< Diuteronomi 9 >
1 Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe.
Hør, Israel! Du drager nu over Jordan for at komme og gøre dig til Herre over Folk, der er større og mægtigere end du selv, over store Byer med himmelhøje Fæstningsværker;
2 Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?”
over et stort Folk, høje som Kæmper, Anakiternes Efterkommere, som du selv kender, og om hvem du selv har hørt sige: Hvem kan holde Stand mod Anakiterne!"
3 Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa.
Så skal du nu vide, at det er HERREN din Gud, der går foran dig som en fortærende Ild; han vil ødelægge dem, og han vil underku dem for dig, så du kan drive dem bort og ødelægge dem i Hast, således som HERREN har sagt dig.
4 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha.
Når HERREN din Gud jager dem bort foran dig, tænk så ikke: "For min Retfærdigheds Skyld lod HERREN mig komme ind og tage dette Land i Besiddelse!" Thi det er for disse Folks Ugudeligheds Skyld, at HERREN driver dem bort foran dig!
5 Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.
Det er ikke for din Retfærdigheds eller dit ædle Hjertes Skyld, du kommer ind og tager deres Land i Besiddelse, nej, det er på Grund af disse Folks Ondskab, at HERREN driver dem bort foran dig, og fordi han vil opfylde det Ord, han tilsvor dine Fædre, Abraham, Isak og Jakob.
6 Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike.
Så vid da, at det ikke er for din Retfærdigheds Skyld, at HERREN din Gud giver dig dette herlige Land i Eje; thi du er et Folk med hårde Halse!
7 Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Kom i Hu, glem ikke, hvorledes du fortørnede HERREN din Gud i Ørkenen! Lige fra den Dag I drog ud af Ægypten, og til I kom til Stedet her, har I været genstridige mod HERREN.
8 Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi.
Ved Horeb fortørnede I HERREN, og HERREN blev vred på eder, så han vilde ødelægge eder.
9 Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ.
Da jeg var steget op på Bjerget for at modtage Stentavlerne, den Pagts Tavler, som HERREN havde sluttet med eder, opholdt jeg mig på Bjerget fyrretyve Dage og fyrretyve Nætter uden at spise eller drikke,
10 Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ.
og HERREN gav mig de to Stentavler, beskrevne med Guds Finger; og på dem stod alle de Ord, HERREN havde talt til eder på Bjerget ud fra Ilden, den Dag I var forsamlet.
11 Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ.
Da de fyrretyve Dage og fyrretyve Nætter var omme, gav HERREN mig de to Stentavler, Pagtens Tavler.
12 Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”
Og HERREN sagde til mig: "Stå op og skynd dig ned herfra, thi det Folk, du førte ud af Ægypten, har handlet ilde; hastigt er de veget fra den Vej, jeg foreskrev dem: de har lavet sig et støbt Billede!"
13 Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.
Og HERREN sagde til mig: "Jeg har set dette Folk, og se, det er et Folk med hårde Halse;
14 Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”
lad mig i Fred, så jeg kan ødelægge dem og udslette deres Navn under Himmelen; så vil jeg gøre dig til et Folk, mægtigere og større end det!"
15 Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.
Da vendte jeg mig bort og steg ned fra Bjerget med Pagtens to Tavler i mine Hænder, medens Bjerget brændte i lys Lue;
16 Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ.
og jeg så, og se, I havde syndet mod HERREN eders Gud, I havde lavet eder en støbt Tyrekalv; hastigt var I veget fra den Vej, HERREN havde foreskrevet eder.
17 Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu.
Da greb jeg de to Tavler og kastede dem ud af mine Hænder og knuste dem for eders Øjne.
18 Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu.
Og derpå faldt jeg ned for HERRENs Åsyn fyrretyve Dage og fyrretyve Nætter ligesom forrige Gang, uden at spise eller drikke, for alle eders Synders Skyld, som I havde begået, idet I gjorde, hvad der var ondt i HERRENs Øjne, så I fortørnede ham.
19 Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.
Thi jeg frygtede for, at HERREN skulde tilintetgøre eder i den Vrede og Harme, som opfyldte ham imod eder. Og HERREN bønhørte mig også den Gang!
20 Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya.
Også på Aron blev HERREN vred, så han vilde tilintetgøre ham; men den Gang gik jeg også i Forbøn for Aron.
21 Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.
Men eders syndige Værk, Kalven, tog jeg og brændte; og jeg knuste og malede den til fint Støv, og Støvet kastede jeg i Bækken, som løber ned ad Bjerget.
22 Ọzọkwa, unu kpasuru Onyenwe anyị iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava.
Også i Tabera, Massa og Hibrot Hatta'va fortørnede I HERREN.
23 Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.
Og da HERREN lod eder rejse fra Kadesj Barnea og bød eder drage op og tage det Land i Besiddelse, som han vilde give eder, trodsede I HERREN eders Guds Befaling, og I troede ikke på ham og adlød ham ikke.
24 Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
I har været genstridige mod HERREN, så længe jeg har kendt eder.
25 Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi.
Så faldt jeg ned for HERRENs Åsyn i de fyrretyve Dage og fyrretyve Nætter, fordi HERREN havde sagt, at han vilde tilintetgøre eder,
26 Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt.
og jeg bad til HERREN og sagde: "Herre, HERRE, ødelæg ikke dit Folk og din Ejendom, som du udløste ved din store Magt og førte ud af Ægypten med stærk Hånd!
27 Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.
Kom dine Tjenere i Hu, Abraham, Isak og Jakob; giv ikke Agt på dette Folks Halsstarrighed, på dets Ugudelighed og på dets Synd,
28 Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’
for at man ikke skal sige i det Land, du førte os ud fra: Fordi HERREN ikke evnede at føre dem til det Land, han havde lovet dem, og fordi han hadede dem, derfor førte han dem ud for at lade dem omkomme i Ørkenen!
29 Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”
De er jo dit Folk og din Ejendom, som du førte ud ved din store Kraft og din udstrakte Arm!"