< Diuteronomi 6 >

1 Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ, na ikpe niile nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nyere m nʼiwu ka a kuziere unu ka unu debe, nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.
“这是耶和华—你们 神所吩咐教训你们的诫命、律例、典章,使你们在所要过去得为业的地上遵行,
2 Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo.
好叫你和你子子孙孙一生敬畏耶和华—你的 神,谨守他的一切律例诫命,就是我所吩咐你的,使你的日子得以长久。
3 Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.
以色列啊,你要听,要谨守遵行,使你可以在那流奶与蜜之地得以享福,人数极其增多,正如耶和华—你列祖的 神所应许你的。
4 Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
“以色列啊,你要听!耶和华—我们 神是独一的主。
5 Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya.
你要尽心、尽性、尽力爱耶和华—你的 神。
6 Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.
我今日所吩咐你的话都要记在心上,
7 Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
也要殷勤教训你的儿女。无论你坐在家里,行在路上,躺下,起来,都要谈论。
8 Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
也要系在手上为记号,戴在额上为经文;
9 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
又要写在你房屋的门框上,并你的城门上。”
10 Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị,
“耶和华—你的 神领你进他向你列祖亚伯拉罕、以撒、雅各起誓应许给你的地。那里有城邑,又大又美,非你所建造的;
11 na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ,
有房屋,装满各样美物,非你所装满的;有凿成的水井,非你所凿成的;还有葡萄园、橄榄园,非你所栽种的;你吃了而且饱足。
12 leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.
那时你要谨慎,免得你忘记将你从埃及地、为奴之家领出来的耶和华。
13 Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.
你要敬畏耶和华—你的 神,事奉他,指着他的名起誓。
14 Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe.
不可随从别神,就是你们四围国民的神;
15 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.
因为在你们中间的耶和华—你 神是忌邪的 神,惟恐耶和华—你 神的怒气向你发作,就把你从地上除灭。
16 Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa.
“你们不可试探耶和华—你们的 神,像你们在玛撒那样试探他。
17 Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
要留意遵守耶和华—你们 神所吩咐的诫命、法度、律例。
18 Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa.
耶和华眼中看为正、看为善的,你都要遵行,使你可以享福,并可以进去得耶和华向你列祖起誓应许的那美地,
19 Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.
照耶和华所说的,从你面前撵出你的一切仇敌。
20 Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?”
“日后,你的儿子问你说:‘耶和华—我们 神吩咐你们的这些法度、律例、典章是什么意思呢?’
21 Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.
你就告诉你的儿子说:‘我们在埃及作过法老的奴仆;耶和华用大能的手将我们从埃及领出来,
22 Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.
在我们眼前,将重大可怕的神迹奇事施行在埃及地和法老并他全家的身上,
23 Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa.
将我们从那里领出来,要领我们进入他向我们列祖起誓应许之地,把这地赐给我们。
24 Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.
耶和华又吩咐我们遵行这一切律例,要敬畏耶和华—我们的 神,使我们常得好处,蒙他保全我们的生命,像今日一样。
25 Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”
我们若照耶和华—我们 神所吩咐的一切诫命谨守遵行,这就是我们的义了。’”

< Diuteronomi 6 >