< Ekiliziastis 3 >
1 Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
Kuna wakati kwa ajili ya kila jambo, nayo majira kwa kila tendo chini ya mbingu:
2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,
wakati wa kuzaliwa na wakati wa kufa, wakati wa kupanda na wakati wa kungʼoa yaliyopandwa,
3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
wakati wa kuua na wakati wa kuponya, wakati wa kubomoa, na wakati wa kujenga,
4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,
wakati wa kulia na wakati wa kucheka, wakati wa kuomboleza na wakati wa kucheza,
5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
wakati wa kutawanya mawe na wakati wa kukusanya mawe, wakati wa kukumbatia na wakati wa kutokumbatia,
6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
wakati wa kutafuta na wakati wa kupoteza, wakati wa kuweka na wakati wa kutupa,
7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
wakati wa kurarua na wakati wa kushona, wakati wa kunyamaza na wakati wa kuzungumza,
8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.
wakati wa kupenda na wakati wa kuchukia, wakati wa vita na wakati wa amani.
9 Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
Mfanyakazi anapata faida gani kutokana na taabu yake?
10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
Nimeona mzigo Mungu alioweka juu ya wanadamu.
11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.
Amefanya kila kitu kiwe kizuri kwa wakati wake. Pia ameiweka hiyo milele katika mioyo ya wanadamu, wala hawawezi kutambua kwa kina yale ambayo Mungu amefanya tangu mwanzo hadi mwisho.
12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
Ninajua kwamba hakuna kitu bora kwa wanadamu kuliko kuwa na furaha na kutenda mema wakati wanapoishi.
13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
Tena ni karama ya Mungu kila mtu apate kula na kunywa na kujiburudisha kwa mema katika kazi yake yote.
14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.
Ninajua kwamba kila kitu anachokifanya Mungu kitadumu milele, hakuna kinachoweza kuongezwa au kupunguzwa. Mungu hufanya hivyo ili watu wamche yeye.
15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
Chochote kilichopo kilishakuwepo, na kitakachokuwepo kimekwishakuwepo kabla; naye Mungu huyaita yale yaliyopita yarudi tena.
16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
Pia nikaona kitu kingine tena chini ya jua: Mahali pa kutolea hukumu, uovu ulikuwepo, mahali pa kupatia haki, uovu ulikuwepo.
17 A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
Nikafikiri moyoni mwangu, “Mungu atawaleta hukumuni wote wawili wenye haki na waovu, kwa maana kutakuwako na wakati kwa ajili ya kila jambo, wakati kwa ajili ya kila tendo.”
18 Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.
Pia nikafikiri, “Kuhusu wanadamu, Mungu huwajaribu ili wajione kwamba wao ni kama wanyama.
19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
Hatima ya mwanadamu ni kama ile ya wanyama; wote wana mwisho unaofanana: Jinsi anavyokufa mnyama, ndivyo anavyokufa mwanadamu. Wote wana pumzi inayofanana; mwanadamu hana cha zaidi kuliko mnyama. Kila kitu ni ubatili.
20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.
Wote huenda mahali panapofanana; wote hutoka mavumbini, mavumbini wote hurudi.
21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
Ni nani ajuaye kama roho ya mtu huenda juu na roho ya mnyama hushuka chini ardhini?”
22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?
Kwa hiyo nikaona kwamba hakuna kitu kilicho bora zaidi kwa mwanadamu kuliko kuifurahia kazi yake, kwa sababu hilo ndilo fungu lake. Kwa maana ni nani awezaye kumrudisha ili aje kuona kile kitakachotendeka baada yake?