< Diuteronomi 27 >

1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.
E deram ordem, Moisés e os anciãos, ao povo de Israel, dizendo: guardai todos estes mandamentos que hoje vos ordeno:
2 Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
Será pois que, no dia em que passares o Jordão à terra que te der o Senhor teu Deus, levantar-te-ás umas pedras grandes, e as caiarás com cal.
3 Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị.
E, havendo-o passado, escreverás nelas todas as palavras desta lei, para entrares na terra que te der o Senhor teu Deus, terra que mana leite e mel, como te disse o Senhor Deus de teus pais.
4 Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
Será pois que, quando houveres passado o Jordão, levantareis estas pedras, que hoje vos ordeno, no monte Ebal, e as caiarás com cal.
5 Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya.
E ali edificarás um altar ao Senhor teu Deus, um altar de pedras; não alçarás ferro sobre elas.
6 Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị.
De pedras inteiras edificarás o altar do Senhor teu Deus: e sobre ele oferecerás holocaustos ao Senhor teu Deus.
7 Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
Também sacrificarás ofertas pacíficas, e ali comerás perante o Senhor teu Deus, e te alegrarás.
8 Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
E nestas pedras escreverás todas as palavras desta lei, exprimindo-as bem.
9 Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu.
Falou mais Moisés, juntamente com os sacerdotes levitas, a todo o Israel, dizendo: Escuta e ouve, ó Israel! neste dia vieste a ser por povo ao Senhor teu Deus.
10 Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
Portanto obedecerás à voz do Senhor teu Deus, e farás os seus mandamentos e os seus estatutos que hoje te ordeno.
11 Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,
E Moisés deu ordem naquele dia ao povo, dizendo:
12 Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel
Quando houverdes passado o Jordão, estes estarão sobre o monte Gerizim, para abençoarem o povo: Simeão, e Levi, e Judá, e Issacar, e José, e Benjamin;
13 Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
E estes estarão para amaldiçoar sobre o monte Ebal: Ruben, Gad, e Aser, e Zebulon, Dan e Naphtali.
14 Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
E os levitas protestarão a todo o povo de Israel em alta voz, e dirão:
15 “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.” Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.”
Maldito o homem que fizer imagem de escultura, ou de fundição, abominação ao Senhor, obra da mão do artífice, e a puser em um lugar escondido. E todo o povo responderá, e dirá: amém.
16 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que desprezar a seu pai ou a sua mãe. E todo o povo dirá: amém.
17 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que arrancar o termo do seu próximo. E todo o povo dirá: amém.
18 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que fizer que o cego erre do caminho. E todo o povo dirá: amém.
19 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que perverter o direito do estrangeiro, do órfão e da viúva. E todo o povo dirá: amém.
20 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que se deitar com a mulher de seu pai, porquanto descobriu a ourela de seu pai. E todo o povo dirá: amém.
21 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que se deitar com algum animal. E todo o povo dirá: amém.
22 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que se deitar com sua irmã, filha de seu pai, ou filha de sua mãe. E todo o povo dirá: amém.
23 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que se deitar com sua sogra. E todo o povo dirá: amém.
24 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que ferir ao seu próximo em oculto. E todo o povo dirá: amém.
25 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que tomar peita para ferir a alguma pessoa, o sangue do inocente. E todo o povo dirá: amém.
26 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Maldito aquele que não confirmar as palavras desta lei, não as fazendo. E todo o povo dirá: amém.

< Diuteronomi 27 >