< Diuteronomi 8 >

1 Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ Onyenwe anyị kwere nna nna gị ha na nkwa.
All the commandments which I command you this day shall you observe to do, that you may live, and multiply, and go in and possess the land which the LORD swore to your fathers.
2 Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya.
And you shall remember all the way which the LORD your God led you these forty years in the wilderness, to humble you, and to prove you, to know what was in your heart, whether you would keep his commandments, or no.
3 E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
And he humbled you, and suffered you to hunger, and fed you with manna, which you knew not, neither did your fathers know; that he might make you know that man does not live by bread only, but by every word that proceeds out of the mouth of the LORD does man live.
4 Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.
Your raiment waxed not old on you, neither did your foot swell, these forty years.
5 Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị.
You shall also consider in your heart, that, as a man chastens his son, so the LORD your God chastens you.
6 Debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu.
Therefore you shall keep the commandments of the LORD your God, to walk in his ways, and to fear him.
7 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu,
For the LORD your God brings you into a good land, a land of brooks of water, of fountains and depths that spring out of valleys and hills;
8 ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ.
A land of wheat, and barley, and vines, and fig trees, and pomegranates; a land of oil olive, and honey;
9 Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile.
A land wherein you shall eat bread without scarceness, you shall not lack any thing in it; a land whose stones are iron, and out of whose hills you may dig brass.
10 Mgbe i riri rijuo afọ, too Onyenwe anyị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị.
When you have eaten and are full, then you shall bless the LORD your God for the good land which he has given you.
11 Ma lezie anya ka ị ghara ichefu Onyenwe anyị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa.
Beware that you forget not the LORD your God, in not keeping his commandments, and his judgments, and his statutes, which I command you this day:
12 Ka ọ ghara ị bụ, mgbe i riri rijuru afọ, mgbe i wuuru onwe gị ezi ụlọ dị mma birikwa nʼime ha,
Lest when you have eaten and are full, and have built goodly houses, and dwelled therein;
13 mgbe igwe ehi na igwe atụrụ gị mụbara, mgbe ọlaọcha na ọlaedo gị mụbara, na mgbe ihe niile i nwere mụbara.
And when your herds and your flocks multiply, and your silver and your gold is multiplied, and all that you have is multiplied;
14 Kpachara anya hụ na nganga abanyeghị gị nʼobi, ime ka i chefuo Onyenwe anyị Chineke gị onye mere ka ị site nʼIjipt, sitekwa nʼala ịbụ ohu pụta.
Then your heart be lifted up, and you forget the LORD your God, which brought you forth out of the land of Egypt, from the house of bondage;
15 Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ
Who led you through that great and terrible wilderness, wherein were fiery serpents, and scorpions, and drought, where there was no water; who brought you forth water out of the rock of flint;
16 O ji mánà nyejuo gị afọ nʼọzara, mánà ahụ nna gị ha na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya nʼihi iweda mmụọ gị ala, na ịnwale gị, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma.
Who fed you in the wilderness with manna, which your fathers knew not, that he might humble you, and that he might prove you, to do you good at your latter end;
17 I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.”
And you say in your heart, My power and the might of my hand has gotten me this wealth.
18 Ma cheta Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa.
But you shall remember the LORD your God: for it is he that gives you power to get wealth, that he may establish his covenant which he swore to your fathers, as it is this day.
19 Ma ọ bụrụ na i chefuo Onyenwe anyị bụ Chineke gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi.
And it shall be, if you do at all forget the LORD your God, and walk after other gods, and serve them, and worship them, I testify against you this day that you shall surely perish.
20 Ọ bụrụ na unu egeghị ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke unu, ime ihe ọ chọrọ, ọ ga-ala unu nʼiyi, dịka o si bibie mba ndị a niile dị iche iche ọ na-ebibi nʼihi unu.
As the nations which the LORD destroys before your face, so shall you perish; because you would not be obedient to the voice of the LORD your God.

< Diuteronomi 8 >