< Diuteronomi 4 >

1 Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.
“And now, O Israel, listen to the statutes and to the judgments which I am teaching you to do, so that you live, and have gone in, and possessed the land which YHWH God of your fathers is giving to you.
2 Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.
You do not add to the word which I am commanding you, nor diminish from it, to keep the commands of your God YHWH which I am commanding you.
3 Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.
Your eyes are seeing that which YHWH has done in Ba‘al-Peor, for every man who has gone after Ba‘al-Peor, your God YHWH has destroyed him from your midst;
4 Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa.
and you who are cleaving to your God YHWH [are] alive today—all of you.
5 Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.
See, I have taught you statutes and judgments, as my God YHWH has commanded me, to do so in the midst of the land to where you are going in to possess it;
6 Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.”
and you have kept and done [them] (for it [is] your wisdom and your understanding) before the eyes of the peoples who hear all these statutes, and they have said, Surely a people wise and understanding [is] this great nation.
7 Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere?
For which [is] the great nation that has God [so] near to it, as our God YHWH, in all we have called to Him?
8 Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa?
And which [is] the great nation which has righteous statutes and judgments according to all this law which I am setting before you today?
9 Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
Only, take heed to yourself, and watch your soul exceedingly, lest you forget the things which your eyes have seen, and lest they turn aside from your heart all [the] days of your life; and you have made them known to your sons and to your sons’ sons.
10 Cheta ụbọchị ahụ unu bịara guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu nʼugwu Horeb, nʼụbọchị ahụ ọ gwara m okwu sị m, “Kpọkọtaa ụmụ Izrel ka ha bịa nʼihu m, nụrụ okwu m, ka ha nwee ike mụta ịtụ m egwu ụbọchị niile nke ha ga-ebi nʼala ahụ, ka ha nweekwa ike ikuziri ụmụ ha.”
[Never forget] the day when you have stood before your God YHWH in Horeb, in YHWH’s saying to me, Assemble the people to Me, and I cause them to hear My words, so that they learn to fear Me all the days that they are alive on the ground, and they teach their sons;
11 Ọ bụ nʼala ugwu ahụ ka unu bịara nso, guzo, mgbe ọkụ si nʼugwu ahụ na-ere, na-alali elu iru eluigwe, ya na igwe ojii nakwa oke ọchịchịrị.
and you draw near and stand under the mountain, and the mountain is burning with fire to the heart of the heavens, [with] darkness, cloud, and thick darkness,
12 Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu.
and YHWH speaks to you out of the midst of the fire; you are hearing a voice of words, but you are seeing no likeness, only a voice;
13 O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.
and He declares His covenant to you, which He has commanded you to do, the Ten Commandments, and He writes them on two tablets of stone.
14 E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.
And YHWH has commanded me at that time to teach you statutes and judgments, for your doing them in the land to where you are passing over to possess it.
15 Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya
And you have been very watchful of your souls, for you have not seen any likeness in the day of YHWH’s speaking to you in Horeb out of the midst of the fire,
16 ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,
lest you do corruptly, and have made for yourselves a carved image, a likeness of any figure: a form of male or female,
17 maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,
a form of any beast which [is] in the earth, a form of any winged bird which flies in the heavens,
18 maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.
a form of any creeping thing on the ground, a form of any fish which [is] in the waters below the earth.
19 Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.
And lest you lift up your eyes to the heavens, and have seen the sun, and the moon, and the stars, all the host of the heavens, and have been drawn away, and have bowed yourself to them and served them, which your God YHWH has apportioned to all the peoples under all the heavens.
20 Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a.
And YHWH has taken you, and He is bringing you out from the iron furnace, from Egypt, to be to Him for a people, an inheritance, as [at] this day.
21 Onyenwe anyị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị.
And YHWH has showed Himself angry with me because of your words, and swears to my not passing over the Jordan, and to my not going into the good land which your God YHWH is giving to you [for] an inheritance;
22 Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ.
for I am dying in this land; I am not passing over the Jordan, but you are passing over and have possessed this good land.
23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.
Take heed to yourselves lest you forget the covenant of your God YHWH which He has made with you, and have made a carved image for yourselves, a likeness of anything [concerning] which your God YHWH has charged you;
24 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.
for your God YHWH is a consuming fire—a zealous God.
25 Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke unu, ma kpasuo ya iwe
When you beget sons and sons’ sons, and you have become old in the land, and have done corruptly, and have made a carved image, a likeness of anything, and have done evil in the eyes of YHWH to provoke Him to anger,
26 ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu.
I have caused the heavens and the earth to testify against you this day, that you perish utterly quickly from off the land to where you are passing over the Jordan to possess it; you do not prolong days on it, but are utterly destroyed;
27 Onyenwe anyị ga-eme ka unu gbasasịa nʼetiti mba ndị ọzọ. Ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ ndụ nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị ga-achụga unu.
and YHWH has scattered you among the peoples, and you have been left few in number among the nations to where YHWH leads you,
28 Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi.
and you have served gods there, work of man’s hands, wood and stone, which do not see, nor hear, nor eat, nor smell.
29 Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya.
And you have sought your God YHWH from there, and have found [Him] when you seek Him with all your heart and with all your soul.
30 Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu.
In the distress of yours, when all these things have found you in the latter end of the days, and you have turned back to your God YHWH and have listened to His voice—
31 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike.
for your God YHWH [is] a merciful God—He does not fail you, nor destroy you, nor forget the covenant of your fathers which He has sworn to them.
32 Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla.
For ask now of the former days which have been before you, from the day that God created man on the earth, and from the [one] end of the heavens even to the [other] end of the heavens, whether there has been as this great thing, or [if anything] has been heard like it.
33 O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị?
Has a people heard the voice of God speaking out of the midst of the fire, as you have heard, you—and live?
34 O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ?
Or has God tried to go in to take a nation for Himself from the midst of a nation, by trials, by signs, and by wonders, and by war, and by a strong hand, and by an outstretched arm, and by great terrors, according to all that your God YHWH has done to you in Egypt before your eyes?
35 O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya.
You—you have been shown [it], to know that He, YHWH, [is] God; there is none else besides Him.
36 O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ.
He has caused you to hear His voice from the heavens, to instruct you; and on earth He has showed you His great fire, and you have heard His words out of the midst of the fire.
37 Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a.
And because that He has loved your fathers, He also fixes on their seed after them, and brings you out in His presence, by His great power, from Egypt,
38 Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa.
to dispossess nations greater and stronger than you from your presence, to bring you in to give their land to you [for] an inheritance, as [at] this day.
39 Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.
And you have known today, and have turned [it] back to your heart, that He, YHWH, [is] God in the heavens above and on the earth below—there is none else;
40 Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
and you have kept His statutes and His commands which I am commanding you today, so that it is well for you, and for your sons after you, and so that you prolong days on the ground which your God YHWH is giving to you—all the days.”
41 Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan,
Then Moses separates three cities beyond the Jordan, toward the sun-rising,
42 ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya.
for the fleeing there of the manslayer who slays his neighbor unknowingly, and he is not hating him before, and he has fled to one of these cities and he has lived:
43 Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase.
Bezer in the wilderness, in the land of the plain, for the Reubenite; and Ramoth in Gilead for the Gadite; and Golan in Bashan for the Manassite.
44 Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel.
And this [is] the law which Moses has set before the sons of Israel;
45 Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta
these [are] the testimonies, and the statutes, and the judgments, which Moses has spoken to the sons of Israel in their coming out of Egypt,
46 na ndagwurugwu Bet-Peoa nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, bụ onye Mosis na ndị Izrel meriri nʼagha mgbe ha si nʼIjipt pụta.
beyond the Jordan, in the valley opposite Beth-Peor, in the land of Sihon, king of the Amorite, who is dwelling in Heshbon, whom Moses and the sons of Israel have struck in their coming out of Egypt;
47 Ndị Izrel nwetaara onwe ha ala ya na ala Ọg, eze Bashan. Eze abụọ ndị a bụ eze ndị Amọrait ndị ala ha dị nʼọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.
and they possess his land and the land of Og king of Bashan, two kings of the Amorite who [are] beyond the Jordan, [toward] the sun-rising,
48 Ala a sitere nʼAroea, nʼọnụ mmiri Anọn ruo nʼugwu Siriọn (ya bụ ugwu Hemon),
from Aroer, which [is] by the edge of the Brook of Arnon, even to Mount Zion, which [is] Hermon—
49 ruo nʼala Araba niile, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, ruokwa nʼOsimiri Nnu, nʼala ala ugwu Pisga.
and all the plain beyond the Jordan eastward, even to the Sea of the Plain, below the Springs of Pisgah.

< Diuteronomi 4 >