< Ekiliziastis 7 >

1 Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ. Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.
A good name is better than good oil; and the day of death than the day of birth.
2 Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ karịa ebe a na-eri na-aṅụ. Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla; ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.
[It is] better to go to the house of mourning, than to go to the banquet house: since this is the end of every man; and the living man will apply good [warning] to his heart.
3 Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma, ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
Sorrow is better than laughter: for by the sadness of the countenance the heart will be made better.
4 Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ, ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.
The heart of the wise is in the house of mourning; but the heart of fools is in the house of mirth.
5 Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.
[It is] better to hear a reproof of a wise man, than for a man to hear the song of fools.
6 Ọchị onye nzuzu dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite. Ihe a bụkwa ihe efu.
As the sound of thorns under a caldron, so is the laughter of fools: this is also vanity.
7 Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu, iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
for oppression makes a wise man mad, and destroys his noble heart.
8 Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya! Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
The end of a matter is better than the beginning thereof: the patient is better than the high-minded.
9 Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
Be not hasty in your spirit to be angry: for anger will rest in the bosom of fools.
10 Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?” Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
Say not, What has happened, that the former days were better than these? for you do not enquire in wisdom concerning this.
11 Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma. Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.
Wisdom is good with an inheritance: and [there is] an advantage [by it] to them that see the sun.
12 Amamihe bụ ndo dịka ego si bụrụkwa ndo, ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a: Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
For wisdom in its shadow is as the shadow of silver: and the excellence of the knowledge of wisdom will give life to him that has it.
13 Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme. Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie, bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
Behold the works of God: for who shall be able to straighten him whom God has made crooked?
14 Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya.
In the day of prosperity live joyfully, and consider in the day of adversity: consider, [I say], God also has caused the one to agree with the other for [this] reason, that man should find nothing after him.
15 Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a; onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya, ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
I have seen all things in the days of my vanity: there is a just man perishing in his justice, and there is an ungodly man remaining in his wickedness.
16 Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke, emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke. Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
Be not very just; neither be very wise: lest you be confounded.
17 Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke, abụkwala onye nzuzu! Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?
Be not very wicked; and be not stubborn: lest you should die before your time.
18 Ọ dị mma ijide otu na-esepụghị aka na nke ọzọ, onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.
It is well for you to hold fast by this; also by this defile not your hand: for to them that fear God all things shall come forth [well].
19 Amamihe na-eme ka otu onye dị ike karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.
Wisdom will help the wise man more than ten mighty men which are in the city.
20 Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
For there is not a righteous man in the earth, who will do good, and not sin
21 Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu, ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
Also take no heed to all the words which ungodly men shall speak; lest you hear your servant cursing you.
22 Gị onwe gị maara na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
For many times he shall trespass against you, and repeatedly shall he afflict your heart; for thus also have you cursed others.
23 Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị, “Aga m abụ onye amamihe,” ma nke a karịrị m.
All these things have I proved in wisdom: I said, I will be wise; but it was far from me.
24 Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu; ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?
[That which is] far beyond what was, and a great depth, who shall find it out?
25 A tụgharịrị uche m ka m ghọta, iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
I and my heart went round about to know, and to examine, and to seek wisdom, and the account [of things], and to know the folly and trouble and madness of the ungodly man.
26 Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.
And I find her [to be], and I will pronounce [to be] more bitter than death the woman which is a snare, and her heart nets, [who has] a band in her hands: [he that is] good in the sight of God shall be delivered from her; but the sinner shall be caught by her.
27 “Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru: “Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
Behold, this have I found, said the Preacher, [seeking] by one at a time to find out the account,
28 Mgbe m ka na-achọ ma achọtaghị m, nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha, ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.
which my soul sought after, but I found not: for I have found one man of a thousand; but a woman in all these I have not found.
29 Achọpụtara m naanị nke a, Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi, ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”
But, behold, this have I found, that God made man upright; but they have sought out many devices.

< Ekiliziastis 7 >