< Ekiliziastis 4 >

1 Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.
Ndinayangʼananso ndi kuona chipsinjo chimene chimachitika pansi pano: ndinaona misozi ya anthu opsinjika, ndipo iwo alibe owatonthoza; mphamvu zinali ndi anthu owapsinjawo ndipo iwonso analibe owatonthoza.
2 Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ, bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga, ka ndị dị ndụ mma, bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a.
Ndipo ndinanena kuti akufa, amene anafa kale, ndi osangalala kuposa amoyo, amene akanalibe ndi moyo.
3 Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ.
Koma wopambana onsewa ndi amene sanabadwe, amene sanaone zoyipa zimene chimachitika pansi pano.
4 Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.
Ndipo ndinazindikira kuti ntchito zonse zolemetsa ndiponso ntchito zonse zaluso zimachitika chifukwa choti wina akuchitira nsanje mnzake. Izinso ndi zopandapake, nʼkungodzivuta chabe.
5 Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
Chitsiru chimangoti manja ake lobodo ndi kudzipha chokha ndi njala.
6 Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.
Nʼkwabwino kukhala ndi dzanja limodzi lodzaza uli pa mtendere, kuposa kukhala ndi manja awiri odzaza uli pa mavuto, ndipo uku nʼkungodzivuta chabe.
7 Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.
Ndinaonanso chinthu china chopanda phindu pansi pano:
8 Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.
Panali munthu amene anali yekhayekha; analibe mwana kapena mʼbale. Ntchito yake yolemetsa sinkatha, ndipo maso ake sankakhutitsidwa ndi chuma chake. Iye anadzifunsa kuti, “Kodi ntchito yosautsayi ndikuyigwirira yani? Nanga nʼchifukwa chiyani ndikudzimana chisangalalo?” Izinso ndi zopandapake, zosasangalatsa!
9 Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
Kukhala awiri nʼkwabwino kuposa kukhala wekha, chifukwa ntchito ya anthu awiri ili ndi phindu:
10 Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
Ngati winayo agwa, mnzakeyo adzamudzutsa. Koma tsoka kwa munthu amene agwa ndipo alibe wina woti amudzutse!
11 Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
Komanso ngati anthu awiri agona malo amodzi, adzafunditsana. Koma nanga mmodzi angadzifunditse yekha?
12 Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
Munthu mmodzi angathe kugonjetsedwa, koma anthu awiri akhoza kudziteteza. Chingwe cha maulusi atatu sichidukirapo.
13 Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.
Wachinyamata wosauka koma wanzeru aposa mfumu yokalamba koma yopusa imene simvanso malangizo.
14 Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.
Wachinyamatayo angathe kuchokera ku ndende ndi kudzakhala mfumu, kapena angathe kubadwa wosauka mʼdziko la mfumuyo.
15 Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.
Ndipo ndinaona kuti iwo onse amene anakhala ndi moyo ndi kuyenda pansi pano anatsatira wachinyamatayo, amene anatenga malo a mfumu.
16 A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.
Mfumu ikhoza kulamulira anthu osawerengeka, komabe itamwalira, palibe amene adzayamikire zomwe mfumuyo inachita. Izinso ndi zopandapake, nʼkungozivuta chabe.

< Ekiliziastis 4 >