< Ekiliziastis 10 >

1 Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.
Dead flies cause the ointment of the apothecary to send forth a stinking smell: so does a little folly him that is in reputation for wisdom and honor.
2 Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.
A wise man’s heart is at his right hand; but a fool’s heart at his left.
3 Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.
Yes also, when he that is a fool walks by the way, his wisdom fails him, and he says to every one that he is a fool.
4 Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị, ahapụla ọnọdụ gị, nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.
If the spirit of the ruler rise up against you, leave not your place; for yielding pacifies great offenses.
5 Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.
There is an evil which I have seen under the sun, as an error which proceeds from the ruler:
6 Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.
Folly is set in great dignity, and the rich sit in low place.
7 Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.
I have seen servants on horses, and princes walking as servants on the earth.
8 Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.
He that digs a pit shall fall into it; and whoever breaks an hedge, a serpent shall bite him.
9 Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.
Whoever removes stones shall be hurt therewith; and he that splits wood shall be endangered thereby.
10 Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.
If the iron be blunt, and he do not whet the edge, then must he put to more strength: but wisdom is profitable to direct.
11 Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.
Surely the serpent will bite without enchantment; and a babbler is no better.
12 Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi
The words of a wise man’s mouth are gracious; but the lips of a fool will swallow up himself.
13 Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.
The beginning of the words of his mouth is foolishness: and the end of his talk is mischievous madness.
14 Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?
A fool also is full of words: a man cannot tell what shall be; and what shall be after him, who can tell him?
15 Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike, ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.
The labor of the foolish wearies every one of them, because he knows not how to go to the city.
16 Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.
Woe to you, O land, when your king is a child, and your princes eat in the morning!
17 Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ, nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike, ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.
Blessed are you, O land, when your king is the son of nobles, and your princes eat in due season, for strength, and not for drunkenness!
18 Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.
By much slothfulness the building decays; and through idleness of the hands the house drops through.
19 Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.
A feast is made for laughter, and wine makes merry: but money answers all things.
20 Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị; maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị, nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.
Curse not the king, no not in your thought; and curse not the rich in your bedchamber: for a bird of the air shall carry the voice, and that which has wings shall tell the matter.

< Ekiliziastis 10 >