< Diuteronomi 32 >

1 Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu! Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ.
Sikilizeni, enyi mbingu, nami nitasema; sikia, ee nchi, maneno ya kinywa changu.
2 Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta.
Mafundisho yangu na yanyeshe kama mvua, na maneno yangu na yashuke kama umande, kama manyunyu juu ya majani mabichi, kama mvua tele juu ya mimea myororo.
3 Aga m eto aha Onyenwe anyị toonu ịdị ukwuu Chineke anyị!
Nitalitangaza jina la Bwana. Naam, sifuni ukuu wa Mungu wetu!
4 Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.
Yeye ni Mwamba, kazi zake ni kamilifu, njia zake zote ni haki. Mungu mwaminifu ambaye hakosei, yeye ni mnyofu na mwenye haki.
5 Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe
Wamefanya mambo ya upotovu mbele zake; kwa aibu yao, wao si watoto wake tena, lakini ni kizazi kilicho kiovu na kilichopotoka.
6 Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?
Je, hii ndiyo njia ya kumlipa Bwana, enyi watu wajinga na wasio na busara? Je, yeye siye Baba yenu, Muumba wenu, aliyewafanya ninyi na kuwaumba?
7 Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.
Kumbuka siku za kale; tafakari vizazi vya zamani vilivyopita. Uliza baba yako, naye atakuambia, wazee wako, nao watakueleza.
8 Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.
Aliye Juu Sana alipowapa mataifa urithi wao, alipogawanya wanadamu wote, aliweka mipaka kwa ajili ya mataifa sawasawa na hesabu ya wana wa Israeli.
9 Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.
Kwa kuwa fungu la Bwana ni watu wake, Yakobo kura yake ya urithi.
10 Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,
Katika nchi ya jangwa alimkuta, katika nyika tupu ivumayo upepo. Alimhifadhi na kumtunza; akamlinda kama mboni ya jicho lake,
11 dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya,
kama tai avurugaye kiota chake, na kurukaruka juu ya makinda yake, ambaye hutanda mabawa yake kuwadaka, na huwachukua kwenye mabawa yake.
12 Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.
Bwana peke yake alimwongoza; hakuwepo mungu mgeni pamoja naye.
13 O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume,
Akamfanya apande sehemu zilizoinuka za nchi, akamlisha kwa mavuno ya mashamba. Akamlea kwa asali toka mwambani, na kwa mafuta kutoka mwamba mgumu,
14 na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.
kwa jibini na maziwa kutoka makundi ya ngʼombe na kutoka makundi ya mbuzi, kwa mafuta ya wana-kondoo na mbuzi, kwa kondoo dume wazuri wa Bashani, na kwa ngano nzuri. Ukanywa damu ya zabibu inayotoa povu.
15 Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya, ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya. Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya, jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya.
Yeshuruni alinenepa na kupiga teke; alikuwa na chakula tele, akawa mzito na akapendeza sana. Akamwacha Mungu aliyemuumba, na kumkataa Mwamba Mwokozi wake.
16 Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
Wakamfanya Mungu kuwa na wivu kwa miungu yao migeni, na kumkasirisha kwa sanamu zao za machukizo.
17 Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke, bụ chi ndị ha na-amaghị, chi ndị ka pụtara ọhụrụ, chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha.
Wakatoa dhabihu kwa pepo, ambao si Mungu: miungu wasiyoijua, miungu iliyojitokeza siku za karibuni, miungu ambayo baba zenu hawakuiogopa.
18 Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ, i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
Mkamwacha Mwamba, aliyewazaa ninyi; mkamsahau Mungu aliyewazaa.
19 Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe.
Bwana akaona hili, akawakataa, kwa sababu alikasirishwa na wanawe na binti zake.
20 “Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Akasema, “Nitawaficha uso wangu, nami nione mwisho wao utakuwa nini, kwa kuwa wao ni kizazi kilichopotoka, watoto ambao si waaminifu.
21 Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.
Wamenifanya niwe na wivu kwa kile ambacho si mungu, na kunikasirisha kwa sanamu zao zisizokuwa na thamani. Nitawafanya wawaonee wivu wale ambao si taifa. Nitawafanya wakasirishwe na taifa lile lisilo na ufahamu.
22 Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. (Sheol h7585)
Kwa maana moto umewashwa kwa hasira yangu, ule uwakao hadi kwenye vina vya mauti. Utateketeza dunia pamoja na mazao yake, na kuwasha moto katika misingi ya milima. (Sheol h7585)
23 “Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha.
“Nitalundika majanga juu yao na kutumia mishale yangu dhidi yao.
24 Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.
Nitatuma njaa kali dhidi yao maradhi mabaya, yateketezayo na tauni ya kufisha; nitawapelekea meno makali ya wanyama mwitu, na sumu ya nyoka wale watambaao mavumbini.
25 Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
Barabarani upanga utawakosesha watoto; nyumbani mwao hofu itatawala. Vijana wao wa kiume na wa kike wataangamia, pia watoto wachanga na wazee wenye mvi.
26 Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.
Nilisema ningewatawanya na kufuta kumbukumbu lao katika mwanadamu.
27 Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi, ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị, ‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri, ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’”
Lakini nilihofia dhihaka za adui, adui asije akashindwa kuelewa, na kusema, ‘Mikono yetu imeshinda; Bwana hakufanya yote haya.’”
28 Ha bụ mba na-enweghị uche, ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha.
Wao ni taifa lisilo na akili, hakuna busara ndani yao.
29 A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.
Laiti wangekuwa na hekima wangefahamu hili, na kutambua mwisho wao utakuwa aje!
30 Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ, ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha, ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ?
Mtu mmoja angewezaje kufukuza elfu moja, au wawili kufukuza elfu kumi, kama si kwamba Mwamba wao amewauza, kama si kwamba Bwana amewaacha?
31 Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.
Kwa kuwa mwamba wao si kama Mwamba wetu, sawasawa na vile adui zetu wanavyokiri.
32 Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.
Mzabibu wao unatoka kwenye mzabibu wa Sodoma, na kutoka kwenye mashamba ya Gomora. Zabibu zake zimejaa sumu, na vishada vyake vimejaa uchungu.
33 Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ.
Mvinyo wao ni sumu ya nyoka, sumu yenye kufisha ya swila.
34 “Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge, chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m?
“Je, hili sikuliweka akiba na kulifungia kwenye vyumba vyangu vya hazina?
35 Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi. Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ, ụbọchị mbibi ha na-abịa nso, ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.”
Ni juu yangu kulipiza kisasi; nitalipiza. Wakati utakapowadia, mguu wao utateleza; siku yao ya maafa ni karibu, na maangamizo yao yanawajia haraka.”
36 Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe, ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya, mgbe ọ hụrụ na ike ha nwere agwụla, mgbe otu onye na-agaghị afọdụ, ohu na onye nwe onwe ya.
Bwana atawahukumu watu wake, na kuwahurumia watumishi wake atakapoona nguvu zao zimekwisha wala hakuna yeyote aliyebaki, mtumwa au aliye huru.
37 Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ, bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya,
Atasema: “Sasa iko wapi miungu yao, mwamba walioukimbilia,
38 chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha, ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ? Ha bilie bịa nyere unu aka! Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!”
miungu wale waliokula mafuta ya dhabihu zao na kunywa mvinyo wa sadaka zao za vinywaji? Wainuke basi, wawasaidie! Wawapeni basi ulinzi!
39 “Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya! Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m. Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ. Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya, mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m.
“Tazama basi, Mimi mwenyewe, Mimi Ndiye! Hakuna mungu mwingine ila Mimi. Mimi ninaua na Mimi ninafufua, Mimi nimejeruhi na Mimi nitaponya, wala hakuna awezaye kuokoa kutoka mkononi mwangu.
40 Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị, dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,
Ninainua mkono wangu kuelekea mbinguni na kusema: Hakika kama niishivyo milele,
41 mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma, mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe, aga m abọ ọbọ megide ndị iro, kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị.
wakati ninapounoa upanga wangu unaometameta na mkono wangu unapoushika ili kutoa hukumu, nitalipiza kisasi juu ya adui zangu na kuwalipiza wale wanaonichukia.
42 Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ, ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ, ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha, na isi ndị ndu ndị iro.”
Nitailevya mishale yangu kwa damu, wakati upanga wangu ukitafuna nyama: damu ya waliochinjwa pamoja na mateka, vichwa vya viongozi wa adui.”
43 Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya, nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya, ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya, kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.
Furahini, enyi mataifa, pamoja na watu wake, kwa kuwa atailipiza damu ya watumishi wake, atalipiza kisasi juu ya adui zake na kufanya upatanisho kwa ajili ya nchi na watu wake.
44 Mosis na Joshua nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel.
Mose na Yoshua mwana wa Nuni wakaja, wakanena maneno yote ya wimbo watu wakiwa wanasikia.
45 Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel,
Mose alipomaliza kuyasoma maneno haya yote kwa Israeli wote,
46 ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a.
akawaambia, “Yawekeni moyoni maneno yote ambayo nimewatangazia kwa makini siku hii ya leo, ili kwamba mpate kuwaagiza watoto wenu wayatii kwa bidii maneno yote ya sheria hii.
47 Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”
Siyo maneno matupu tu kwenu, bali ni uzima wenu. Kwa hayo mtaishi maisha marefu katika nchi mnayovuka Yordani kuimiliki.”
48 Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
Siku hiyo hiyo Bwana akamwambia Mose,
49 “Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
“Kwea katika mapangano ya Mlima Abarimu hadi kilima cha Nebo kilichoko Moabu, ngʼambo ya Yeriko, na uitazame Kanaani, nchi ninayowapa Waisraeli kama milki yao wenyewe.
50 Mgbe ị hụsịrị ala a, ị ga-anwụ nʼebe ahụ nʼelu ugwu ahụ, lakwurukwa nna nna gị ha, dịka Erọn nwanne gị si nwụọ nʼugwu Hor, lakwuru ha.
Utafia kwenye mlima huo unaokwea na kukusanyika pamoja na watu wako, kama ndugu yako Aroni alivyofia juu ya Mlima Hori naye akakusanyika kwa watu wake.
51 Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel.
Hii ni kwa sababu ninyi wawili mlivunja uaminifu nami mbele ya Waisraeli kwenye maji ya Meriba-Kadeshi katika Jangwa la Sini, na kwa sababu hamkuuinua utakatifu wangu miongoni mwa Waisraeli.
52 Nʼihi ya, ị ga-esite nʼebe dị anya hụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel, ma ị gaghị aba nʼime ya.”
Kwa hiyo, utaiona tu nchi kwa mbali; wewe hutaingia nchi ninayowapa watu wa Israeli.”

< Diuteronomi 32 >