< Diuteronomi 34 >
1 Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
Nígbà náà ni Mose gun òkè Nebo láti pẹ̀tẹ́lẹ̀ Moabu sí orí Pisga tí ó dojúkọ Jeriko. Níbẹ̀ ni Olúwa ti fi gbogbo ilẹ̀ hàn án láti Gileadi dé Dani,
2 ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
gbogbo Naftali, ilẹ̀ Efraimu àti Manase, gbogbo ilẹ̀ Juda títí dé Òkun Ńlá,
3 Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
gúúsù àti gbogbo àfonífojì Jeriko, ìlú ọlọ́pẹ dé Soari.
4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”
Nígbà náà ní Olúwa sọ fún un pé, “Èyí ni ilẹ̀ tí mo ṣèlérí lórí ìbúra fún Abrahamu, Isaaki, àti Jakọbu nígbà tí mo wí pé, ‘Èmi yóò fi fún irú-ọmọ rẹ.’ Mo ti jẹ́ kí o rí i pẹ̀lú ojú rẹ, ṣùgbọ́n ìwọ kì yóò dé bẹ̀.”
5 Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.
Bẹ́ẹ̀ ni Mose ìránṣẹ́ Olúwa kú ní ilẹ̀ Moabu, bí Olúwa ti wí.
6 Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.
Ó sì sin ín nínú àfonífojì ní ilẹ̀ Moabu, ní òdìkejì Beti-Peori, ṣùgbọ́n títí di òní yìí, kò sí ẹnìkan tí ó mọ ibi tí ibojì i rẹ̀ wà.
7 Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.
Mose jẹ́ ẹni ọgọ́fà ọdún nígbà tí ó kú, síbẹ̀ ojú rẹ̀ kò ṣe bàìbàì bẹ́ẹ̀ ni agbára rẹ̀ kò dínkù.
8 Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị.
Àwọn ọmọ Israẹli sọkún un Mose ní pẹ̀tẹ́lẹ̀ Moabu ní ọgbọ̀n ọjọ́ títí di ìgbà tí ọjọ́ ẹkún àti ọ̀fọ̀ Mose parí.
9 Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.
Joṣua ọmọ Nuni kún fún ẹ̀mí ọgbọ́n nítorí Mose ti gbọ́wọ́ ọ rẹ̀ lé e lórí. Àwọn ọmọ Israẹli sì fetí sí i wọ́n sì ṣe ohun tí Olúwa ti pàṣẹ fún Mose.
10 Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,
Láti ìgbà náà kò sì sí wòlíì tí ó dìde ní Israẹli bí i Mose, ẹni tí Olúwa mọ̀ lójúkojú,
11 onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.
tí ó ṣe gbogbo iṣẹ́ àmì àti iṣẹ́ ìyanu tí Olúwa rán an láti lọ ṣe ní Ejibiti sí Farao àti sí gbogbo àwọn ìránṣẹ́ ẹ rẹ̀ àti sí gbogbo ilẹ̀ náà.
12 Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.
Nítorí kò sí ẹni tí ó tí ì fi gbogbo ọ̀rọ̀ agbára hàn, tàbí ṣe gbogbo ẹ̀rù ńlá tí Mose fihàn ní ojú gbogbo Israẹli.