< Ekiliziastis 3 >

1 Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
To everything there is a season, and a time to every purpose under the heavens:
2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,
A time to be born, and a time to die; A time to plant, and a time to pluck up that which is planted;
3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
A time to kill, and a time to heal; A time to break down, and a time to build up;
4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,
A time to weep, and a time to laugh; A time to mourn, and a time to dance;
5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
A time to cast away stones, and a time to gather stones together; A time to embrace, and a time to refrain from embracing;
6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
A time to seek, and a time to lose; A time to keep, and a time to cast away;
7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
A time to rend, and a time to sew; A time to keep silence, and a time to speak;
8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.
A time to love, and a time to hate; A time of war, and a time of peace.
9 Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
What profit hath he that worketh from that wherein he laboureth?
10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
I have seen the travail that God hath given to the sons of men to toil in.
11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.
He hath made everything beautiful in its time; also he hath set the world in their heart, so that man findeth not out from the beginning to the end the work that God doeth.
12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
I know that there is nothing good for them but to rejoice and to do well in their life;
13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
yea also that every man should eat and drink, and enjoy good in all his labour, it is the gift of God.
14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.
I know that whatever God doeth, it shall be for ever; there is nothing to be added to it, nor anything to be taken from it; and God doeth [it], that [men] should fear before him.
15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
That which is was long ago, and that which is to be hath already been; and God bringeth back again that which is past.
16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
And moreover I saw under the sun, that in the place of judgment, wickedness was there; and in the place of righteousness, wickedness was there.
17 A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
I said in my heart, God will judge the righteous and the wicked; for there is a time there for every purpose and for every work.
18 Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.
I said in my heart, It is thus with the children of men, that God may prove them, and that they should see that they themselves are but beasts.
19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
For what befalleth the children of men befalleth beasts; even one thing befalleth them: as the one dieth, so dieth the other, and they have all one breath; and man hath no pre-eminence above the beast: for all is vanity.
20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.
All go unto one place: all are of the dust, and all return to dust.
21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
Who knoweth the spirit of the children of men? Doth it go upwards? and the spirit of the beasts, doth it go downwards to the earth?
22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?
And I have seen that there is nothing better than that man should rejoice in his own works; for that is his portion; for who shall bring him to see what shall be after him?

< Ekiliziastis 3 >