< Diuteronomi 30 >

1 Mgbe ihe ndị a niile ga-emezu nʼebe unu nọ, ya bụ, ngọzị niile na ọbụbụ ọnụ niile m gụpụtara nʼihu unu, ọ bụrụ na unu ga na-atụgharị uche na ha nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-achụba unu,
Maloba oyo nawuti koloba, mapamboli mpe bilakeli mabe oyo napesi yo mpo ete opona, ekokokisama. Soki obateli yango malamu na motema na yo kati na bikolo nyonso epai wapi Yawe, Nzambe na yo, akobengana yo;
2 ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa.
soki ozongi epai na Yawe, Nzambe na yo; soki yo mpe bana na yo botosi Ye, na mitema mpe na milimo na bino mobimba, na makambo nyonso oyo natindi yo lelo,
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu.
Yawe, Nzambe na yo, akoyokela yo mawa: akozongisa bato na yo, oyo bakendeki na bowumbu mpe akosangisa bino lisusu wuta na bikolo nyonso epai wapi apanzaki bino.
4 A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu.
Atako bokendeki na bamboka ya mosika kati na mokili, Yawe, Nzambe na bino, akoluka kosangisa bino longwa kuna mpe akozongisa bino.
5 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha.
Yawe, Nzambe na bino, akomema bino na mokili ya bakoko na bino, mpe bokozwa yango; akosalela bino bolamu mpe akokomisa bino ebele koleka bakoko na bino.
6 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ.
Yawe, Nzambe na bino, akobulisa mitema na bino mpe mitema ya bakitani na bino mpo ete bolinga Ye na mitema mpe na milimo na bino mobimba, mpe mpo ete bozala na bomoi.
7 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu.
Yawe, Nzambe na bino, akotia bilakeli nyonso ya mabe likolo ya banguna na bino, oyo bayinaka bino mpe banyokolaka bino.
8 Unu ga-emesịakwa rubere Onyenwe anyị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa.
Bokotosa lisusu Yawe mpe bokosalela mitindo na Ye nyonso oyo nazali kopesa bino lelo.
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa Onyenwe anyị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ.
Bongo Yawe, Nzambe na bino, akosala ete bomona bolamu kati na misala nyonso ya maboko na bino, mpe akopesa bino bana ebele, bibwele ebele mpe bambuma ebele kati na mokili na bino. Yawe akosepela na bino lisusu mpe akosalela bino bolamu, ndenge kaka asepelaki na bakoko na bino,
10 Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
soki botosi Yawe, Nzambe na bino, mpe bobateli mitindo mpe bikateli na Ye, oyo ekomama kati na buku oyo ya Mobeko, mpe soki bozongi epai na Yawe, Nzambe na bino, na mitema mpe na milimo na bino mobimba.
11 Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime.
Makambo oyo nazali kotinda yo lelo, ezali penza pasi te mpe elekeli yo te na makasi.
12 Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.”
Ezali te kati na Likolo mpo ete okoka kotuna: « Nani akomata kuna na Likolo mpo na kozwela ngai yango mpe kosakolela ngai yango mpo ete nakoka kotosa yango? »
13 Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?”
Ezali te na ngambo mosusu ya ebale monene mpo ete okoka kotuna: « Nani akokatisa ebale monene mpo na kokamata yango mpe kosakolela ngai yango, mpo ete nakoka kotosa yango? »
14 Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha.
Te, liloba yango ezali pene na yo, ezali kati na monoko na yo mpe kati na motema na yo, mpo ete okoka kotosa yango.
15 Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi.
Tala, nasili kotia lelo, liboso na yo, bomoi mpe bolamu, kufa mpe mabe.
16 Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.
Tala likambo oyo Ngai natindi yo lelo: linga Yawe, Nzambe na yo, tambola na banzela na Ye mpe batela mitindo na Ye, bikateli na Ye mpe mibeko na Ye. Bongo okozala na bomoi, mpe bokokoma ebele; mpe Yawe, Nzambe na yo, akopambola yo kati na mokili oyo bozali kokota mpo na kozwa.
17 Ma ọ bụrụ na obi gị e si nʼiso ya tụgharịa, ọ bụrụkwa na ị jụ ige ntị, ọ bụrụ na a dọkpụfuo gị mee ka i fee chi ndị ọzọ ofufe ma ịkpọ isiala nye ha,
Kasi soki motema na yo epengwi mpe otosi te, soki okosami na kogumbamela banzambe mosusu mpe na kosambela yango,
18 agwala m gị hoohaa taa, na ị ga-ala nʼiyi, ị gaghị enwe ogologo ndụ nʼala ahụ ị na-agafe osimiri Jọdan inweta.
nalobi na yo, na mokolo ya lelo, ete okobebisama solo, okowumela lisusu te kati na mokili oyo ezali na ngambo mosusu ya Yordani, epai wapi bokokota mpo na kozwa.
19 Ana m akpọku eluigwe na ụwa taa ka ha bụrụ ndị akaebe m, na edebela m nʼihu gị ọnwụ na ndụ, debekwa nʼihu gị ngọzị na ọbụbụ ọnụ. Ugbu a, họrọ ndụ, ka gị na ụmụ gị dị ndụ
Na mokolo ya lelo, nazwi likolo mpe se lokola batatoli mpo na yo: nasili kotia liboso na yo bomoi mpe kufa, mapamboli mpe bilakeli mabe. Sik’oyo, pona bomoi mpo ete yo mpe bana na yo bozala na bomoi.
20 ka ị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ṅaa ntị nʼolu ya, daberekwa na ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ndụ gị, ọ ga-enye gị ụbọchị ndụ gị niile nʼala ahụ o kwere nkwa ị nye nna nna gị ha Ebraham, na Aịzik, na Jekọb.
Mpe pona kolinga Yawe, Nzambe na yo, koyoka mongongo na Ye mpe kokangama na Ye, pamba te azali bomoi na yo mpe akopesa yo mibu ebele kati na mokili oyo Yawe alakaki kopesa, na nzela ya ndayi, epai ya bakoko na yo —Abrayami, Izaki mpe Jakobi.

< Diuteronomi 30 >