< Ndị Efesọs 1 >
1 Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya:
因天主的旨意,做耶穌基督宗徒的保祿,致書給那些在 [厄弗所的 ] 聖徒和信仰基督耶穌的人。
2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
願恩寵與平安,由我們的天主和主耶穌基督,賜與你們!
3 Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst.
願我們的主耶穌基督的天主和父受讚美!祂在天上,在基督內,以各種屬神的祝福,祝福了我們,
4 Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya.
因為祂於創世以前,在基督內己揀選了我們,為使我們在祂面前,成為聖潔無瑕疵的;
5 O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime.
又由於愛,按照自己旨的決定,預定了我們藉著耶穌基督獲得義子的名分,而歸於祂,
6 Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
為頌揚祂恩寵的光榮,這恩寵是祂在自己的愛子內賜與我們的;
7 Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị,
我們就是全憑天主豐厚的恩寵,在祂的愛子內,藉祂愛子的血,獲得了救贖,罪過的赦免。
8 nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile.
的確,天主豐厚地把這恩寵傾注在我們身上,賜與我們各種智慧和明達,
9 O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst.
為使我們知道,祂旨意的奧祕,是全照祂在愛子內所定的計畫;
10 Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst.
就是依照祂的措施,當時期一滿,就使天上和地上的萬有,總歸於基督元苜。
11 Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya.
我們也是在基督內得作天主的產業,因為我們是由那位按照自己旨意的計畫施行萬事者,早預定了的,
12 Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya.
為使我們這些首先在默西亞內懷著希望的人,頌揚祂的光榮;
13 Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ.
在基督內,你們一聽到了真理的話,即你們得救的福音,便信從了,且在祂內受了恩許聖神的印證;
14 Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
這聖神就是我們得嗣業的保證,為使天主所置為嗣業的子民,蒙受完全的救贖,為頌揚祂的光榮。
15 Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ,
因此,我一聽見你們對主耶穌的信德和對眾聖徒的愛德,
16 esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile.
便不斷為你們感謝天主,在我的祈禱中紀念你們,
17 Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ,
為使我們的主耶穌基督的天主,即那光榮的父,把智慧和啟示的神恩,賜與你們,好使你們認識祂;
18 ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ.
並光照你們心靈的眼目,為叫你們認清祂的寵召什麼希望,在聖徒中祂嗣業的光榮,是怎樣豐厚;
19 Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị.
祂對我們虔信的人,所施展的強有力而見效的德能是怎樣的偉大。
20 Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe.
正如祂已將這德能施展在基督身上,使祂從死者中復活,叫祂在天上坐在自己右邊,
21 Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. (aiōn )
超乎一切率領者、掌權者、異能者、宰制者,以及一切現世及來世的可稱呼的名號以上; (aiōn )
22 O mere ka ihe niile dị nʼokpuru ya, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe niile nye nzukọ ya bụ chọọchị.
又將萬有置於祂的腳下,使祂教會內作至上的元首,
23 Nke bụ ahụ ya, ozuzu oke nke onye ahụ na-emejupụta ihe niile nʼụzọ niile.
這教會就是基督的身體,就是在一切內充滿一切者的圓滿。