< Diuteronomi 29 >

1 Ndị a bụ okwu nke ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu ka ya na ụmụ Izrel gbaa nʼala Moab na-agbanweghị ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara nʼugwu Horeb.
Èyí ni àwọn ìpinnu májẹ̀mú tí Olúwa pàṣẹ fún Mose láti ṣe pẹ̀lú àwọn ọmọ Israẹli ní Moabu, ní àfikún májẹ̀mú tí ó ti ṣe pẹ̀lú u wọn ní Horebu.
2 Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile.
Mose pàṣẹ fún gbogbo àwọn ọmọ Israẹli, ó sì wí fún wọn wí pé, ojú rẹ ti rí gbogbo ohun tí Olúwa ti ṣe ní Ejibiti sí Farao àti, sí gbogbo àwọn ìjòyè e rẹ̀ àti sí ilẹ̀ ẹ rẹ̀.
3 Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ.
Pẹ̀lú ojú ara rẹ ni ìwọ rí àwọn ìdánwò ńlá náà, àwọn iṣẹ́ àmì àti iṣẹ́ ìyanu ńlá.
4 Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.
Ṣùgbọ́n títí di àsìkò yìí Olúwa kò fi ọkàn ìmòye tàbí ojú tí ó ń rí tàbí etí tí ó n gbọ́ fún ọ.
5 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.
Nígbà ogójì ọdún tí mò ń tọ́ yín ṣọ́nà ní aginjù, aṣọ ọ̀ rẹ kò gbó tàbí bàtà ẹsẹ̀ rẹ.
6 Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
O kò jẹ oúnjẹ tàbí mu wáìnì kankan tàbí rú ohun mímu mìíràn. Mo ṣe èyí kí o lè mọ̀ pé Èmi ni Olúwa Ọlọ́run rẹ.
7 Mgbe unu rutere ebe a, Saịhọn, eze ndị Heshbọn, na Ọg, eze ndị Bashan, pụtara ibuso anyị agha, ma anyị lụgburu ha.
Nígbà tí o dé ibí yìí, Sihoni ọba Heṣboni àti Ogu ọba Baṣani jáde wá láti bá ọ jà, ṣùgbọ́n a ṣẹ́gun wọn.
8 Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.
A gba ilẹ̀ wọn a sì fi fún àwọn ọmọ Reubeni, àti àwọn ọmọ Gadi, àti ààbọ̀ ẹ̀yà Manase bí ogún.
9 Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma.
Nítorí náà, ẹ pa májẹ̀mú yìí mọ́, kí ẹ sì máa ṣe wọ́n, kí ẹ̀yin kí ó lè máa rí ire nínú gbogbo ohun tí o bá ń ṣe.
10 Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa,
Gbogbo yín ń dúró lónìí yìí níwájú Olúwa Ọlọ́run rẹ: àwọn olórí yín, àwọn ẹ̀yà yín, àwọn àgbàgbà yín àti àwọn ìjòyè yín, àní gbogbo àwọn ọkùnrin mìíràn ní Israẹli,
11 na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.
pẹ̀lú gbogbo àwọn ọmọ ọ̀ rẹ àti ìyàwó ò rẹ àti àwọn àjèjì tí wọ́n ń gbé ní àgọ́ ọ̀ rẹ, tí ó ké pópòpó igi rẹ, tí ó sì gbé omi rẹ.
12 Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike,
O dúró níhìn-ín yìí kí o lè wọ inú májẹ̀mú pẹ̀lú Olúwa Ọlọ́run rẹ, májẹ̀mú tí Olúwa ń ṣe pẹ̀lú rẹ lónìí yìí àti tí òun dè pẹ̀lú ìbúra,
13 ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa.
láti jẹ́wọ́ rẹ lónìí yìí bí ènìyàn an rẹ̀, pé kí ó lè jẹ́ Ọlọ́run rẹ bí ó ti ṣèlérí àti bí ó ti ṣe ìbúra fún àwọn baba à rẹ Abrahamu, Isaaki àti Jakọbu.
14 Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu,
Èmi ń ṣe májẹ̀mú yìí, pẹ̀lú ìbúra rẹ̀, kì í ṣe fún ìwọ nìkan
15 ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a.
tí ó dúró níbí pẹ̀lú wa lónìí níwájú Olúwa Ọlọ́run wa ṣùgbọ́n àti fún gbogbo àwọn tí kò sí níbí lónìí.
16 Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.
Ìwọ fúnra à rẹ mọ bí a ṣe gbé ní Ejibiti àti bí a ṣe kọjá láàrín àwọn orílẹ̀-èdè nílẹ̀ ibí yìí.
17 Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ.
Ìwọ rí láàrín wọn ìríra wọn, àwọn ère àti àwọn òrìṣà igi àti ti òkúta, ti fàdákà àti ti wúrà.
18 Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu.
Rí i dájú pé kò sí ọkùnrin tàbí obìnrin, ìdílé tàbí ẹ̀yà láàrín yín lónìí tí ọkàn an rẹ̀ yóò yí kúrò lọ́dọ̀ Olúwa Ọlọ́run wa láti lọ àti láti sin àwọn ọlọ́run àwọn orílẹ̀-èdè náà; rí i dájú pé kò sí gbòǹgbò tí ó ń mú irú èso kíkan bẹ́ẹ̀ jáde láàrín yín.
19 Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ.
Nígbà tí irú ẹni bẹ́ẹ̀ bá gbọ́ ìbúra yìí, kí ó gbàdúrà ìbùkún sórí ara rẹ̀ nígbà náà ni kí ó ronú, “Èmi yóò wà ní àlàáfíà, bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé mo ti fi àáké kọ́rí nípa lílọ nínú ọ̀nà ti ara à mi.” Èyí yóò mú àjálù wá sórí ilẹ̀ tútù àti sórí ilẹ̀ gbígbẹ bákan náà
20 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agbaghara onye dị otu a! Iwe ya, na ekworo ya, ga-adị ọkụ megide nwoke ahụ. Ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a ga-abịakwasịkwa ya. Onyenwe anyị ga-ehichapụkwa aha ya, ka a ghara ịnụkwa ihe banyere ya nʼụwa.
Olúwa kì yóò ní ìfẹ́ sí àti dáríjì í; ìbínú àti ìtara rẹ̀ yóò jó ọkùnrin náà. Gbogbo àwọn ègún tí a kọ sínú ìwé yìí yóò wá sórí i rẹ̀, Olúwa yóò sì yọ orúkọ rẹ̀ kúrò lábẹ́ ọ̀run.
21 Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị.
Olúwa yóò sì yọ òun nìkan kúrò nínú gbogbo ẹ̀yà Israẹli fún àjálù, gẹ́gẹ́ bí gbogbo ègún májẹ̀mú tí a kọ sí inú ìwé òfin yìí.
22 Mgbe ahụ, ụmụ unu ndị ga-eso unu nʼọgbọ ndị dị nʼihu, na ndị ọbịa si ebe dị anya bịa, ga-ahụ oke ihe otiti ọjọọ a bịakwasịrị ala a, ya na ọrịa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya.
Àwọn ọmọ rẹ tí ó tẹ̀lé ìran rẹ lẹ́yìn àti àwọn àjèjì tí ó wá láti ilẹ̀ jíjìn yóò rí wàhálà tí ó wá sórí ilẹ̀ àti àwọn ààrùn pẹ̀lú tí Olúwa mú bá ọ.
23 Ala ahụ niile ga-abụ ala nnu, nke ọkụ repịara, ala nke a na-adịghị akụ ihe ọbụla nʼime ya, ala na-adịghị amị mkpụrụ, nke ahịhịa na-adịghị epu nʼelu ya. Ala dịka ala Sọdọm na Gọmọra, na Adma, na Zeboiim, nke Onyenwe anyị sitere nʼoke iwe ya mebie.
Gbogbo ilẹ̀ náà yóò di imí-oòrùn, àti iyọ̀, àti ìjóná tí a kò lè fi ọkàn sí, tàbí tí kò lè so èso tàbí tí koríko kò lè hù nínú u rẹ̀, yóò dàbí ìbìṣubú Sodomu àti Gomorra, Adma àti Seboimu, tí Olúwa bì ṣubú nínú ìbínú rẹ̀, àti ìkáàánú rẹ̀.
24 Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”
Gbogbo orílẹ̀-èdè yóò béèrè pé, “Kí ló dé tí Olúwa fi ṣe èyí sí ilẹ̀ yìí? Kí ni a lè mọ ooru ìbínú ńlá yìí sí?”
25 Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.
Ìdáhùn yóò sì jẹ́ báyìí: “Nítorí tí ènìyàn yìí kọ Olúwa Ọlọ́run baba wọn sílẹ̀, májẹ̀mú tí ó ti bá wọn dá nígbà tí ó mú wọn jáde wá láti Ejibiti.
26 Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha.
Wọ́n lọ wọ́n sì sin ọlọ́run mìíràn, wọ́n sì foríbalẹ̀ fún wọn, ọlọ́run tí wọn kò mọ̀, ọlọ́run tí kò fi fún wọn.
27 Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a.
Nígbà náà ni ìbínú Olúwa ru sí ilẹ̀ wọn, dé bi pé ó mú gbogbo ègún tí a kọ sínú ìwé yìí wá sórí i rẹ̀.
28 Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”
Ní ìbínú àti ní ìkáàánú, àti ní ìrunú ńlá, Olúwa sì fà wọ́n tu kúrò ní ilẹ̀ wọn, ó sì lé wọn lọ sí ilẹ̀ mìíràn, bí ó ti rí ní òní yìí.”
29 Ihe niile e zoro ezo dịrị Onyenwe anyị Chineke anyị, ma ihe ndị ahụ niile e kpughere ekpughe dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị nwee ike ịgbaso na imezu okwu niile nke iwu a.
Ohun ìkọ̀kọ̀ jẹ́ ti Olúwa Ọlọ́run wa, ṣùgbọ́n ohun tí a fihàn jẹ́ ti wa àti ti àwọn ọmọ wa títí láé, kí a lè tẹ̀lé gbogbo ọ̀rọ̀ inú òfin yìí.

< Diuteronomi 29 >