< Ekiliziastis 6 >
1 Ọ dị ihe ọjọọ ọzọ nke m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, nke na-anyịdo ụmụ mmadụ.
Mo ti rí ibi mìíràn lábẹ́ oòrùn.
2 Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.
Ọlọ́run fún ọkùnrin kan ní ọrọ̀, ọlá àti ọlà kí ó má ba à ṣe aláìní ohunkóhun tí ọkàn rẹ̀ ń fẹ́. Ṣùgbọ́n, Ọlọ́run kò fún un ní àǹfààní láti gbádùn wọn, dípò èyí, àlejò ni ó ń gbádùn wọn. Asán ni èyí, ààrùn búburú gbá à ni.
3 Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọ dị mma karịa ya.
Ọkùnrin kan le è ní ọgọ́rùn-ún ọmọ kí ó sì wà láààyè fún ọ̀pọ̀lọpọ̀ ọdún, síbẹ̀ kò sí bí ó ti le wà láààyè pẹ́ tó, bí kò bá le è gbádùn ohun ìní rẹ̀ kí ó sì gba ìsìnkú tí ó tọ́, mo sọ wí pé ọlẹ̀ ọmọ tí a sin sàn jù ú lọ.
4 Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya.
Ó wà láìní ìtumọ̀, ó lọ nínú òkùnkùn, nínú òkùnkùn sì ni orúkọ rẹ̀ fi ara pamọ́ sí.
5 Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ.
Bí ó ti jẹ́ wí pé kò rí oòrùn tàbí mọ ohunkóhun, ó ní ọ̀pọ̀ ìsinmi ju ti ọkùnrin náà lọ.
6 A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?
Kódà, bí ó wà láààyè fún ẹgbẹ̀rún ọdún méjì yípo ṣùgbọ́n tí ó kùnà láti gbádùn ohun ìní rẹ̀. Kì í ṣe ibìkan ni gbogbo wọn ń lọ?
7 Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ, ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.
Gbogbo wàhálà tí ènìyàn ń ṣe nítorí àtijẹ ni síbẹ̀ ikùn rẹ̀ kò yó rí.
8 Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu? Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?
Kí ni àǹfààní tí ọlọ́gbọ́n ènìyàn ní lórí aṣiwèrè? Kí ni èrè tálákà ènìyàn nípa mímọ bí yóò ṣe hùwà níwájú àwọn tókù?
9 Ihe eji anya hụ ka mma karịa oke ọchịchọ! Nke a bụkwa ihe efu na ịchụso ifufe.
Ohun tí ojú rí sàn ju ìfẹnuwákiri lọ. Asán ni eléyìí pẹ̀lú ó dàbí ẹni ń gbìyànjú àti mú afẹ́fẹ́.
10 Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga. Amakwaara ihe mmadụ bụ, mmadụ ọbụla apụghị ịlụso onye ka ya ike ọgụ.
Ohunkóhun tí ó bá ti wà ti ní orúkọ, ohun tí ènìyàn jẹ́ sì ti di mí mọ̀; kò sí ènìyàn tí ó le è ja ìjàkadì pẹ̀lú ẹni tí ó lágbára jù ú lọ.
11 Okwu na-aba ụba, nghọta na-adị nta. O nwere uru nke a bara?
Ọ̀rọ̀ púpọ̀, kì í ní ìtumọ̀ èrè wo ni ènìyàn ń rí nínú rẹ̀?
12 Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?
Àbí, ta ni ó mọ ohun tí ó dára fún ènìyàn ní ayé fún ọjọ́ ayé kúkúrú àti asán tí ó ń là kọjá gẹ́gẹ́ bí òjìji? Ta ni ó le è sọ fún mi, ohun tí yóò ṣẹlẹ̀ lábẹ́ oòrùn lẹ́yìn tí ó bá lọ tán? Kò sí!