< Diuteronomi 27 >
1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.
Na ka whakahau a Mohi ratou ko nga kaumatua o Iharaira i te iwi, ka mea, Puritia nga whakahau katoa e whakahau nei ahau ki a koutou i tenei ra.
2 Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
A, tenei ake, a te ra e whiti atu ai koutou i Horano ki te whenua e homai ana e Ihowa, e tou Atua, ki a koe, na, ka whakaara ake koe i etahi kohatu nunui mau, ka pani hoki ki te raima:
3 Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị.
Ka tuhituhi hoki i nga kupu katoa o tenei ture ki reira, ua whiti atu koe; kia haere atu koe ki te whenua e homai ana e Ihowa, e tou Atua, ki a koe, ki te whenua e rerengia ana e te waiu, e te honi, kia pera me ta Ihowa, me ta te Atua o ou matua, i korero ai ki a koe.
4 Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
Mo reira, e whiti koutou i Horano, me whakaara enei kohatu e whakahaua nei e ahau i tenei ra ki a koutou, ki runga ki Maunga Epara ka pani hoki ki te raima.
5 Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya.
A me hanga e koe ki reira tetahi aata ma Ihowa, ma tou Atua, hei te aata kohatu; kaua e akina iho e koe ki te rino.
6 Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị.
Me hanga e koe te aata ma Ihowa, ma tou Atua, ki nga kohatu toitu: ka whakaeke ai i nga tahunga tinana ma Ihowa, ma tou Atua, ki runga:
7 Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
Patua hoki nga whakahere mo te pai, a kainga ki reira; me te koa ano ki te aroaro o Ihowa, o tou Atua.
8 Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
Ka tuhituhi hoki i nga kupu o tenei ture ki nga kohatu, kia marama tonu.
9 Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu.
I korero ano a Mohi ratou ko nga tohunga, ko nga Riwaiti, ki a Iharaira, i mea, Noho puku mai, a whakarongo, e Iharaira; no tenei ra i meinga ai koe hei iwi mo Ihowa, mo tou Atua.
10 Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
Na me whakarongo koe ki te reo o Ihowa, o tou Atua, me mahi hoki i ana whakahau, me ana tikanga e whakahaua atu nei e ahau ki a koe i tenei ra.
11 Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,
I whakahau hoki a Mohi i te iwi i taua rangi ano, i mea,
12 Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel
Ko enei e tu ki runga ki Maunga Keritimi hei manaaki i te iwi, ua whiti atu koutou i Horano; ko Himiona, ko Riwai, ko Hura, ko Ihakara, ratou ko Hohepa, ko Pineamine:
13 Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
Ko enei e tu ki runga ki Maunga Epara hei kanga; ko Reupena, ko Kara, ko Ahera, ko Hepurona, ko Rana, ko Napatari.
14 Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
Na ka korero nga Riwaiti, ka mea, kia nui hoki te reo, ki nga tangata katoa o Iharaira.
15 “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.” Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.”
Kia kanga te tangata e hanga ana i te whakapakoko, i te mea whakairo, whakarewa ranei, e whakariharihangia nei e Ihowa, he mea mahi na te ringa o te kaimahi, e whakanoho ana hoki i taua mea ki te wahi ngaro. Ma te iwi katoa e whakahoki, e mea, A mine.
16 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e whakahawea ana ki tona papa, ki tona whaea ranei. Ma te iwi katoa e whakahoki, e mea, Amine.
17 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga a tangata e neke atu ana i te rohe o tona hoa. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
18 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e whakapohehe ana i te matapo ki te huarahi. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
19 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e whakaputa ke ana i te whakawa mo te manene, mo te pani, mo te pouaru. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
20 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e moe ana ki te wahine a tona papa; mona i hura i te remu o tona papa. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
21 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e moe ana ki tetahi kararehe. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
22 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e moe ana ki tona tuahine, ki te tamahine a tona papa, ki te tamahine ranei a tona whaea. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
23 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e moe ana ki tona hungawai wahine. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
24 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e patu puku ana i tona hoa. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
25 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e tango ana i te utu mo te patunga o te tangata harakore. Ma te iwi katoa e mea, Amine.
26 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Kia kanga te tangata e kore e mau i a ia nga kupu o tenei ture, hei mahi mana. Ma te iwi katoa e mea, Amine.