< Diuteronomi 8 >
1 Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ Onyenwe anyị kwere nna nna gị ha na nkwa.
Samalani potsata lamulo lililonse limene ndikukupatsani lero, kuti mukhale ndi moyo ndi kuchulukana kuti mulande ndi kulowa mʼdziko limene Yehova analumbira kuti adzapereka kwa makolo anu.
2 Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya.
Kumbukirani mmene Yehova Mulungu wanu anakutsogolerani njira yonse mʼchipululu kwa zaka makumi anayi, kukutsitsani ndi kukuyesani kuti adziwe chimene chinali mu mtima mwanu ngati mungathe kusunga malamulo ake kapena ayi.
3 E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
Iye anakutsitsani nakumvetsani njala kenaka nʼkukudyetsani mana amene anali osadziwika kwa inu kapena makolo anu, kuti akuphunzitseni kuti munthu sadzakhala ndi moyo ndi chakudya chokha koma ndi mawu aliwonse ochokera mʼkamwa mwa Yehova.
4 Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.
Mʼzaka makumi anayi zimenezi, zovala zanu sizinangʼambike ndipo mapazi anu sanatupe.
5 Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị.
Tsono dziwani mu mtima mwanu kuti monga abambo amalanga mwana wawo, momwemonso Yehova Mulungu wanu amakulangani.
6 Debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu.
Samalirani malamulo a Yehova Mulungu wanu, kuyenda mʼnjira yake ndi kumuopa Iye.
7 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu,
Pakuti Yehova Mulungu wanu akukulowetsani mʼdziko labwino, dziko lokhala ndi mitsinje ndi mathawale a madzi, akasupe oyenderera mu zigwa ndi mʼmapiri,
8 ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ.
dziko lokhala ndi tirigu ndi barele, mpesa ndi mitengo ya mkuyu, makangadza, mafuta a olivi ndi uchi;
9 Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile.
dziko limene buledi sadzasowa ndipo simudzasowa chilichonse; dziko limene miyala yake ndi chitsulo ndipo ku mapiri ake mukhoza kukumbako mkuwa.
10 Mgbe i riri rijuo afọ, too Onyenwe anyị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị.
Mukadya ndi kukhuta, yamikani Yehova Mulungu wanu chifukwa cha dziko labwino limene wakupatsani.
11 Ma lezie anya ka ị ghara ichefu Onyenwe anyị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa.
Samalani kuopa kuti mungayiwale Yehova Mulungu wanu posasunga malamulo, zikhazikitso ndi malangizo ake amene ndikukupatsani lero,
12 Ka ọ ghara ị bụ, mgbe i riri rijuru afọ, mgbe i wuuru onwe gị ezi ụlọ dị mma birikwa nʼime ha,
kuopa kuti mukadya ndi kukhuta, mukamanga nyumba zabwino ndi kukhalamo,
13 mgbe igwe ehi na igwe atụrụ gị mụbara, mgbe ọlaọcha na ọlaedo gị mụbara, na mgbe ihe niile i nwere mụbara.
ndi pamene ngʼombe zanu ndi nkhosa zanu zaswana, ndi siliva ndi golide wanu wachuluka ndiponso kuti zonse zimene muli nazo zachuluka,
14 Kpachara anya hụ na nganga abanyeghị gị nʼobi, ime ka i chefuo Onyenwe anyị Chineke gị onye mere ka ị site nʼIjipt, sitekwa nʼala ịbụ ohu pụta.
mtima wanu udzayamba kunyada ndi kuyiwala Yehova Mulungu wanu, amene anakutulutsani ku Igupto, kukuchotsani ku dziko la ukapolo.
15 Onye duuru gị nʼime ọzara ukwu ahụ dị egwu, ebe agwọ ọjọọ na akpị jupụtara, ebe na-ekpo ọkụ, nke mmiri na-adịghị. O sitere na nkume nye gị mmiri ọṅụṅụ
Iye anakutsogolerani kudutsa mʼchipululu chachikulu ndi chochititsa mantha, dziko lija la ludzu ndi lopanda madzi, lokhala ndi njoka zaululu ndi zinkhanira. Iye anatulutsa madzi kuchokera mʼthanthwe lowuma.
16 O ji mánà nyejuo gị afọ nʼọzara, mánà ahụ nna gị ha na-amaghị ihe ọ bụ na mbụ. O mere ya nʼihi iweda mmụọ gị ala, na ịnwale gị, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma.
Iye anakupatsani mana kuti mudye mʼchipululu, zinthu zoti ngakhale makolo anu sanazidziwe, kuti akuchepetseni ndi kukuyesani ndipo kuti pa mapeto pake zikuyendereni bwino.
17 I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.”
Mu mtima mwanu mukhoza kuganiza kuti, “Mphamvu zanga ndi kulimbika kwa dzanja langa ndi zimene zandilemeretsa chonchi.”
18 Ma cheta Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa.
Koma kumbukirani Yehova Mulungu chifukwa ndi amene amakupatsani mphamvu zopezera chuma chimenechi kuti atsimikize pangano limene analumbira kwa makolo anu, monga liliri lero lino.
19 Ma ọ bụrụ na i chefuo Onyenwe anyị bụ Chineke gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi.
Ine ndine mboni yokutsutsani lero lino, kuti mukayiwala Yehova Mulungu wanu ndi kutsata milungu ina nʼkumayigwadira, mudzawonongeka ndithu.
20 Ọ bụrụ na unu egeghị ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke unu, ime ihe ọ chọrọ, ọ ga-ala unu nʼiyi, dịka o si bibie mba ndị a niile dị iche iche ọ na-ebibi nʼihi unu.
Monga mitundu ina ya anthu imene Yehova anayiwononga pamaso panu, inunso mudzawonongedwa chifukwa chosamvera Yehova Mulungu wanu.