< Diuteronomi 1 >

1 Ndị a bụ okwu ahụ Mosis gwara Izrel niile mgbe ha nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼọzara nʼAraba, ebe chere ihu nʼobodo Suf, nʼetiti Paran na Tofel na Leban, na Hazerọt, na Dizahab.
Haya ni maneno ambayo Musa aliyasema kwa Israeli wote ng'ambo ya jangwa la Yordani, katika tambarare ya mto wa Yordani juu ya Suph, katikati mwa Paran, Topheli, Laban, Hazeroth, na Di Zahab.
2 Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia.
Ni safari ya siku kumi na moja toka Horabu kupitia njia ya mlima wa Seir kwenda Kadeshi Barnea.
3 Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha.
Ilitokea kwenye mwaka wa nne, mwezi wa kumi na moja, siku ya kwanza ya mwezi, Musa alizungumza kwa watu wa Israeli, kuambia yote yale Yahwe aliyomwamuru kuhusu wao.
4 Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.
Hii ilikuwa baada ya Yahwe kumvamia Sihoni mfalme wa Amoria, ambaye aliishi huko Heshboni, na Ogi mfalme wa Bashani, ambaye aliishi huko Ashtarothi ya Edrei.
5 Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,
Ng'ambo ya Yordani, katika nchi ya Moabu, Musa alianza kutangaza maelekezo haya, akisema,
6 Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a.
“Yahwe Mungu wetu alisema nasi huko Horebu, akisema, umeishi vya kutosha katika milima ya nchi hii.
7 Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis.
Geuka na uanze safari yako, na uende kwenye nchi ya milima ya Amorites, na kwenye maeneo yote karibu na tambarare ya mto Yordani, katika nchi ya milima, na nyanda za chini, huko Negev, na pwani - nchi ya Wakanani na huko Lebanoni mbali ya mto mkuu wa Euphratesi.
8 Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.”
Tazama, nimetenga nchi kwa ajili yako, nenda ndani na umiliki nchi ambayo Yahwe aliapa kwa baba zako, Ibrahimu, Isaka na Yakobo, kuwapa na uzao wao baada yao.
9 Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m.
Nilisema nawe kwa wakati huo, nikisema, siwezi nikakubeba peke yangu,
10 Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe.
Yahwe Mungu wako amekuzidisha, na tazama, leo umekuwa umati wa nyota angani.
11 Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa.
Yahwe aweza, Mungu wa baba zako, kukufanya wewe mara elfu moja zaidi ya ulivyo, na kukubariki, kama alivyokuahidi!
12 Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile?
Lakini inawezekanaje mimi peke yangu kubeba shehena zako, mizigo yako, na migogoro yako?
13 Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”
Chukua wanaume wa hekima, wanaume waelewa, na wanaume walio na sifa nzuri toka kila kabila, nitawafaya kuwa vichwa juu yenu.
14 Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”
Mlinijibu na kusema, 'Jambo ulilolisema ni zuri kwetu kufanya.'
15 Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche.
Kwa hiyo nilichukua vichwa vya makabila yenu, wanaume wa hekima, na wanaume wenye sifa nzuri, na nikawafanya kuwa vichwa juu yenu, jemedari kwa elfu, jemedari kwa hamsini, jemedari kwa kumi, na maakida, kabila kwa kabila.
16 Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa.
Niliwaamuru waamuzi wenu kwa wakati huo, kusema, 'Zikiliza mabishano kati ya ndugu zenu, na muhukumu ya haki kati ya ndugu na ndugu zake, na mgeni aliye pamoja naye.
17 Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
Hamtaonesha upendeleo kwa yeyote katika mgogoro, mtasikia madogo na makubwa pia. Hamtaogopa uso wa mtu, kwa kuwa hukumu ni ya Mungu. Migogoro iliyo migumu kwenu, mtaniletea mimi, na mimi nitaisikiliza.
18 Nʼoge ahụ, agwara m unu ihe niile unu na-aghaghị ime.
Niliwaamuru kwa wakati huo mambo yote mtakayofanya.
19 Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.
Tulisafiri toka Horebu na kwenda kupitia jangwa lile kubwa lote na lenye kutisha lile mliloliona, katika njia yetu kuelekea nchi ya milima huko Amorites, kama Yahwe Mungu wetu alivyotuamuru sisi, na tukaja Kadeshi ya Barnea.
20 Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.
Niliwambia, mmekuja kwenye nchi ya milima ya Amorites, ambayo Yahwe Mungu wetu anatupa sisi.
21 Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”
Tazama, Yahwe Mungu wenu amekwisha weka nchi mbele yenu; nenda juu, muimiliki, kama Yahwe, Mungu wa baba zenu, amekwisha zungumza nanyi, msiogope wala kukata tamaa.
22 Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”
Kila moja wenu alikuja kwangu na kusema, 'Basi tutume watu mbele yetu, ili kwamba waweze kupepeleza nchi kwa ajili yetu, na kutuletea sisi neno kuhusiana na njia ya wapi tuvamie, na kuhusiana na miji tutakayoingia.
23 Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla.
Shauri hilo lilinibariki mimi, 'Nilichukua watu kumi na mbili kutoka kwenu, mtu moja kwa kila kabila.
24 Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ.
Waligeuka na kwenda juu ya nchi ya milima, kufika kwenye bonde la Eshcol na kufanya upepelezi wa kina.
25 Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.”
Walichukua baadhi ya mazao ya ardhi mikononi mwao na kuleta kwetu, Pia walileta neno na kusema, 'Ni nchi nzuri ambayo Yahweh Mungu wetu anatupa sisi'
26 Ma unu jụrụ ịga nʼala ahụ, si otu a nupu isi megide iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere.
Bado mlikataa kushambulia, lakini mliasi dhidi ya amri ya Yahwe Mungu wenu.
27 Unu nọ nʼụlọ ikwu unu tamuo ntamu na-asị, “Nʼezie Onyenwe anyị ahụghị anyị nʼanya. Lee ka o si site nʼala Ijipt dupụta anyị were anyị nyefee nʼaka ndị Amọrait ka ha laa anyị nʼiyi!
Mlilalamika katika mahema yenu na kusema, “Ni kwa sababu Yahwe alituchukia sisi kwa kuwa ametutoa katika nchi ya Misri, kuteweka katika mikono ya Amorites kutuangamiza.
28 Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak nʼebe ahụ.’”
Tuende wapi sasa? Ndugu zetu wamefanya mioyo yetu kuyeyuka, kusema, Hao watu ni wakubwa na warefu zaidi yetu, miji yao ni mikubwa na imeimarishwa kwenda mbinguni; zaidi ya yote, tumewaona wana wa Anakim huko”
29 Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu.
Kisha nikasema nao, msitishwe wala msiwaogope.
30 Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt,
Yahwe Mungu wenu, ambaye aenda mbele yenu, atawapigania, kama yote aliyofanya kwa ajili yenu huko Misri mbele ya macho yenu,
31 nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”
na pia katika jangwa, ambapo mmekwisha muona Yahwe Mungu wenu jinsi alivyowabeba, kama mtu abebavyo mtoto wake, kokote mlikoenda mpaka kufika hapa.'
32 Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu,
Bado licha ya neno hili hakumwamini Yahwe Mungu wenu,
33 bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso.
aliyeenda mbele yenu kwenye njia kutafuta eneo kwa ajili yenu kuweka kambi, katika moto kwa usiku, katika mawingu kwa mchana.
34 Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị,
Yahwe alisikia sauti ya maneno yenu na alikasirika; aliapa na kusema,
35 “O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu,
Hakika hakuna mmoja ya hawa watu wa kizazi hiki kiovu wataona nchi nzuri ambayo niliapa kuwapa babu zao,
36 karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”
kasoro Kalebu mwana wa Jephuneeh; yeye ataiona. Yeye nitampa nchi ambayo amekwisha kuikanyanga, na watoto wake, kwa sababu alimfuata Yahwe kwa ukamilifu.'
37 Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ!
Pia Yahweh alinikasirikia mimi kwa sababu yenu, kusema, 'Wewe pia hautaingia huko,
38 Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha.
Yoshua mwana wa Nuh, ambaye amesimama mbele yako, yeye ataingia, mtie moyo, kwani yeye atawaongoza Israeli kuimiliki.
39 Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa.
Zaidi ya yote, watoto wenu wadogo, ambao mlisema watakuwa waathirika, ambao leo hawana elimu ya uzuri au ubaya-wataenda ndani huko. Wao nitawapa nchi hiyo, na wataimiliki.
40 Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.”
Lakini ninyi, geuka na muuanza safari kwenda jangwani kwa kuambaa njia ya bahari ya mianzi'.
41 Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu.
Kisha mlinijibu na kusema kwangu, 'Tumetenda dhambi dhidi ya Yahwe, tutaenda juu na kupigana, tutafuata yote ambayo Yahwe Mungu wetu ametuamuru sisi kufanya'. Kila mtu miongoni mwenu aliweka silaha za vita, na mlikuwa tayari kuvamia nchi ya milima.
42 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’”
Yahwe alisema nami, 'Waambie, msivamie na kupigana, kwa kuwa sitakuwa pamoja nanyi, na mtashindwa na adui zenu'.
43 Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu.
Nilizungumza nanyi kwa njia hii, lakini hamkunisikiliza, Mliasi dhidi ya amri ya Yahwe, mlikuwa wenye kiburi na mlivamia nchi ya milima.
44 Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa.
Lakini Amorites, ambayo waliishi katika nchi hiyo ya milima, walitoka dhidi yenu na kuwafukuza kama nyuki, na kuwapiga chini huko Seir, mbali kama Hormah.
45 Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị.
Mlirudi na kulia mbele ya Yahwe; lakini Yahwe hakusikiliza sauti zenu, wala hakuwa makini kwenu.
46 Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh.
Kwa hiyo mlibaki Kadeshi siku nyingi, siku zote mlibaki huko.

< Diuteronomi 1 >