< Ekiliziastis 11 >

1 Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.
Ipuruakmo ti tinapaymo iti danum, ta masarakamto manen daytoy kalpasan ti adu nga aldaw.
2 Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.
Ibingaymo daytoy iti pito, uray iti walo a tattao, ta saanmo nga ammo ti didigra a dumteng iti rabaw ti daga.
3 Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.
No napno dagiti ulep iti tudo, ibukbokda dagiti bagbagida iti rabaw ti daga, ket no matuang ti kayo nga agpaabagatan wenno agpaamianan, sadinoman a pakatuangan ti kayo ket idiayen nga agtalinaed daytoy.
4 Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.
Siasinoman a mangpalpaliiw iti angin ket mabalin a saan nga agmula, ken siasinoman a mangpalpaliiw iti ulep ket mabalin a saan nga agapit.
5 Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.
Kas dimo ammo ti paggapuan ti angin, wenno no kasano a dumakkel dagiti tulang ti maladaga iti uneg ti aanakan ti inana, kasta met a saanmo a maawatan dagiti aramid ti Dios, a nangiparsua kadagiti amin a banbanag.
6 Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.
Imulam dagiti bukelmo iti agsapa; agingga iti rabii, agtrabahoka kadagiti imam kas kasapulan, ta saanmo nga ammo no anianto ti rumang-ay, no ti bigat wenno ti rabii, wenno daytoy wenno dayta, wenno agpadadanto a nasayaat.
7 Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.
Pudno a nasam-it ti lawag, ket makaay-ayo a banag para iti mata a makakita iti init.
8 Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.
No agbiag ti maysa a tao iti adu a tawen, bay-am nga agragsak isuna iti amin kadagitoy, ngem panunotenna koma ti maipapan kadagiti dumteng nga aldaw ti kinasipnget, ta adudanto dagitoy. Amin a dumteng ket kasla agpukpukaw nga alingasaw.
9 Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.
Agrag-oka, O agtutubo a lalaki, iti kinaagtutubom, ken agrag-o koma ta pusom kadagiti aldaw ti kinaagtutubom. Gun-odem dagiti nasasayaat a tarigagay ti pusom, ken aniaman a makitkita dagiti matam. Nupay kasta, ammom nga iyegnakanto ti Dios iti pannakaukom para kadagitoy amin a banbanag.
10 Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi, wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.
Papanawem ti pungtot iti pusom, ken saanmo nga ikaskaso ti aniaman a sakit iti bagim, gapu ta ti kinaagtutubo ken ti kinapigsana ket alingasaw.

< Ekiliziastis 11 >