< Diuteronomi 31 >
1 Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile,
梅瑟又繼續用以下的話向全以色列人說:「
2 ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na Onyenwe anyị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
我今天已經一百二十歲,再不能出入;而且上主曾對我說:『你不能過這約但河。』
3 Onyenwe anyị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka Onyenwe anyị kwuru.
上主你的天主親自要領你過去,親自要由你面前將這些民族消滅,使你佔領他們的土地;按上主所許過的,若蘇厄將領你們過去。
4 Onyenwe anyị ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha.
上主對待那些民族,必像以前對待阿摩黎人王息紅和敖格,以及他們的國一樣,將他們完全消滅。
5 Onyenwe anyị ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu.
上主必將他們交於你們,你們應依照我吩咐你們的一切命令,對待他們。
6 Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”
你們應勇敢堅決,不要害怕,在他們面前也不要畏懼,因為上主你的天主親自與你同行,決不拋棄你,也決不離開你。」
7 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha.
然後梅瑟召若蘇厄來,當著全以色列的面對他說:「你要勇敢堅決,因為你應領這人民,進入上主向他們祖先誓許要賜予他們的土地;你應將那地分給他們作為基業。
8 Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”
上主必親自領導你,與你同在,決不拋棄你,也決不離開你;你不要害怕,也不要膽怯。」
9 Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.
梅瑟寫好這法律,交給抬上主約櫃的肋未子孫司祭,和以色列所有的長老;
10 Mgbe ahụ, Mosis nyere ha iwu sị, “Na ngwụcha afọ asaa ọbụla, nʼafọ ahụ a na-akagbu ụgwọ niile, nʼoge a na-eme Mmemme ụlọ Ikwu,
然後梅瑟吩咐他們說:「每逢七年,即在豁免年間的帳棚節期內,
11 mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya.
當全以色列人來到上主你的天主所選的地方朝拜上主時,你應在全以色列人前,大聲宣讀這法律。
12 Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a.
你應召集人民,男女幼小,和你城鎮中的外方人,叫他們都聽到,好學習敬畏上主你們的天主,謹守遵行這法律上的一切話。
13 Ụmụntakịrị ha, ndị na-amabeghị iwu ndị a, aghaghị ịnụ na ịmụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, ụbọchị ndụ unu niile nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”
尚不認識這法律的子女,也應叫他們聽到,好使他們在你們渡過約但河去佔領的土地上生活的時候,日日學習敬畏上主你們的天主。」
14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Lee, ụbọchị ọnwụ gị na-abịaru nso. Kpọrọ Joshua ka gị na ya soro bịa nʼụlọ nzute ebe m ga-anọ nye ya ọrụ ọ ga-arụ.” Mosis na Joshua sooro bịa guzo onwe ha nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
上主對梅瑟說:「看,你的死期已近,你召若蘇厄來,你們一起站在會幕那裏,我好吩咐他。」梅瑟於是和若蘇厄前去,一起站在會幕那裏。
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri ha onwe ya nʼime ogidi igwe ojii nke guzochiri ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
上主出現在會幕上,在雲柱中,這雲柱停在會幕門口上面。
16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara.
上主對梅瑟說:「看,你快與你的祖先同眠;這人民要起來,在要去的地方內,同異邦之神行淫,而離棄我,破壞我與他們所訂立的盟約。
17 Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’
那時,我必要對他們大發忿怒,拋棄他們,掩面不顧他們,讓他們被人吞併,使他們遭遇許多災禍和艱難;到那日他們必說:『我遭遇了這些災禍,豈不是因為我的天主已不在我中間了麼﹖』
18 Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.
因了他們歸向其他的神所作的一切邪惡,那天我必掩面不顧他們。
19 “Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha.
所以,現在你應寫下這篇詩歌,教給以色列子民的證據。
20 Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.
因我領他們進了我對他們的祖先所誓許的流奶流蜜的土地,他們吃飽了,吃肥了,卻歸向了其他的神,事奉他們,而蔑視我,破壞我的盟約。
21 Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.”
當他們遭遇到許多災禍和艱難時,這詩歌就成為反對他們的證據,因為這詩歌總不會由他們後裔的口中失傳。的確,在我領他們進入我誓許的地方以前,我早已知道他們今天所懷的企圖。」
22 Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel.
梅瑟遂在那一天寫下了這篇詩歌,教給了以色列子民。
23 Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.”
此後,上主吩咐農的兒子若蘇厄說:「你要勇敢堅決,因為你要領以色列子民進入我給他們誓許的土地,我必與你同在。」
24 Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ,
梅瑟將這法律的話在書上寫完以後,
25 o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha,
便吩咐抬上主約櫃的肋未人說:「
26 “Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu.
你們將這法律書拿去,放在上主你們天主的約櫃旁,留在那裏作為反對你的證據。
27 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ?
因為我知道你是如何頑固執拗。看,我還同你們生活在一起的今天,你們就這樣反抗了上主;何況在我死後!
28 Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.
你們給我將你們支派所有的長老和官員召來,我要將這些話說給他們聽,指著天地對他們作證。
29 Nʼihi na amaara m na mgbe m nwụrụ, unu ga-aghọ ndị rụrụ arụ nke ukwuu, unu ga-ewezuga onwe unu site nʼebe iwu ndị ahụ m nyere unu dị. Amakwaara m na nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, ihe ọjọọ ga-adakwasị unu, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere nʼihu Onyenwe anyị nke unu ji kpasuo ya iwe site nʼihe ndị ahụ unu ji aka unu kpụọ.”
因為我知道在我死後,你們必定完全敗壞,離棄我吩咐你們的道;最後,你們必要遭受災禍,因為作了上主視為邪惡的事,以你們的作為,使他發怒。」
30 Ya mere, Mosis gụpụtara okwu niile dị nʼabụ a site na mbido ruo ọgwụgwụ na ntị nzukọ ndị Izrel niile.
梅瑟遂在以色列全體會眾前,由頭至尾,大聲朗誦了這篇詩歌的話。