< Diuteronomi 7 >

1 Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;
Bwana Mungu wako akuletapo katika nchi unayoingia kuimiliki, na awafukuzapo mbele yako mataifa mengi, yaani Wahiti, Wagirgashi, Waamori, Wakanaani, Waperizi, Wahivi na Wayebusi, mataifa saba makubwa tena yenye nguvu kuliko wewe,
2 mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere.
pia Bwana Mungu wako atakapowatia mkononi mwako na ukawashinda, basi ni lazima uwaangamize wote kabisa. Usifanye agano nao, wala usiwahurumie.
3 Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.
Usioane nao. Usimtoe binti yako kuolewa na mwanawe, au kumchukua binti yake aolewe na mwanao.
4 Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.
Kwa maana watamgeuza mwanao aache kunifuata, ili aitumikia miungu mingine, nayo hasira ya Bwana itawaka dhidi yako, naye atakuangamiza ghafula.
5 Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.
Hili ndilo utakalowafanyia: Vunja madhabahu yao, vunja mawe yao ya kuabudia, katakata nguzo zao za Ashera na kuchoma sanamu zao kwa moto.
6 Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.
Kwa kuwa wewe ni taifa takatifu kwa Bwana Mungu wako. Bwana Mungu wako amekuchagua wewe kutoka mataifa yote juu ya uso wa dunia kuwa watu wake, hazina yake ya thamani.
7 Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ.
Bwana hakuweka upendo wake juu yenu na kuwachagua kwa sababu mlikuwa wengi mno kuliko watu wengine, kwa maana ninyi ndio mliokuwa wachache sana kuliko mataifa yote.
8 Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt.
Lakini ni kwa sababu Bwana aliwapenda ninyi na kutunza kiapo alichowaapia babu zenu kwamba atawatoa ninyi kwa mkono wenye nguvu na kuwakomboa kutoka nchi ya utumwa, kutoka nguvu za Farao mfalme wa Misri.
9 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
Basi ujue kwamba Bwana Mungu wako ndiye Mungu; ni Mungu mwaminifu, anayetunza Agano la upendo kwa maelfu ya vizazi vya wale wanaompenda na kuzishika amri zake.
10 Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha.
Lakini kwa wale wanaomchukia atawalipiza kwenye nyuso zao kwa maangamizi; hatachelewa kuwalipiza kwenye nyuso zao wale wamchukiao.
11 Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa.
Kwa hiyo, kuweni waangalifu kufuata maagizo, amri na sheria ninazowapa leo.
12 Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.
Kama mkizingatia sheria hizi na kuzifuata kwa uangalifu, basi Bwana Mungu wenu atatunza Agano lake la upendo nanyi, kama alivyowaapia baba zenu.
13 Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.
Atawapenda ninyi na kuwabariki na kuongeza idadi yenu. Atabariki uzao wa tumbo lenu, mazao ya nchi yenu, nafaka, divai mpya na mafuta, ndama za ngʼombe wa makundi yenu, na kondoo za makundi yenu katika nchi ile aliyoapa kuwapa baba zenu.
14 A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.
Mtabarikiwa kuliko mataifa mengine yote, hakuna wanaume wala wanawake kwenu watakaokosa watoto, wala mifugo yenu haitakuwa tasa.
15 Onyenwe anyị ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!
Bwana atawakinga na kila ugonjwa. Mungu hatatia juu yenu ugonjwa wowote mbaya mlioufahamu huko Misri, lakini atatia ugonjwa juu ya wale wote wanaokuchukia.
16 Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya.
Ni lazima mwangamize watu wote ambao Bwana Mungu wenu atawatia mikononi mwenu. Msiwatazame kwa kuwahurumia na msiitumikie miungu yao, kwa kuwa itakuwa mtego kwenu.
17 Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?”
Mnaweza kujiuliza wenyewe “Mataifa haya ni yenye nguvu kuliko sisi. Tutawezaje kuwafukuza?”
18 Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.
Lakini msiwaogope. Kumbukeni vyema jinsi Bwana Mungu wenu alivyofanya kwa Farao na kwa wote huko Misri.
19 Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. Onyenwe anyị bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a.
Mliona kwa macho yenu wenyewe majaribu makubwa, ishara za miujiza na maajabu, mkono wenye nguvu na ulionyooshwa, ambao kwa huo Bwana Mungu wenu aliwatoa mtoke Misri. Bwana Mungu wenu atawafanyia hivyo watu wote ambao mnawaogopa sasa.
20 Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.
Zaidi ya hayo, Bwana Mungu wenu atatuma manyigu miongoni mwao hadi yale mabaki watakaojificha waangamie.
21 Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu.
Msiingiwe na hofu kwa sababu yao, kwa kuwa Bwana Mungu wenu, ambaye yupo miongoni mwenu ni mkuu naye ni Mungu wa kutisha.
22 Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.
Bwana Mungu wenu atawafukuza mataifa hayo mbele yenu kidogo kidogo. Hamtaruhusiwa kuwaondoa wote kwa mara moja, la sivyo wanyama mwitu wataongezeka na kuwa karibu nanyi.
23 Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.
Lakini Bwana Mungu wenu atawatia watu hao mikononi mwenu, akiwatia katika kuchanganyikiwa kukubwa mpaka wawe wameangamizwa.
24 Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.
Atawatia wafalme wao mikononi mwenu, nanyi mtayafuta majina yao chini ya mbingu. Hakuna hata mmoja atakayeweza kusimama dhidi yenu bali mtawaangamiza.
25 Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
Vinyago vya miungu yao mtavichoma moto. Msitamani fedha wala dhahabu iliyo juu yao, wala msizichukue kwa ajili yenu, la sivyo mtakuwa mmetekwa navyo. Kwa kuwa ni chukizo kwa Bwana Mungu wenu.
26 Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.
Msilete vitu vya machukizo katika nyumba zenu kwani ninyi, mtatengwa kama vitu hivyo kwa maangamizo. Ukichukie kabisa kitu hicho kwa kuwa kimetengwa kwa maangamizo.

< Diuteronomi 7 >