< Diuteronomi 34 >
1 Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
And Moses went up from the plains of Moab unto the mount of Nebo, to the top of Pisgah, that is before Jericho; and the Lord showed him all the land [from] Gil'ad unto Dan,
2 ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
And all Naphtali, and the land of Ephraim, and Menasseh, and all the land of Judah, unto the western sea.
3 Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
And the south, and the plain, the valley of Jericho, the city of palm-trees, unto Zoar.
4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”
And the Lord said unto him, This is the land which I swore unto Abraham, unto Isaac, and unto Jacob, saying, Unto thy seed will I give it: I have let thee see it with thy eyes, but thither shalt thou not go over.
5 Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.
And Moses the servant of the Lord died there in the land of Moab, according to the order of the Lord.
6 Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.
And he buried him in the valley in the land of Moab, opposite Beth-peor; but no man knoweth of his sepulchre unto this day.
7 Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.
And Moses was a hundred and twenty years old when he died; his eye was not dimmed, and his natural force had not abated.
8 Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị.
And the children of Israel wept for Moses in the plains of Moab thirty days; and then were ended the days of weeping and mourning for Moses.
9 Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.
And Joshua the son of Nun was full of the spirit of wisdom; for Moses had laid his hands upon him; and the children of Israel hearkened unto him, and did, as the Lord had commanded Moses.
10 Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,
And there arose not a prophet since then in Israel like unto Moses, whom the Lord knew face to face,
11 onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.
In respect to all the signs and the wonders, which the Lord had sent him to do in the land of Egypt to Pharaoh, and to all his servants, and to all his land,
12 Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.
And in respect to all that mighty hand, and in all the great terrific deeds which Moses displayed before the eyes of all Israel.