer.
2 Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha.
Tous les faits concernant sa puissance et ses exploits, et les détails sur la grandeur à laquelle le roi éleva Mardochée, ne sont-ils pas écrits dans le livre des Chroniques des rois des Mèdes et des Perses?
3 Mọdekai, onye Juu, bụ onye na-esote eze Ahasuerọs nʼọkwa. Ọ bụ onye dị ukwuu nʼetiti ndị Juu, na onye ndị Juu ibe ya na-asọpụkwara, nʼihi na ọ na-elenye anya nʼihe gbasara udo ndị Juu. Ọ bụkwa onye na-ekwuchite ọnụ nʼihe banyere ọdịmma nke ndị Juu niile.
Car le Juif Mardochée était le premier après le roi Assuérus; considéré parmi les Juifs et aimé de la multitude de ses frères, il rechercha le bien de son peuple et parla pour le bonheur de toute sa race.

< Esta 10 >