< Diuteronomi 25 >

1 Mgbe esemokwu dị nʼetiti ndị mmadụ, ha ga-ebuga ikpe ha nʼụlọikpe ebe ndị ikpe ga-elenye anya nʼikpe ahụ, maa onye ajọ omume ikpe, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya.
Uba kukhona ukuxabana phakathi kwabantu, baye esahlulelweni, ukuthi babahlulele, bazalungisisa olungileyo, balahle olecala.
2 Ọ bụrụkwa na onye ikpe mara kwesiri ka apịa ya ụtarị, onye ọkaikpe ga-eme ka onye ahụ dinaa ala nʼihu ya, ka apịakwa ya ọnụọgụgụ ụtarị kwesiri ajọ omume ya,
Kuzakuthi-ke uba olecala efanele ukutshaywa, umahluleli uzamlalisa phansi, atshaywe phambi kwakhe, njengokulingene icala lakhe, ngokwenani.
3 ma agaghị eti ya karịa ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ bụrụ na e tie onye ahụ ikpe mara ọnụ ụtarị karịrị nke a, ọ ga-abụ onye e leliri anya nʼihu ndị Izrel ibe ya.
Angatshaywa imivimvinya engamatshumi amane, angengezeleli, hlezi nxa esedlule ukumtshaya okwedlula le ngemivimvinya eminengi, kuze kuthi umfowenu ayangeke emehlweni akho.
4 Mgbe ehi na-azọcha ọka, ejila ihe kechie ya ọnụ.
Ungayifaki isayeke inkabi nxa ibhula.
5 Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa, nwunye ya ahụ agaghị alụ di nʼama, kama nwanne nwoke di ya ga-alụrụ ya, ha ga-edinakọkwa.
Uba izelamani zihlala ndawonye, lomunye wazo esifa, engelandodana, umfazi wofileyo kangendeli kowemzini ongaphandle; umfowabo wendoda yakhe uzangena kuye, amthathe abe ngumkakhe, enze kuye imfanelo yomfowabo wendoda.
6 Nwa nwoke mbụ nwanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka a ghara ihichapụ aha ya nʼala Izrel.
Kuzakuthi-ke izibulo alizalayo lizakuma ebizweni lomfowabo ofileyo, ukuze ibizo lakhe lingacitshwa koIsrayeli.
7 Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ ajụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwanyị ahụ ga-ejekwuru ndị okenye obodo ahụ nʼọnụ ụzọ ama, gwa ha sị, “Nwanne di m ajụla ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide nʼIzrel. O kweghị ịrụ ọrụ kwesiri nwanne di nʼebe m nọ.”
Uba umuntu engathandi ukuthatha umkamfowabo, umkamfowabo uzakwenyukela esangweni kubadala athi: Umfowabo wendoda yami uyala ukuvusela umfowabo ibizo koIsrayeli; kafuni ukwenza kimi imfanelo yomfowabo wendoda.
8 Ndị okenye obodo ga-akpọ ya, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na ọ nọgide jụ sị, “Achọghị m ịlụ ya,”
Abadala bomuzi wakhe bazambiza-ke, bakhulume laye. Uba eqinisa esithi: Kangithandi ukumthatha;
9 nwanyị ahụ ga-ejekwuru ya nʼihu ndị okenye, tọpụ akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ aka nri ya, bụọ ya asụ nʼihu, sị ya, “Otu a ka a na-eme nwoke ọbụla jụrụ iwuli ụlọ nwanne ya nwoke.”
umkamfowabo uzasondela-ke kuye phambi kwamehlo abadala, akhuphe inyathela lakhe enyaweni lwakhe, amkhafulele ebusweni, aphendule, athi: Kuzakwenziwa njalo kulowomuntu ongayakhiyo indlu yomfowabo.
10 A ga-ama ahịrị ya nʼIzrel dịka, “Ezinaụlọ nwoke ahụ e sitere nʼụkwụ ya yipụ akpụkpọụkwụ ya.”
Lebizo lakhe lizakuthiwa koIsrayeli: Indlu yolenyathela elakhutshwayo.
11 Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya,
Nxa amadoda esilwa, omunye lomunye, kusondele umfazi wenye ukuthi ayikhulule indoda yakhe esandleni soyitshayayo, elule isandla sakhe ayibambe ngamaphambili,
12 a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya.
usiqume isandla sakhe, ilihlo lakho lingabi lasihawu.
13 Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.
Ungabi lamatshe okulinganisa ehlukeneyo esikhwameni sakho, elikhulu lelincinyane.
14 Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta.
Ungabi lama-efa ehlukeneyo endlini yakho, esikhulu lesincinyane.
15 Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Woba lelitshe lokulinganisa elipheleleyo lelilungileyo, woba le-efa epheleleyo lelungileyo, ukuze insuku zakho zelulwe elizweni iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona.
16 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ.
Ngoba wonke owenza izinto ezinje, wonke owenza ukungalungi, uyisinengiso eNkosini uNkulunkulu wakho.
17 Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
Khumbula lokho uAmaleki akwenza kuwe endleleni ekuphumeni kwenu eGibhithe,
18 Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.
ukuthi wakuhlangabeza endleleni, watshaya phakathi kwakho ababebuthakathaka emva kwakho, usudiniwe usuphele amandla; kanti kamesabanga uNkulunkulu.
19 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i nwere onwe gị site nʼaka ndị iro gbara gị gburugburu, mgbe o mere ka i zuru ike nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, ime ka i nweta ya, ị ghaghị igbuchapụ ndị Amalek, ka ha bụrụ ndị a na-agaghị echetakwa ọzọ nʼokpuru eluigwe. Echefukwala ime otu a.
Ngakho kuzakuthi, nxa iNkosi uNkulunkulu wakho isikuphumuzile kuzo zonke izitha zakho inhlangothi zonke, elizweni iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona libe yilifa ukudla ilifa lalo, uzakwesula ukukhunjulwa kukaAmaleki ngaphansi kwamazulu; ungakhohlwa.

< Diuteronomi 25 >