< Ekiliziastis 2 >
1 Echere m nʼime obi m sị, Ugbu a, aga m eji ihe na-enye obi aṅụrị nwaa gị site otu a chọpụta ihe dị mma, ma nke a bụkwa ihe efu.
I said to myself, “Come now, I will test you with pleasure; enjoy what is good!” But it proved to be futile.
2 “Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?”
I said of laughter, “It is folly,” and of pleasure, “What does it accomplish?”
3 Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.
I sought to cheer my body with wine and to embrace folly—my mind still guiding me with wisdom—until I could see what was worthwhile for men to do under heaven during the few days of their lives.
4 Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị.
I expanded my pursuits. I built houses and planted vineyards for myself.
5 Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha,
I made gardens and parks for myself, where I planted all kinds of fruit trees.
6 wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
I built reservoirs to water my groves of flourishing trees.
7 Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem.
I acquired menservants and maidservants, and servants were born in my house. I also owned more herds and flocks than anyone in Jerusalem before me,
8 Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.
and I accumulated for myself silver and gold and the treasure of kings and provinces. I gathered to myself male and female singers, and the delights of the sons of men—many concubines.
9 E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.
So I became great and surpassed all in Jerusalem who had preceded me; and my wisdom remained with me.
10 Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere; egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla. Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile, nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m.
Anything my eyes desired, I did not deny myself. I refused my heart no pleasure. For my heart took delight in all my work, and this was the reward for all my labor.
11 Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.
Yet when I considered all the works that my hands had accomplished and what I had toiled to achieve, I found everything to be futile, a pursuit of the wind; there was nothing to be gained under the sun.
12 Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ?
Then I turned to consider wisdom and madness and folly; for what more can the king’s successor do than what has already been accomplished?
13 Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
And I saw that wisdom exceeds folly, just as light exceeds darkness:
14 Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
The wise man has eyes in his head, but the fool walks in darkness. Yet I also came to realize that one fate overcomes them both.
15 Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
So I said to myself, “The fate of the fool will also befall me. What then have I gained by being wise?” And I said to myself that this too is futile.
16 Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
For there is no lasting remembrance of the wise, just as with the fool, seeing that both will be forgotten in the days to come. Alas, the wise man will die just like the fool!
17 Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
So I hated life, because the work that is done under the sun was grievous to me. For everything is futile and a pursuit of the wind.
18 Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.
I hated all for which I had toiled under the sun, because I must leave it to the man who comes after me.
19 Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.
And who knows whether that man will be wise or foolish? Yet he will take over all the labor at which I have worked skillfully under the sun. This too is futile.
20 Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
So my heart began to despair over all the labor that I had done under the sun.
21 Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.
When there is a man who has labored with wisdom, knowledge, and skill, and he must give his portion to a man who has not worked for it, this too is futile and a great evil.
22 Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
For what does a man get for all the toil and striving with which he labors under the sun?
23 Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.
Indeed, all his days are filled with grief, and his task is sorrowful; even at night, his mind does not rest. This too is futile.
24 Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke.
Nothing is better for a man than to eat and drink and enjoy his work. I have also seen that this is from the hand of God.
25 Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?
For apart from Him, who can eat and who can find enjoyment?
26 Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.
To the man who is pleasing in His sight, He gives wisdom and knowledge and joy, but to the sinner He assigns the task of gathering and accumulating that which he will hand over to one who pleases God. This too is futile and a pursuit of the wind.