< Ekiliziastis 8 >

1 Onye dị ka onye amamihe? Onye maara nkọwa ihe? Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe, na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee.
Who is like the wise man? And who knows the interpretation of a thing? A man's wisdom makes his face shine, and the hardness of his face is changed.
2 Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.
Keep the king's command, because of the oath to God.
3 Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.
Do not be hasty to go out of his presence. Do not persist in an evil thing, for he does whatever pleases him,
4 Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?
for the king's word is supreme. Who can say to him, "What are you doing?"
5 Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe.
Whoever keeps the commandment shall not come to harm, and his wise heart will know the time and procedure.
6 Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.
For there is a time and procedure for every purpose, although the misery of man is heavy on him.
7 Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime?
For he doesn't know that which will be; for who can tell him how it will be?
8 Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ. Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.
There is no man who has power over the spirit to contain the spirit; neither does he have power over the day of death. There is no discharge in war; neither shall wickedness deliver those who practice it.
9 Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.
All this have I seen, and applied my mind to every work that is done under the sun. There is a time in which one man has power over another to his hurt.
10 Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.
So I saw the wicked buried. Indeed they came also from the holy place. They went and were praised in the city where they did this. This also is vanity.
11 Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.
Because sentence against an evil work is not executed speedily, therefore the heart of the sons of men is fully set in them to do evil.
12 Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.
Though a sinner commits crimes a hundred times, and lives long, yet surely I know that it will be better with those who fear God, who are reverent before him.
13 Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo.
But it shall not be well with the wicked, neither shall he lengthen days like a shadow; because he doesn't fear God.
14 Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.
There is a vanity which is done on the earth, that there are righteous men to whom it happens according to the work of the wicked. Again, there are wicked men to whom it happens according to the work of the righteous. I said that this also is vanity.
15 Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.
Then I commended mirth, because a man has no better thing under the sun, than to eat, and to drink, and to be joyful: for that will accompany him in his labor all the days of his life which God has given him under the sun.
16 Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,
When I applied my heart to know wisdom, and to see the business that is done on the earth (for also there is that neither day nor night sees sleep with his eyes),
17 mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.
then I saw all the work of God, that man can't find out the work that is done under the sun, because however much a man labors to seek it out, yet he won't find it. Yes even though a wise man thinks he can comprehend it, he won't be able to find it.

< Ekiliziastis 8 >